Etu 'Ụnknown gunmen' si gbuo onye uweojii, tọọrọ onyeisi nche n'Anambra steeti

Ndị uweojii Anambra steeti ekwupụtala na ndị otu ha na ndị omekome kwara mgbọ n'Ogidi Anambara steeti ụbọchịụka ebe mgbọ tụrụ otu onye otu ha.
Akụkọ kwuru na ndị bu egbe amabeghị ndị ha bụ gbagburu otu onye uweojii n'Ogidi dị n'Okpuru Ọchịchị Idemili North, Anambra steeti.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ bụ ụgbọala Hilux kpara mkpamkpa ahụ n' ebe nkwụsị na nnyocha ndị uweojii Bekee kpọrọ 'checkpoint' n'ogbe Nmuru dị n'Ogidi bụ ebe ha nọ na-ede ndị uweojii, ma nwụọ otu n'ime ha mgbọ.
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'Ogidi achọghị ka akpọ aha ya n'ihi na ọ na-atụ egwu ndụ ya gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'ehihie Ụbọchịụka.
“E gburu onye uweojii n' Ogidi n'ehihie ụbọchịụka n’ ogbe Nmuru,Ogidi.”
“Ha ji ụgbọala Hilux were bia.”
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na n'abalị 29 nke ọnwa Mee, afọ 2022 n'ebe Elekere 12:50 nke ehihie na ndị uweojii nọ ọrụ ịkpagharị nokporoụzọ awara awara Abatete dị n'Ogidi na ndị omekome bu egbe kwara mgbọ." " Mgbọ merụrụ otu onye n'ime ndịuweojii nnukwu ahụ mana n'ihi na ike ọgụ ndị uweojii karịrị, ndị omekome ahụ riri mbọmbọ ọzọ." Ọ gara nihu kwu na ndị uweojii ejikerela ịhụ na ihe na-aga na anya ya na mpaghara ahụ.
Ọ gara n'ihu tụọ arịrị na “ndị agboro na ndị omekome jizi ohere ndakpo nchekwa na-akpazi arụ dị iche iche n'obodo."
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga azaghị ekwentị ya Oge BBC Igbo kpọrọ ya nke ọ na-asa ozi e nyere ya n'ekwentị.
N'aka nke ọzọ, ndị omekome tọọrọ onyeisi nche n'obodo Ukwulu dị n'Okpuru Ọchịchị Dunukofia Anambra steeti bu Kachy Ilodigwe.
Ịlodigwe si ebe ọ gara kwọrọ ụgbọala ya ala oge ndị omekome bu egbe gbachibidoro ya, gbalie egbe elu ma kpụrụ ya gbalaga.
Tigbuo-Zogbuo na-arị ibe ya elu n'Ọwụwa Anyanwu dịka ụfọdụ na-eti mgbu nnwereonwe.
Ndị uweojii na Goomenti Etiti na-ebo otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN ebubo aka ha ịdị na ogbugbu mmadụ na mwakpoo na-eme mana Ipob aghọọla ugboro ugboro na aka ha adịghị ya.









