Etu e siri gbuo ndị agha n’Umunze Anambra steeti

Ebe foto si, AFP
Akụkọ si akụkụ obodo Umunze nke Anambra steeti pụta taa bụ ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba kwuru na ndị ojigebe wakporo ndị agha Naịjirịa ma memịna ụfọdụ n’ime ha.
Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra steeti akatọọla ihe a mere dịka o zipụtara ozi site n’aka odeakwụkwọ gọọmentị ya bụ Christian Aburime n’ụbọchị Wenezde ma kwuo
“E ji obi niile na-akatọ mwakpo ndị agha a. Ndị mere ihe a ga-akwụrịrị ụgwọ ihe ha mere.”

Ebe foto si, Soludo TV
Ọ gara n’ihu rụtụkwa aka na mwakpo mere na Steeti na nso nso nke metụtara Sịnetọ Ifeanyi Ubah.
Mwakpo a tara isi ọtụtụ ndị ya na ya so na-eme njem dịka ọ gbalahụrụ n’ime ụgbọala ya nwere nchekwa odeshi.
Gọvanọ Soludo kwuru “Anyị agaghị ezu ike ruo mgbe anyị chọpụtara ma nwụchie ndị mere mwakpo ndị a.”
“Agaghị e nwee ebe zoro ezo ha ga-anọ ebe a.”
Ọ gara n’ihu kwusie ike ‘Malite ugbua gawa ọha ga-ahụ na agwa anyị na-egosi na anyị anaghị eti mmanwụ a na-akwa n’okwu mwakpo ndị a.”
Gịnị mere n’obodo Umunze, Anambra steeti?
Akụkọ fegharịrị na soshal midia n’ehihe Wenezde kwuru na ndị ojiegbe wakporo ndị ọrụ nchekwa n’obodo Umunze nke Anambra steeti.
Akụkọ ndị a kwuru na mwakpo ahụ tara isi ndị agha anọ nakwa otu onye nkiti.
BBC Igbo gbara mbọ ịnụ olu ndị uweojii nakwa ndị agha Naịjirịa n’Anambra n’okwu mana nke a amịtaghị mkpụrụ n’ihi na ha azaghị ekwentị ha maọbụ zaa ozi ndị e zigara ha.
Ndị bi n’obodo ahụ kọwara na ụjọ jii ha ugbua dịka mwakpo a tụrụ ha n’anya nke ukwuu.
A ka na-agba mbọ ima ka ya bụ ihe siri mee n’uju, mmadụ ole mwakpo ahụ tara isi ya nakwa ihe ndị ọzọ banyere ya.
Cheta na ozi gọvanọ Soludo ekwughị kpọmkwem ma ya bụ mwakpo a tara isi ndị agha maọbụ ndị nkiti ka akụkọ ndị na-efegharị siri na-ekwu.
Akụkọ ka na-abịa.








