Ihe Peter Obi, Soludo na ndị ọzọ kwuru maka Mwakpo e mere Sinetọ Ifeanyi Ubah

Obi, Soludo na Ubah

Ebe foto si, Peter Obi/Soludo/Ifeanyi Ubah/Facebook

Ihe ruru mmadụ ise anwụọla dịka ndị ojiegbe wakporo ụgbọala Sinetọ Ifeanyi Ubah na ndị otu ya n'Anambra steeti.

Ya bụ mwakpo mere na Nkwọ Enugwu-Ukwu, dị n'Okpuru ọchịchị Njikoka, na mgbe ụbọchị ụka, 11 nke ọnwa Septemba afọ 2022.

Kamen Ogbonna, bụ onye enyemaka Sinetọ Ubah, gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ya bụ mwakpo mere, ma kwuo na ndị nwụrụ na mwakpo ahụ gụnyere ndị enyemaka Sinetọ Ubah na ụfọdụ ndị uweojii.

O kwukwara na Sinetọ Ubah ji ndụ ya laa na nta n'ihi na ụgbọala ọ nọ n'ime ya bụ nke ọdeshi.

Ogbonna kwuru sị "Mgbe ha ruru ahịa ahụ n'Enugwu-Ukwu, ha hụrụ ndị nọchiri ụzọ. A malitere ịgba ha egbe site n'ihu ma n'azụ. Ụfọdụ ndị ojiegbe ahụ amalite isi n'ahịa ahụ na-apụta.

Ọkwọụgbọala ahụ nwara chọta ụzọ o si nyapụta, mere ka ha nwee ike igbafu. A kwara ọtụtụ mgbọ n'ụgbọala nke ya (Sinetọ Ubah), mana o nweghi ihe mere ya, mana ụfọdụ n'ime ndị otu anyị na ndị uweojii nwụrụ."

Ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ihe ruru ụgbọala atọ nke ozu ndị mmadụ nọ n'ime ha.

Ogbonna gara n'ihu kwuo na mwakpo a tụrụ ha n'anya n'ihi na Sinetọ Ubah bụ "enyi mmadụ niile".

O kwuru sị "Ọ bụ ihe ịtụ n'anya n'ihi na Sinetọ Ifeanyi Ubah bụ enyi ọha, amaghị m ihe nke a pụtara, enweghi m ike ịkọwa. Anyị ga-ahapụ ndị ọrụ nchekwa ka ha rụọ ọrụ ha ma hụ ihe ha ga-achọpụta."

Aha onyonyo, Ifeanyi Ubah : Gọọmenti etiti bia kọwara sineti etu ha si nwụchie Nnamdi Kanu

Otu onye ọrụ ka gbakwara ma na ụzọ ahụ ha so bụ ụzọ ha na-esikarị ma ha na-eme njem.

N’okwu ya: “Nke a bụ eziokwu bụ na kemgbe ụbọchị atọ maọbụ anọ gara aga, Ubah na-agba okporo ụzọ ahụ dịka ọ na-esi Ọka aga ma na-alọghachị n’ọrụ ya. Uche m bụ na ndị kpara nkata mwakpo nwereike ịbụ na ha mere nnyocha maka etu o si na-aga ma na-alọghachị n’okporoụzọ ahụ”.

Ọ gara n’ihu gbaa ama sị na enweghị ọkọ kọrọ Ubah n’ahụ.

Ihe ndị uweojii kwuru maka mwakpo e mere Sịneto Ubah

Sinetọ Ifeanyi Ubah

Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti, kwuru na Echeng Echeng bụ Kọmishọna Uweojii na steeti ahụ, edurula ndị uweojii gaa n'ahịa ebe ya bụ mwakpo mere.

N'ozi o ziputara, o kwuru na ha na-ama imi n'ala ịmata ihe mere, n'agbanyeghi na etu ya bụ mwakpo si mee edochabeghi anya.

O kwuru na e gburu ndị uweojii abụọ ebe abụọ ndị ọzọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.

Ha kwukwara na ha eforola ntutu taa ịhụ na ha garuru n'isi mmiri gbasara okwu a.

Ikenga gwara BBC Igbo na ọ bụghị eziokwu na e nwere onye a tọrọla na ya bụ mwakpo.

O kwuru nke a iji zaa kepu kepu na-ekwu na a tọrọla otu nwoke a ma dịka Onowu Nri na Nkwo Enugwu-Ukwu tupu ụgbọala Sinetọ Ubah agakwute ndị ojiegbe ahụ kwụchiri ụzọ.

Ihe gọọmentị Anambra kwuru

Gọvanọ Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Soludo TV

Gọvanọ Anambra steeti bụ gọvanọ Chukwuma Soludo akatọọla mwakpo a mere n’Enugwu ukwu dịka ozi ya kwuru:

“E forola m ntụtụ taa ịhụ na e meminara ndị omekome na ndị ojigbe na-akpa ike na steeti anyị”.

Ọ gara n’ihu kwuo na o nyela ndị ọrụ nchekwa ikike isi imi n’ala chọpụta ma wụchie ndị mere mwakpo a.

O zipụtakwara ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ Ubah, ndị otu ya na ndị ọrụ nchekwa ya mwakpo a metụtara.

Peter Obi katọrọ mwakpo a

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi

Peter Obi ji ọkọlọtọ Labour Pati azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa akatọọla mwakpo ndị oji egbe wakporo ụgbọala Sịnetọ Ifeanyi Uba n’ụbọchị ụka.

O tiri Ifeanyi Ubah, ezinaụlọ ndị ọrụ ha e gburu aka n’obi maka ihe ọdachi a.

Obi sị na mwakpo bụ agwa ọjọọ kwesiri nkatọ, nke na-egosi na nchekwa akpụọla afọ n’ala na Naịjirịa ma sị na e kwesiri ilebara ya anya ngwa ngwa.

Ọ gara n’ihu sị ka gọọmentị gbaa mbọ chọpụta ndị kpara arụ a ma taa ha ahụhụ ruuru ha.

O kpọkukwara gọọmentị steeti nakwa nke etiti ka ha gbaa mbọ gbochie ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa na Naịjirịa.