Igbo Presidency 2023: ‘Joe Biden ọ dị afọ ole, onye sị na Tinubu akaala nka ịbụ onyeisiala?' – Joe Igbokwe
Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuru pati All Progressive Congress (APC) na Legọs Steetị tinyere ọnụ n'okwu banyere ndị Igbo ịzọta ọkwa Onyeisial Naịjirịa n’afọ 2023.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Igbo tara ụkwa ma jaa eze banyere etụ ndị si eme ndọrọndọrọ ọchịchị nke ha.
Mgbe a jụrụ banyere etu ndị Igbo ga-esi nwete ọchịchị Onyeisiala Naịjirịa ọkachasị na ntuliaka afọ 2023 na-abịa abịa.
Igbokwe sị "ndị Igbo adịbeghi njikere ịzọta ọkwa onyeisiala Naịjirịa, mana ha ka nwere ohere ma ọ bụrụ ha zọpụ njem dị n'ime ya".
O kwuru hoo haa na otu agbụrụ enweghị ike ịzọta ọkwa onyeisiala Naịjirịa.
Ọ sị na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ala Igbo gụnyere ndị Eze obodo, ndịisi ụka, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kwesiri ịmapụ njem ịga ka ha na ndị agbụrụ ọzọ nwee nkwekọrịta maka ebu n’obi ha.
Ọ sị na ọ bụru na ndị isi a gakwuru Bola Tinubu kọwaara ya mkpa ọdị maka onye Igbo ịchị Naịjirịa na ọ ga-aghọta.
BBC Juru ya ajụjụ ndị mmadụ kpụ n’ọnụ gbasara ahụike onye ndu APC bụ Bola Ahmed Tinubu bụ nke ha na-ekwu na ahụ esichaghị ya ike.
Joe is na “ Tinubu bụ agụ abụọ dị n'ime n’otu. O siriike ka anụ gbara abụbụ”.
Ọ sị na ndị na-ekwu otu ahụ amaghị ihe ha na-ekwu.
O kwuru ọtụtụ ihe dị n’ime ihe onyonyo a ị ga-ekiri.
Ihe ndị Ohaneze sara Joe Igbokwe

Ebe foto si, Ohaneze
Ọnụ na-ekwuchitere otu Ohaneze bụ Alex Ogbonnaya gwara BBC Igbo na ha ga-aga hụ Bola Tinubu na ndị ọzọ maka ịhụ na onye Igbo ga-abụ onyeisiala Naijirịa.
Ọ bụ dịka Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchitere otu patị All Progressive Congress (APC) na Legọs Steeti kwuru sị, " Ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ala Igbo gụnyere ndị Eze obodo, ndịisi ụka, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kwesiri ịmapụ njem ịga ka ha na ndị agbụrụ ọzọ nwee nkwekọrịta maka ebu n’obi ha".
Ogbonnaya kwuru sị, " Eee, ihe Igbokwe kwuru mara mma. Anyị na-akwado ịme njem ịhụ ndị ọchịchị agbụrụ ọzọ maka ọchuchọ ọchịchị ndị Igbo".
O kwuru sị na ọ bụrụ na enyeghị ndị Igbo ọchịchị afọ 2023na ọ ga-esiri ndị Ighbo ike,
Ọ kọwara sị, "Ọ bụrụ na ihe siere ndị Igbo ike, ọ ga-emetụta ebe ndị ọzọ na Naijirịa".
Onye bụ Joe Igbokwe?

- Joe Igbokwe bụ nwafọ Igbo si Uruagu, Nnewi, Anambra steeti.
- A mụrụ ya n'ime ezinaụlọ Dinah na Daniel Igbokwe, n’ụbọchị iri atọ (30) nke Apreelu afọ 1956.
- Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa bụrukwa Injinịa bụ onye ndụmọdụ Gọvanọ Babajide Sanwo-olu nke Lagọs Steeti na ịhazị ọwa mmiri nakwa ọrụ mmiri n'otu Steeti ahụ.
- Ọ banyere ọrụ na Lagọs steeti n’afọ 2006 dịka onyeisi Infrastructure Maintenance & Regulatory Agency (LASIMRA). Kemgbe ahụ Joe arụọla ọrụ n’ọtụtu ebe na ya bụ steeti.
- Joe gara akwụkwọ na Praịmarị na Uruagu Central School Nnewi ebe ọ nwetere asambodo mbụ ya na 1971. N’afọ 1974 ọ gara akwụkwọ secọndarị n'Okongwu Memorial Grammar School (OMGS) na Nnewi.
- Ọ gara University of Nigeria Nsukka n’afọ 1980 ebe ọ gụrụ “Mechanical Engineering”. Ọ fere alanna n’Ogun steeti na 1985.
- Joe hibere ụlọ ọrụ Optimum Plaza and First Grade International Ltd na National Vision Newspapers Ltd.
- Joe Igbokwe bụ ezigbo onye nkwado onye bụbu Govanọ Lagos steeti bụ Ahmed Bola Tinubu.
- Joe sị na ọ bụ ya bụ nwaamadụ bụ onyeisi ndị All Progress Congress (APC) bụ onye mere ya ihe ọ bụ taa.
