Joe Igbokwe: 'Ikpocha ọwa mmiri bụ ezigbo ọrụ'
Joe Igbokwe asaala ndị ji ya eme akaja maka ọkwa ọrụ enyere ya na gọọmentị Legọs steeti.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwenti, o kwuru na ọrụ ahụ bụ nke masịrị ya ime n'agbanyeghi ihe ọbụla.
"Ebe ọ na-akwụrụ m ụgwọ akwụkwọ ụmụaka ma kwụọrọ m ụgwọ ụlọ, obi dị m ụtọ" ka o kwuru.
O kwukwara na steeti ndị ọzọ kwesiri ịṅomi gọọmentị Legọs n'iwe ndị abụghị ndị obodo ahụ n'ọrụ.
Mana ka ndị mmadụ ji ya eme akaja ka ndị ọzọ na-ewe iwe ihe o ji rite ya bụ ọkwa na mbụ.
Otu onye n'ime ha bụ Babatunde Gbadamosi zọrọ ọkwa gọvanọ Legọs steeti.
Nhọpụta ndị nwere ọkwa Kọmishona na Legọs

Ebe foto si, Lagos State Government
Aha ndị kọmịshọna ga-eso aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwolu arụrụ ọrụ dịka a mapụtara ngalaba ha ga-achịkọta mana nwa afọ Igbo bụ Joe Igbokwe e kwuru ga-e sonyere adịghị ya.
Cheta na izu gara aga, aha Joe Igbokwe wuru ewu na soshal midia dịka a ha ya pụtara n'aha ndị Sanwolu zigaara ụlọomeiwu nke Legọs steeti dịka ndị ga-eso ya rụọ ọrụ dịka ndị kọmishọna.
Na Igbokwe esonyeghị dịka a tụrụanya pụtara ihe ka e duru ndị bụ Kọmịshọna a iyiọrụcụbọchị Tuzde na Legọs.
Kama Igbokwe nwetara ọkwa onye ndụmọdụ n'ihe gbasara ọwa mmiri na mmiri.
Ndị e duru iyi ọrụ dịka kọmịshọna na steeti ahụ na ngalaba ha na-achịkọta bụ:
- Rabiu Olowo Onaolapo -Ego
- Tunji Bello -Mmiri na gburugburu)
- Folashade Adefisayo - Agụmakwụkwọ
- Prof. Akin Abayomi - Ahuike
- Dr. Idris Salako -Nhazi obodo(Physical Planning and Urban Development)
- Gbenga Omotoso -Mgbasaozi
- Bolaji Dada - Ụmụnwaanyị na ịchụpụ ụbịam
- Lere Odusote - Ọnatarachi dị n'ala
- Frederic Oladeinde - Njem
- Gbolahan Lawal - Ọrụugbo
- Moruf Akinderu Fatai -Ụlọ obibi
- Mr. Moyo Onigbanjo - Ikpekwụmọtọ
- Hakeem Fahm -Sayensị na teknụzụ
- Ajibola Ponnle -Ọzụzụ na ezumike nka)
- Engr. Aramide Adeyoye - Ọrụ na ewumewu na-akwalite akụnaụba
- Segun Dawodu -Ndị ntorobia
- Uzamat Akinbile-Yusuf -Ihe na-eme n'ụlọ
- Yetunde Arobieke -Okpuru ọchịchị na ihe na-eme n'obodo
- Lola Akande -Azụmahịa
- Olufunke Adebolu -Njem nlegharịanya na omenala
- Sam Egube - Bọjet na nhazi akụnaụba
- Wale Ahmed - Ọrụ pụrụ iche
A hopụtaburu Joe Igbokwe dịka onye ga-esonye na ndị kọmịshọna Legọs steeti

Ebe foto si, Joe Igbokwe/Facebook
Aha Igbokwe sobu na mmadụ iri na asatọ gọvanọ Legọs bụ Babajide Sanwole zigara ụlọomeiwu steeti ahụ ụbọchị Tuzde dịka ndị ọ họpụtara dịka ndị imeobi ya mana o doghị anya ngalaba gọọmentị ọ ga-elekọta.
Nke a bụ nke abụọ onye Igbo na-arụ dịka kọmịshọna na Legos.
Ben Akabueze rụrụ ọrụ dịka kọmịshọna 'Economic Planning and Budget' agba abụọ bido n'afọ 2007 n'oge ọchịchị Babatunde Fashola dịka gọvanọ Legọs.
Cheta na ụbọchị Tuzde, aha Joe Igbokwe bidoro na-ewu na soshal midia maka ikwu na Channels TV na onye kwuru na Buhari anaghị arụ ọrụ bụ onye asị si ọkụ ala mmụọ.
Tupu a họpụta ya dịka kọmịshọna, Joe Igbokwe bụ odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs.
Nwa afọ Nnewi, Anambara steeti jikwa ọkwa dịka onyeisi 'Wharf Landing Fees Collecting Authority'.
Ndị ọzọ aha ha dị n'akwụkwọ ahụ dịka Osote odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Sanwo bụ Gboyega Akosile si depụta bụ:
1. Oladele Ajayi
2. Oluwatoyin Fayinka
3. Yetunde Arobieke
4. Olanrewaju Sanusi
5. Bonu Solomon Saanu
6. Kabiru Ahmed
7. Lola Akande
8. Anofi Olanrewaju Elegushi
9. Solape Hammond
10. Moruf Akinderu Fatai
11. Shulamite Olufunke Adebolu
12. Tokunbo Wahab












