Sanwo-olu: APC akpọghị Igbo asị

Babajide Sanwo-Olu

Ebe foto si, @jidesanwoolu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye na-azọ ọkwa gọvanọ Legos steeti n'aha APC bụ Babajide Sanwo-Olu ekwuola na nlegara anya ndị Igbo na-ele APC dịka pati kpọrọ Igbo asị abughị ihe ziri ezi.

Sanwo-Olu onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọrọụ ntaakụkọ bụ TVC nwere na Legos ụbọchị Tuzde.

O kwuru na ọkwa APC nyere ụmụafọ Igbo abụọ bụ Ben Akabueze, onye rụburu dịka Kọmịshịọna mkpata na mmefu na Joe Igbokwe, onye na-arụ ọrụ dịka ọnụ na-ekwuru APC na steeti ahụ gosiri echiche ọma APC nwere n'ebe ndị Igbo nọ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'okwu ya, Sanwo-Olu sị, "Oge m nọ n'ọrụ oyibo, onye kachara nọrọ n'ọkwa dịka kọmịshịọna bụ Maazị Ben Akabueze, onye Igbo, onye rụrụ ọrụ dịka Kọmịshọna na-ahụ maka mkpata na mmefu."

"N'ezie, ọ bụrụ na ị nọ n'ọkwa Kọmịshịọna na-ahụ maka mkpata na mmefu, ọkwa gị dịka ọkwa osote gọvanọ."

"Nke a bụ n'ịhị na ndị mịnịstrị ndị ọzọ ga na-abịakwute gị. Ọkwa a bụ ọkwa e nyere enyi m ma bụrụkwa nwanne m nwoke, Ben Akabụeze."

"Onye rụrụla ọrụ ọtụtụ afọ kachasị dịka onye ojezi otu APC na Legos steeti bụ onye Igbo, Joe Igbokwe."

"Ọ rụọrọla APC ọrụ ihe karịrị afọ iri na ise. Mgbe i nyerela onye Igbo ọkwa dịka ọnụ na-ekwuru gị, kedụ ihe ọzọ ị na-ekwu?"

Cheta na na e meriri otu APC na mpaghara Oshodi-Isolo, Iferodun-Ajeromi nakwa Amuwo-Odofin, ebe Ndịgbo kacha n'ọnụọgụgụ na ntuliaka ndị nnọchite e mere na 2018.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: