Joe Igbokwe sị na onye kwuru na Buhari anaghị arụ ọrụ bụ onye asị si ọkụ ala mmụọ

Joe Igbokwe

Ebe foto si, Joe Igbokwe/Facebook

Ndị Naịjirịa kpụ Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuru APC n'ọnụ n'ihi ihe o kwuru banyere onyeisiala Muhammadu Buhari.

Joe Igbokwe nọrọ na mkpatrịtaụka ya na ndị ụlọọrụ ntaakụkọ 'Channels TV', kwuo na "Onye ọbụla sị na Buhari anaghị arụ ọrụ bụ onye asị si n'ọkụ ala mmụọ".

Nke a bụ na nzaghachi okwu Ken Okolugbo bụ onye PDP kwuru na gọọmentị Buhari anaghị eleta ndị Naịjirịa anya nke ọma dịka o kwesiri.

Ihe a abụghị nke mbụ ọ na-ekwu ụdị okwu a, cheta na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'afọ 2018, o kwuru na ndị Igbo amaghị ndọrọndọ ọchịchịe

Aha onyonyo, Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe

A bịa n'okwu 'Restructuring' na Naịjirịa, Joe Igbokwe sị ndị Igbo, ndị Hausa na ndị Yoruba ga na-esusu ọnụ.

Aha onyonyo, Restructuring: "Anyị na Awusa na Yoruba ga-esusu ọnụ" - Joe Igbokwe

N'afọ 2019 mgbe Ohanaeze Ndigbo kwadoro Atiku Abubakar ịzọ ọkwa onyeisiala, Igbokwe sị na Nnia Nwodo bụ onyeisi ha naara Atiku aka azụ.

Aha nkeananụānụ, Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu

Mgbe onye bụbu onyeisiala Olusegun Obasanjo degaara onyeisiala Buhari 'letter', Joe Igbo sị na Obasanjo na-akọgheri akọgheri.

Aha onyonyo, Igbokwe: Obasanjo na-akọgheri akogheri

Ọ bụghị ihe ịtụnnaya na Joe Igbokwe na-akwado onyeisiala Buhari n'okwu ya niile n'ihi na ọ bụ onye pati APC ma bụrụkwa ọnụ na-ekwuru APC na Legọs Steeti.

Akụkọ ga-amasị gị: