Ohanaeze ndigbo akatọọla etu e si gbuo ehi na ndị mmadụ n’Abia steeti

George Obiozor onyeisi Ohaneze ndigbo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ohaneze ndigbo akatọọla mwakpo mere n'ahịa obodo Omumauzor nke Abia steeti n'ụbọchị Tuzde.

Mwakpoo a nke ndị ojiegbe amabeghi ndị ha bụ tara isi mmadụ asatọ nakwa ehi iri abụọ.

Aha onyonyo, Mkpebi a Tinubu mere ga-ebute ọgbaghara na Naịjirịa- Ohaneze ndigbo

Akwụkwọ ozi Ohaneze ndigbo nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnia binyere aka kwuru:

"Mwakpo a bụ ihe mgbawaobi nye anyị dịka ndị omekome a na-agba mbọ ikposa udo na ịdịnaotu nọ n'etiti anyị na ndị ugwu na-ere ehi n'ala Igbo"

Ọ gara n'ihu dee "Ihe nke a bụ agwaa ọjọọ akpaferela gafee oke"

Akwụkwọ ozi a kwukwara na nnyocha ha gosiri na ọbụghị ndị ntorobịa obodo ahụ bụ ndị mkpara mkpa mkpa a dịka ha jịkọrọ aka ọnụ kwadoo ma nyere ndị mwakpo a metụtara aka.

Dịka ozi a tiri ndị ihe metụtara aka n'ob, o to kwara Gọvanọ steeti ahụ bụ Gọvanọ Okezie Ikpeazu maka etu o si gbara gaa njem nlete ebe ihe a mere n'ụbọchị Tọọzde ma ṅṅụọ iyi ịchọpụta ndị mere ihe a ma nye ha ntaramaahụhụ ruru ha.

Mbọ Gọọmentị Abia steeti na-agba idaju ihe a mere

Kọmịshọna na-ahụ maka azụmahịa n'Abia Steeti bụ Okiyi Kalu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ụbọchị Fraịdee na azụmahịa ga-amalite n'ahịa ehi Omuma-Uzo a n'oge na-adịghị anya.

O kwukwara na gọọmentị ga-ebụgharị ahịa a nwa mgbenta gaa ahịa Ịyabasị dị n'Uratta, Abia Steeti.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru ebe ahụ n'ụbọchị Fraịdee chọpụtara na-egwu nọ n'obodo a dịka ụfọdụ na-eche na ndị awakporo nwereike ịbọkwara ihe emere ha.

BBC Igbo chọpụtakwara na akwaturu ụfọdụ ụlọ ndị nọ ebe ahụ.

Ndị nọ ebe ahụ nke gụnyere ndị nwere agba n'obod ahụ ekweghị gwaa onye ntaakụkọ BBC Igbo maka ụjọ ihe a mere ka ji ha.

Okezie Ikpeazu gara njem nleta n'ahịa Omumauzor

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka

Mgbe Gọvanọ Okezie Ikpeazu garuru ebe ihe a mere

Gọvanọ Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazu ekwuola na nnyocha nke a ga-eji achọpụta ndị wakporo ọdọahịa ehi nke dị n'Omuma-Uzo, Ukwa West, Abia Steeti, ebidola.

O kwuru nke a mgbe ọ gara mgbaru na ya bụ ahịa nke a wakporo n'ime abali ụbọchị Tuzde ma gbuo mmadụ asatọ na ehi iri abụọ.

Okezie kwuru na nnyocha gosiri na ọ bụghị ndị ntoroọbịa obodo ahụ wakporo ya bụ ahịa, ma sị na ọ bụ ha nyerela ndị ahịa a aka mgbe awakporo ha.

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka

O kwuru na gọọmentị Abia steeti agaghị alaghachi azụ n'atụmatụ ihiwe ahia ahụ ebe ọ nọ ugbua, na ha ga-ewebata ndị agha na ndị nchekwa ndị ọzọ ebe ahụ.

Ọ sịkwa na gọọmentị Abia steeti ga-eji mgbidi gbaa ogige ahịa a gburu gburu.

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka

Ikpeazu tiri ndị ihe a metụtara aka n'obi ma sị na gọọmentị ga na-aga n'ihu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi enyere ndị ọdachi a metụtara aka ka ha bido zụwakwa ahịa ha ọzọ.

Anyị agaghịzi anabata ogbugbu ndị ugwu bi n'Ọwụwa Anyanwu - CNG

Ehi ndị e gburu egbu

Ebe foto si, Finest Ogugua

Otu ndị ugwu kpọrọ onwe ha Coalition of Northern Groups (CNG) ebola otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ebubo na aka ha dị na mwakpo e mere n'ahịa a na-ere ehi n'Ukwa West dị n'Abia Steeti.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Abdul-Azeez Suleiman wepụtara na Wenezde katọrọ mwakpọ ahụ b u nke tara isi mmadụ asatọ nakwa ehi iri abụọ.

Ọ dọrọ aka na ntị na ha agaghị anabata mwakpo ọbụla a na-eme ndị ukwu bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ maọbụ ebe ọzọ na Naịjirịa.

Ha kpọkwara gọọmentị ka ha chọpụta ndị kpara arụ a ma taa ha ahụhụ ruru ha.

Ahịa ebe a na-ere ehi n'Ụkwa West

Ebe foto si, Finest Ogugua

N'ozi ahụ "Mwakpo a mere n'Abia Steeti eruola ogogo nke bụ na a anyị agaghị ịgba nkịtị na e nweghi ihe ọbụla e mere n'ogbugbu ndị ugwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị iche iche."

"Anyị na-akpọku gọọmentị Abia nakwa gọọmentị etiti ka ha nwuchie ndị kpara arụ a na ndị na-akwado ha n'ime izuụka abụọ."

Anyị chọrọ ka a chọpụta mmadụ ole e gburu, ndị merụrụ ahụ nakwa ihe ndị e mebiri na mwakpo a ma kwụọ ndị o metụtara ụgwọ iti aka n'obi".

Ụfọdụ ndị na-ere ehi n'ahịa ahụ

Ebe foto si, Finest Ogugua

Otu a gara n'ihu dọọ ndị Ipob aka na ntị na ọ bụghị naanị ha maara ka e si akpa aghara na ha agaghịzi agba nkịtị ka e gbuo ndị ugwu n'Ọwụwa Anyanwụ maọbụ ebe ọzọ.

Ha sị na otu na-eme ihe a chọrọ iweta ọgbaghara bụ nke nwereike ikewa obodo Naịjirịa nke ga-ebute ahụhụ nye ndị mmadụ.

Kedụ mgbe ihe a mere?

Ehi

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri

N'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Febụwarị ka ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ wakporo ahịa ebe a na-ere ehi n'obodo Omumauzor.

O mere mgbe o ji ọkara gafee elekere iri na otu nke abalị. Mana amabeghị ihe kpatara ya bụ mwakpo a maọbụ ndị kpara mkpamkpa a.

Ndị ojiegbe wuchiri n'ọdụahịa ahụ ma malite ịgba egbe aghara aghara nke butere ọnwụ mmadụ asatọ a na-amabeghi ndị ha bụ nakwa ehi ruru iri abụọ.

Nke a tinyere ndị bị na gburugburu ebe ahụ n'oke ụjọ.

Kedụ ihe gọọmentị Abia Steeti kwuru?

Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Ebe foto si, @okezieikpeazu

Nkọwa foto, Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Ozi sị n'aka kọmishọna mgbasaozi Abia Steeti bụ Eze Chikamnayo kwuru na ngwa ngwa nke a mere na ndị ọrụ nchekwa wuchiri ebe ahụ.

Na ndị ọrụ nchekwa e werela ọnọdụ ebe ahụ nakwa na udo alọghachịla n'oge ahụ.

N'olu ya "Ọ tụrụ anyị n'anya, obi adịghị anyị mma maka mwakpo a ụfọdụ ndị obi tara mmiri mere nke gburu mmadụ asatọ, anyị na-akatọ ụdịrị agwa a na ndị kpara ya".

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Chikamnayo sị na gọọmentị aṅụọla iyi ịchọpụta ndị kpara arụ a, na gọọmentị ga-eme ihe o nwere ike iji tie ezinaụlọ ndị a nwụrụ anwụ aka n'obi.

Ọ sị na ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị gakwara njem nleta n'obodo ebe ihe a mere.

Cheta na gọọmentị bupuru ahịa ebe a na-ere anụ ehi na Waterside Aba na buga ya n'ahịa Omumauzor dị n'Ukwa West n'izuụka abụọ gara aga maka ihe mberede gburu ọtụtụ mmadụ ebe ahụ.

N'otu aka ahụ ndị a sị na-amanye ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ gbara ọgbatumtum Keke mmadụ ọkụ n'Aba.

Ebe a gbara Keke ọkụ n'Umuahia

Ebe foto si, Obialor Ejimofor

Nkọwa foto, Ndị na-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ n'Aba mụnyere otu keke napep ọkụ

Cheta na

Naanị n'ime ọnwa Febụwarị afọ 2022, ndị oji egbe egbuola ihe ruru mmadụ iri abụọ gụnyere ndị uweojii na ndị nkịtị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Steetị ndị o metụtara gụnyere Abia, Anambra, Ebonyi, Enugwu.