Nnamdi Kanu Court Case: Ịjụ ma oge a ga-agbahara Nnamdi Kanu oruola dịka ịjụ ma oge udo oruola - Ohaneze

Ebe foto si, Reuters
Otu Ohaneze esila n'ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Alex Ogbonnaya were kwuo na ọ bụghị ikpe Nnamdi Kanu ikpe ga-ebute udo na ọganihu na Naijirịa.
Nkea na-eme dịka okaikpe kachasị na Naijirịa bụ Abubakar Malami kwuru na oge eji ekwu maka mgbahara Nnamdi Kanu erubeghị.

Ebe foto si, Alex Ogbonnia
Ogbonnaya gara n'ihu kwuo na ajụjụ Malami kwesịrị ịjụ bụ na oge udo na ọganihu oruola?
Ọ kọwara sị na oge eji ekpe ikpe na Naijirịa na-ete aka nke mere na ụfọdụ mkpamkpa na-akpa dịka ndị ojiegbe, ọnọdụ apụtala ezi dgz nwereike na-eme n'ihi na a ka ji Nnamdi Kanu.
Ogbonnaya kwuru na ọ bụ mkparịtaụka hiwere isi na ndọrọndọrọ nke bụ Political Solution n'okwu bekee ka a ga-eji kpọpụta Nnamdi Kanu.
Ọ kọwara sị, "political Solution ga-ebute nkata nke ga-ahụ na mgbagbu a na-agbagbu ndị Igbo ga-akwụsị, ndị IPOB ga-akwụsị kwa ihiwe ọnụdụ ọnye apụtala ezi ma nke kachasị nke, Nnamdi Kanu ga-apụta na nga".
Ohaneze kwuru na Abubakar amaghị ihe n'aga n'ihi na ọ kwesịrị ịgba mbọ hụ na udo dị na Naijirịa.
Ihe Abubakar Malami kwuru maka mgbahara Nnamdi Kanu
Okaikpe kachasị nke Naijirịa bụ Abubakar Malami ekwuola na oge erubeghị mgbe eji ekwu okwu gbasara mgbahara Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob).
Ọ bụ na mkparịtaụka ya na ndị ụlọ ntaakụkọ channels nwere n'ụbọchị Wenesde ka ọ kọwara sị, " Dịka iwu Naijirịa siri dị, ọ bụ mgbe ikpe mara mmadụ ka e nwereike ikwu okwu maka mgbahara ya. Ikpe amabeghị Nnamdi Kanu ya mere na oge okwu mgbahara ya erubeghị.
Ọ gara n'ihu kọwaa na dịka a ka na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe, na okwu gbasara mgbahara ya agaghị achịta aja.
Malami kwuru na ọ sịghị na enweghị ohere ikpa nkata maka mgbahara Nnamdi Kanu kama oge ahụ abụghị ugbua.
Nke a na-eme dịka a ga-ekpe Nnamdi Kanu ikpe n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba afọ 2021.
Nke bụ mgbanwe nye ụbọchị 19 nke ọnwa Jenụwarị 2022 eyiburu ya dịka ndị ọkaiwu ya pụrụ n'ụlọikpe n'ụbọchị iri nke ọnwa Nọvemba ikpe ahụ pụtara n'ihu Ọkaikpe Binta Nyako.
Atụmatụ iyighari ikpe a bịara dịka ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bu Aloy Ejimakor na Ifeanyi Ejiofor gbara akwara isi maka etu ikpe ikpeazụ siri gaa.









