Nnamdi Kanu Case: Nyenu Kanu ohere ka ofee ofufe ya na iwu ndị ọzọ ọkaikpe Nyako nyere ndị DSS

Ebe foto si, Getty Images
Dika ikpe Nnamdi Kanu gara n'ihu n'Abuja n'ụbọchị abụọ nke ọnwa December 2021.
Nke a bụ mgbanwe nye ụbọchị 19 nke ọnwa Jenụwarị 2022 eyiburu ya dịka ndị ọkaiwu ya pụrụ n'ụlọikpe n'ụbọchị iri nke ọnwa Nọvemba ikpe ahụ pụtara n'ihu Ọkaikpe Binta Nyako.
N'atụmatụ mbụ kemgbe ikpe Nnamdi Kanu Malitere, ndị ọrụ nchekwa agbaghị ụlọikpe Ukwu nke dị n'Abuja okirikiri.
Nnamdi Kanu anọghị n'ụlọikpe dịka ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor na-ekwu na ndị "Department of State Security" (DSS) agwaghị ha ihe mere ejighị kpọta ya.
Mana, dịka o siri kwuo, "o nwereike bụru na ọ bụ makana ikpe nke taa abụghị nke ọnụnọ ya n'ụlọikpe ga-abụ mkpa.
Mpụtara ikpe taa
Iyigharịrị ikpe Kanu ruo ụbọchi 18 ruo 19 nke ọnwa Jenụwarị 2022. Ọ bụ n'ụbọchị ahụ ka Ọkaikpe Binta Nyako ga-ege ntị mkpesa ọkaiwu Kanu nwere banyere etu e siri kpolata Kanu Naịjirịa.
Ụlọikpe nyere iwu sị:
- Ka e mee ka Nnamdi Kanu mesaa ahụ etu ọ ga-ekwe emume n'ụlọ mkpọrọ ọ nọ
- Ka e kwee ka ọ gbanwee uwe ya
- Ka e nye ya ohere ife ofufe ya bụ nke ndị Juu ma nye ya akụrụngwa o ga-eji mee etu ahụ
- Ka DSS mezuo iwu niile e nyere ha banyere Kanu, nke gụnyere ikwe ka ọ na-enwete ọbịa atọ n'ụbọchi Mọnde nakwa Tọọzde
- Ka e kwee ka Kanu na ndị ọzọ nọ mkpọrọ na mkparịtaụka.
Atụmatụ iyighari ikpe a bịara dịka ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bu Aloy Ejimakor na Ifeanyi Ejiofor gbara akwara isi maka etu ikpe ikpeazụ siri gaa.
Ọ bịakwara dịka ụfọdụ ndị okenye isi ya gbagotere n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa gara ga-ahụ onyeisiala Muhammadu Buhari maka okwu Kanu.
Ndị okenye ahụ a kpọrọ "Highly Respected Igbo Greats" Maazi Mbazulike Amaechi nọ n'isi ha sị ka Onyeisiala Buhari nye ohere ka e jiri mkparịtauka kpezie okwu Kanu.
Ndị ọzọ so gaa njem ahụ bụ onye bụbu Gọvanọ Anambara Steeti bụ Chukwuemeka Ezeife, Ụkọchukwu Sunday Onuoha nke ụka Methodist, Ichie Goddy Uwazurike bụ ọkwiwu ukwu nakwa onye bụbụ onyeisi otu Aka Ikenga.
Ndị a, site n'ọnụ Maazị Amaechi, bụ ọnu kwuru ha, kwere nkwa na-akpọnye ha Kanu, ha ga-agba mbọ hụ na okwughi okwu dịka o si ekwu.
Onyeisiala Buhari kwere nkwa na ya ga-etinye uche n'arịrịọ a ha rịọrọ ya.

Mana, Onyeisiala Buhari kwukwara na ya etinyebeghi ọnụ n'ihe banyere ikpe mbụ makana ya na-achọ ka ha nwere onwe ha dịka iwu Naịjirịa siri chọọ.
Ọ bụ n'elekere itoolu n'ụtụtụ Tọọzde ka ikpe a ga-amalite n'Abuja.
Cheta na a na-ekpe Kanu ikpe maka ebubo asaa nke gụnyere ịkpa nkata megide Naịjirịa nakwa igbu ọchụ.
Kanu gọrọ n'ebubo ndị a abụghị eziokwu oge agụpụtara ha n'ụlọikpe.












