Nnamdi Kanu: Anyị agaghị ekwe ka ọ bụrụ onye a ga na-akpasị agwa ọjọọ - Ohaneze

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Ohaneze Ndigbo etinyela ọnụ n'ebubo na ngalaba "Department of State Services" (DSS) na-akpasị Nnamdi Kanu ajọ agwa.

Ọnụ na-ekwuru otu a bụ Alex Ogbonnia gwara BBC Igbo na ha nụrụ mkpesa ahụ Ọkaiwu Pụrụiche Nnamdi Kanu bu Aloy Ejimakor boro DSS sn'ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị nke 18 nke ọnwa Nọvemba.

Cheta na Ọkaiwu Ejimakor boro ebubo ndị a dịka ọ sị na Nnamdi Kanu nyere ya ikike ka ọ gbara ọha obodo ama banyere etu ọnọdụ ya na ụlọọrụ ndị DSS dị ugbua.

O kwuru na DSS anaghị ekwe ka Kanu pụta ezi karịa sọsọ otu awa n'ụbọchị, ma kwukwaa na ha anaghi ekwe ka ndi mmadu zute ya maọbụ mkparịtara ya ụka.

O kwukwara ọtụtu ihe ndị ọzọ.

Maazi Ogbonnia sịrị na ya bụrụ na ihe a bụ eziokwu, ọbụghị ihe ziri ezi makana Kanu abụghị ụdịrị onye a ga-akpasị ụdịri agwa ahụ.

Ọ sị: "Kanu bụ nwa anyị, dịka ọ bụ nwafo Igbo. Anyị agaghị ịgbara ya azụ, maobụ hapu ya. Ya mere anyị ga-ekpesara Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ihe na-eme ya."

Maazị Ogbonnaya sị na ọ bụ usoro kwụ ọtọ nke Bekee na-akpa "Global Best Practices" ka ekwesiri iji na-eso Kanu.

Ọ sị na Ohaneze ga-eme nzukọ nso nso a banyere okwu a iji mapụta eto ha ga-esi zobe ya bụ okwu.

Aloy Ejimakor na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Aloy Ejimakor/Facebook

Nkọwa foto, Aloy Ejimakor na Nnamdi Kanu n'ime ụlọikpe n'ọnwa Ọkụtoba

EbuboEjimakor boro ndị DSS gbasara agwa ọjọọ ha na-akpaso Nnamdi Kanu

Ọkaiwu Ejimakọr dere n'agbanyeghị n'ụlọikpe nyere iwu ka a na-akpasị Kanu agwa dị mma, ihe a na-eme ya bụ ntarama ahụhụ.

  • Ọ bụ n'ime nwa ntịtị ọnụụlọ ka e debere Nnamdi Kanu n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS
  • Ọ na-anọ n'ime ụlọ naanị ya awa iri abụọ na atọ n'ime awa iri abụọ n'anọ dị n'otu ụbọchị
  • Naanị otu awa ka a na-ekwe ka Nnamdi Kanu pụta ezi bịa hụ ihu eligwe anya
  • N'oge Mazị Kanu ji apụta ezi, anaghị ekwe ka onye mkpọrọ ọbụla tụpụrụ ya ọnụ. Onye ọbụla tụpụụrụ ya ọnụ, a ga-akpọchi ya n'ime mkpọrọ ebe ọ ga-anọ naanị ya. Nke a mere ndị mkpọrọ niile ji atụ egwu ikele ya ekele maọbụ tụpụtụ ya ọnụ n'ụdị ọbụla
  • Kamgbe anwụchiri Nnamdi Kanu ma kpụlata ya na Naịjirịa, ndị DSS ekwebeghị ka ọ gbanwee akwa ya.
  • Ndị DSS ekweghị enye Kanu uwe nakwa akwụkwọ ekpere ndị Jew nke ọ na-eji ekpe ekpere
  • Ndị DSS enyeghachibeghị Kanu ugogbo anya ọ ji ahụ ụzọ, bụ nke ha kụriri oge ha nwụchiri ya n'ike, nke a kpatara nsogbu anya o nwere ji akawanye njọ
  • Ndị DSS anaghị enye Kanu ohere ka ya na ndị ọkaiwu ya kparịta nkata na-enweghị onye na-ege ha ntị. Anaghịkwa ekwe ka ọ hụ akwụkwọ ikpe ndị ọkaiwu ya weteere ya ka ọ hụ
  • Kanu anaghị eji ihe nhibe isi (pillow) arahụ ụra, nke a ebuterela ya obi mgbu nakwa nhịahụ ilo ihe
  • Ndị DSS jichiri ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor ruo awa anọ ma yie ya egwu, oge ọ bịara ileta Kanu n'ụbọchị 17 nke ọnwa Julai 2021. Ihe a merenụ wutere Kanu nke ukwuu
  • Ndị DSS ekwebeghị ka Kanu zute onyeọrụ nke mba UK zitere ka o nyere ya aka. Oge nwa ada ahụ bịara n'ụlọikpe ịhụ ya, ndị DSS ekweghị ka o rute Kanu nso
  • Ndị DSS enyebeghị ohere ka Nnamdi Kanu mee nnyocha ahụike zuru oke iji mata ọnọdụ ahụike ya kpọmkwem. Nke a bụ maka na e nwere ọgwụ a gbanyere Kanu n'ime ahụ oge anwụchiri ya n'ike na mba Kenya ma kpụlata ya na Naịjirịa. Kanụ kwenyere na ọgwụ a ha gbara ya bụ ihe na-akpatara ya ahụ mgbu nakwa oke ike ọgwụgwụ ọ na-enwe.

Cheta na anwuchiri Nnamdi Kanu, onyeisi otu Indigenous People of Biafra, na mba Kenya n'ọnwa June afọ a, ma kpụlata ya na Naịjirịa

Gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya ebubo iyi ndụ egwu, nakwa ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị Naịjirịa.

Kamgbe a nwụchiri Kanu, ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS.

Ndị ọkaiwu Kanu arịọla ụlọikpe ka ha nye iwu ka e bufee Nnamdi kanu n'ụlọmkpọrọ dị n'Abuja, karịa ụlọ mkpọrọ ndị DSS ebe ọ nọ ugbua, mana ụlọikpe ekwebeghị.

Ka mgbe BBC Igbo ji akpọ ndị DSS, ha zaghachịbeghị ekwenti ha ịza ebubo onye ọkaiwu Nnamdị Kanu bụ Maazị Ejimakor depụtara maka ọnọdụ Nnamdị Kanu.