Nigeria presidential election 2023: ‘Kpọpụta mmadụ niile chọrọ ịzọ ọkwa ka anyị mara onye ruru m’ – Peter Obi
Akachibụrụ Anambra steeti na otu onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023 bụ Peter Obi gwara BBC Igbo obi maka atụmatụ n’ịzọ ọkwa.
Obi kwuru na nsogbu ya abụghị nke okwu ‘zoning’ nke bụ inye mpaghara ọbụla ohere ịzọ kama ihe ka mkpa bụ ịkpọpụta mmadụ niile nwere mmasị ịzọ ọkwa, nyochaa ntozuoke ha ma họpụta onye kacha mma nakwa onye kacha tuzuo oke site n’ogogo agụmakwụkwọ, ihe onye ahụ rụrụla n’oge gara aga, agwa ya nakwa ihe ịgba ama ndị ọzọ ga-atuziri ọha aka ma ya bụ onye abụ onye kwesịrị ịchị Naịjirịa ugbua.
Obi onye kwupụtara mmasị ya n'ọkwa a n'okpuru pati People's Democratic Party (PDP), tinyere ọnụ n’okwu ndị na-ekwu na ha na-achọ nnwereonwe n’aka Naịjirịa kwuo “Ihe ndị mmadụ ji ekwu na ha achọghịzị ịnọ n’otu (na Naịjirịa) maka a na-eme ha mmegbu”
“Di na nwunye mee mgbasa bụ maka na enwere nsogbu”
Ọ kọwara na atụmatụ ya n’ịzọ ọkwa a bụ ịkpọ Naịjịrịa ọnụ nke ọma ka enwee udo na ịhụnanya.
Nke a na-abịa dịka n’afọ ole m ole garala aga, ọtụtụ ndị n’akụkụ dị ịcheịche na Naịjịrịa malitere eti mkpu nnwereonwe nakwa nkewapụ nke gụnyere otu Yoruba Nation na Indigenous People of Biafra (Ipob), bụ ndị bu okwu a n’isi na nso nso a.
Maka okwu ego gọọmentị Obi kọwara etu o siri mee ihe dị iche n’Anambra nke mere gọọmentị ya jiri hapụ idaba n’ọnọdụ ịbị ego nakwa iji ụgwọ.
“Anyị kwụsịrị nkwarị na nkwasa ego gọọmentị”
Maka abụbọ ọrụ ndị nkuzi na Naịjirịa, Obi kwuru na ọ ghọtara iwe ha ma rutuaka na ihe ha na-eme bụ ihe dịrị ha dịka gọọmentị emezughị nkwekọrịta ha na ndị nkuzi na Naịjirịa.
Obi kọwara na ihe ga-eme ka Naịjịrịa gaa n’ihu ma meepee bụ ma ọ bụrụ na akwalite agụmakwụkwọ nke ọma.
Ọ kwukwara ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na otu Pati People's Democratic Party (PDP) ghara ịhọpụta ya dịka onye ga-azọchịtere ha ọkwa onyeisiala maa gaa n’ihu kagbuo okwu ndị na-ekwu na ọ na-azọ ọkwa ibu osote onyeisiala ma Atiku Abubakar nweta mmeri.
Obi kọwara na ọ ga-agba mbọ gbapụta ọtụtụ ndị mmadụ n’ụbịam site n’ikwado ọrụ aka ndị mmadụ.
O tinyekwara ọnụ na nsogbu enweghị nchekwa na Naịjrịa ma kọwaa na a gbapụta ndị mmadụ n’aka ụbịam, tigbuo zọgbuo nakwa ọgbaghara jupụtara na Naịjịrịa ga-adaju.
Obi kwuru na ikwado ndị agha ga-enyereaka na atụmatụ inweta nchekwa ọzọ na Naịjirịa.
O kwuru na ewezuga nchekwa na “ebe ihe nrite Naịjịrịa kacha nọrọ bụ na mpaghara ugwu ”.
Ọ kọwara na mpaghara ugwu kacha nwee ala sara mbara nke mere ọzụzụ ụmụanụmanụ nakwa ọkụkụ ugbo jiri amụbawanye nke ukwuu ebe ahụ.
O kwuru na mmanụ agbidi ekwesịghị ịbụ ebe akụnaụba Naịjirịa kwesịrị ịgbado okwu kama ọ kwesịrị ịbụ n’ọrụ ugbo.
Ọ gara n’ihu kọwaa na mpaghara ugwu karịrị ọtụtụ mba dị nọ n’ụwa n’isaa mbara.
Kirie ihe onyonyo a n’uju ka ị nụrụ ihe Peter Obi kwuru.

