Presidential Election 2023: "Ọ ga-aka mma ndị Igbo iwepụta otu onye na 2023 karịa ịdị n'igwe azọ ya"

Aha onyonyo, Nwodo

Okwesilieze Nwodo, bụ aka chịburu Enugwu Steeti, so na ndị isi sekpụ ntị n'ịtụ alo maka onye Igbo inwete ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Nwodo kwuru na ha na-agba mbọ ịhụ na ndị Igbo niile pụtarala ịzọ ọkwa a n'otu Peoples Democratic Party jikọrọ aka wepụta otu onye, karịa ịdị n'igwe azọ ya bụ ọkwa.

Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị ndị Igbo atọ na PDP ekwuola na ha nwere mmasị ịzọ ọkwa Onyeisiala Naijiria, ha gụnyere Anyim Pius Anyim, Sam Ohuabunwa, Peter Obi na ndị ọzọ.

"Ọ ga-akara anyị mma iwepụta otu onye karịa ịchịrị aka atọ wụnye n'ọnụ otu oge," Nwodo kwuru.

"Nke a ga-eme ka ohere anyị nwere imeri ya bụ ntuliaka gbagote."

"Anyị amalitekwala ịgagharị na mpaghara dị icheiche na Naijiria na-arịọ ndị ọnụ na-eru n'okwu ka ha kwado ndị Igbo maka na ugbua bụ oge nke anyị."

"Anyị agaala hụ Olusegun Obasanjo, Abdulsalami Abubakar, Ibrahim Babangida, T.Y. Danjuma, na ọtụtụ ndị ọzọ iji rịọ nkwado ha."

Gbasara akụkọ na-ewu ebe niile na Pati PDP ekwuola na onye ọbụla si mpaghara ọbụla nwereike ịpụta zọọ ọkwa Onyeisiala, Okwesilieze Nwodo sị na nke a abụchaghị eziokwu.

"Kọmiti e hibere maka 'zoning' ewepụtabeghi mkpebi ha," Nwodo kọwara.

"Oge ọbụla ha wepụtara ya, anyị ga-ahụ ihe dị na ya marakwanụ ihe ọzọ anyị ga-eme."

Onye bụ Okwesilieze Nwodo?

Nwodo si na mpaghara Nsụka n'Enugwu Steeti.

Ọ bụ dọkịta a ma ama na-ahụ maka ahụike ụmụaka nke bekee na-akpọ 'Paediatrics surgeon'.

Ọ mechara banye ndọrọndọrọ ọchịchị ma merie ntuliaka Gọvanọ n'Enugwu Steeti n'afọ 1992 na 1993 tupu ndị agha eweghara ọchịchị n'ike.

Nwodo so na ndị bidoro otu PDP n'afọ 1998. N'oge ahụ, ọ bụ ya bụ odeakwụkwọ pati ahụ.

N'afọ 2010, a họpụtara Okwesilieze Nwodo dịka onyeisi oche pati PDP, mana ọ nọteghị aka n'ọkwa tupu ọ rituo.