Josephine Ezeanyaeche: Ihe mere m ji pụta ịzọ ọkwa onyeisiala agbanyeghị na m dị afọ 102

Aha onyonyo, Josephine Ezeanyaeche: Lee nwaanyị dị afọ 102 pụtara ịzọ ọkwa onyeisala nbke 2023

Mgbe Josephine Ezeanyaeche kwupụtara mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na mbido afọ a, akụkọ a sara ọkụ na soshal midia.

Ihe tụrụ ụfọdụ n’anya bụ afọ ole ọ dị, ihe ọzọ bụkwa na ọ bụ nwaanyị ma bụrụkwa onye Igbo, ọzọ bụrụ na ọnọghị na pati ndị na-ewu ewu maọbụ nke nọ n’ọchịchị ugbua.

Tinyere ihe ndị a niile, nke kacha tụọ ọha n’anya bụ etu o si kaa obi pụta ịzọ ya bụ ọkwa agbanyeghi ihe ndị a niile ndị mmadụ na-eche.

Ọtụtụ etoola mmasị a dịka ihe a o zubere ime bụ ihe enwebeghi onye merela ya na mbụ na Naịjirịa dịka nwaanyị.

Ndị niile chịrịla Naịjirịa na mbụ bụ naanị ụmụnwoke.

Na nso nso a akụkọ afọ ole ndị ọchịchị dị ebutere ọtụtụ siri siri siri ọkachasị dịka ahụike ndị ọchịchị na-agbada ebe ha nọ n’ọkwa ọchịchị.

Ụfọdụ ndị ntorobịa ejirila iwe malite ngagharịiwe na-ekwu na ha chọrọ ka ndị okenye pụta n’ụzọ ma nye ha ohere ka ha chịa.

Ihe ndị a emedaghị Ezeanyaeche obi ma ncha dịka ọbụghị taa ka o malitere tinyebe aka na ihe gbasara ọchịchị.

Nwa ya nwa nwaanyị bụ Caro Nwosu gwara BBC Igbo etu ụfọdụ si binye rịọ ya ma chọọ igbanwe atụmatụ ya ịzọ ọkwa a n’ihi ha chee na ọ bụ ihe nletuanya nye ụmụ ntorobịa.

Mana Ezeanyaeche kwuru na ọ naghi eti mmanwụ a na-akwa aka dịka o kwuru na ọ dị njikere ma kee nkwụcha maka ihe ọbụla ga-eso mmasị a o kwupụtarala.

Ihe ụfọdụ ikwesiri ima maka Josephine Ezeanyaeche

Josephine Ezeanyaeche dị afọ 102.

O lụọla di ma nwekwa ụmụaka.

Ọ bụ onye Agụkwu Nri n’Anambra steeti na alụ di n’Igbo Ukwu nke Anambra steeti.

Otu nwa ya nwaanyị kwuru na nne ya bụ Josephine tinyere aka na atụmatụ ịnwete nwereonwe ndị mmadụ na mba Saụt Afrịka n’oge gara aga.

Ezeanyaeche nwere ụlọọrụ ebe a na-enyere ndị kara nka aka.

O kwuru na nke a (inyere ndị okenye aka) so na ihe ndị ga-amasi ya ime ma ọzọta ọkwa onyeisiala n’afọ 2023.

Ihe mere Josephine Ezeanyaeche ji pụta ịzọ ọkwa onyeisiala

Ezeanyaeche kwuru na ihe mere o ji pụta bụ na ụmụnwoke ndị chịrịla Naịjirịa na-eme anya ukwu nke bụ na enye ha ego were nyere ndị ogbenye aka ha e were ya tinye n’akpa nke ha.

O kwukwara na atụmatụ ya bụ ịdụgachi Naịjirịa etu ihe dị mgbe mbụ ya bụ mgbe e nwere ọtụtụ nri na akụnaụba.

O Kwuru na ihe mbụ ọ ga-eme bụ inye mmadụ niile otu nde naịra ka ha lọgachite na ọrụ ịkọ ugbo dịka ya bụ etu aga-esi meminaa oke ogbugbu ndị mmadụ, mpụ , ohi nakwa ntọrọ mmadụ nọ na Naịjirịa.

O gwara mmadụ niile ọkachasị ndị ntorobịa ka ha pụta tụọ vootu n’afọ 2023.

Kirie ihe onyoonyo a ka ị nụrụ ihe okwuru n’uju.

Ndị mere akụkọ a bụ Chris Sanctus Chukwudi Okereke na Chiemela Mgbeahuru.