2023 Elections: Mama gbara afọ 102 chọrọ iso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023

Nonye Josephine Ezeanyaeche

Ebe foto si, NTA

Iyom Nonye Josephine Ezeanyaeche gbara afọ 102 eforola ntutu taa ịzọsị ndị ndoroọbịa na ndị ọzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023.

Iyom gara gbaa ya bụ ama n'isiụlọọrụ Nigeria Television Authority (NTA) dị n'Abuja bụ nke ha wepụtara n'ụbọchị Tọzde 17 Febụwarị, 2022.

Ọ gbarụrụ ihu maka ụkwụ nke ọ sị ụmụntoroọbịa na-apụ n'ala n'ihe gbasara ịpụta zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

Carol Nwosu bụ ọnụ na-ekwuchitere Iyom sị na "ọ bụ mama ji aka ya dee usoro ọchịchị ya. Ọ bụrụ na ụmụntoroọbịa achọghị ipụta, mama ga-apụta ịzọ ya bụ ọchịchị, mama ga-apụta".

Aha onyonyo, 2023 Election: 'Ndị ọchịchị na-akawapụ ndị Igbo akwapụ' - Ezeife

Iyom Josephine Ezeanyaeche emepụtala ọtụtụ ihe a hụrụ anya ma ritekwa ọtụtụ nturuugo maka ụfọdụ ọrụ ndị ahụ.

Ọ sị na ya ga-ekpute atụmatụ ọrụ ya mgbe oge ruru.

Aha onyonyo, Rochas Okorocha

Ọ bụ ya guzobere otu a kpọrọ Nigeria In Diaspora Organisation, (Nido), Egbe Ọmọ Yoruba, World Igbo Congress (WIC) na ndị ọzọ.

Ntụrụụgo ya gụnyere nke ndị African Peace Award o ritere na mgbe gara aga.

Mana ruo mgbe ọ ga-atọpe ya bụ ngwugwu dị n'anya ọkụ, Iyom tụrụ anya na ụmụntoroọbia ahụ zuru oke ga-apụta maka ndorondoro ọchịchị onyeisiala Naịjirịa.