2023 presidential Election: Ị ga-esi ike ka ntorobịa ma nwee akọnuche ka okenye ịbụ onyeisiala Naijiria - Chukwuka Monye

Aha onyonyo, hukwuka Monye bụ otu n'ime ndị kwuputerela mmasị ha ịbụ onyeisiala Naijiria

Chukwuka Monye bụ otu n'ime ihe karịrị mmadụ iri kwuputerela mmasị ha Ịzọ ọkwa Onyeisiala Naijiria.

O kwuru na ọ nwere olileanya na ọ ga-azọta ọkọlọtọ pati African Democratic Congress (ADC), nke bụkwa pati Kingsley Muoghalu zọburu ọkwa onyeisiala n'afọ 2019 nọ n'okpuru ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Monye kọwara ihe mere o ji nwee mmasị Ịzọ Naijiria, dịka ọ rụtụrụ aka n'ihe atọ ọ sị kacha dị mkpa igbanwe na Naijiria.

O kwuru sị na ọ bụrụ na ọ bata ọchịchị, na ọ ga-agbanwe ọnọdụ nchekwa, ṅogharịa mpaghara ụlọọrụ dị iche iche n'atụmatụ Bekee kpọrọ "institutional reforms", ma gbanwekwaa ọnọdụ akụnụba ala Naịjiria.

Monye dị afọ 43 kwuru na onye ọbụla chọrọ ịchị mba dị ka Naijiria "kwesịrị isi ike ka ndị ntorobịa ma nwekwaa akọnuche ka ndị okenye".

Ihe ndị ọzọ ọ tinyere ọnụ na ya na mkparịtaụka a gụnyere ihe gbasara enweghi ọrụ, oge ndị Igbo ịbụ onyeisiala Naijiria, ihe gbasara uweojii nke steeti, mwakpo ndị ọchị ehi nakwa ndị na-achọ nnwereonwe.

Gee ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo a: