A tọọrọ ndị ọrụ Inec na ntuliaka nhọpụta ndị omeiwu ọhụrụ n’Imo steeti?

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Michael Abattam gwara BBC Igbo n'ụbọchị Sọnde na enweghi ozi maọbụ mkpesa ọbụla ha nụrụ banyere ndị ọrụ ngalaba Independent National Electoral Commission (Inec) ejichiri n'ike maọbụ tọrọ n'ụbọchị Satọde.
Akwụkwọ ozi nke Charles Ugwu bụ onyeisi oche otu pati People's Democratic Party n'Imo steeti katọrọ mpụtara ntuliaka nke họpụtara ndị omeiwu ọhụrụ emere na Ngor-Okpala nke steeti ahụ n'ụbọchị Satọdee.
O kwuru na usoro ya bụ ntuliaka ezighi ezi.
Ugwu boro Gọvanọ steeti ahụ ebubo ma kwuo na o tinyere aka ma nye ndị uweojii iwu ka gbaa egbe aghara aghara ma jibido ọtụtụ ndị ọrụ Inec n'ike.
O kwukwara ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa wakporo ọtụ wọọdụ ebe emere ntuliaka a ma gba ndị mmadụ egbe ka si chọọ.
Akwụkwọ ozi a bokwara ebubo na e bubara ndị ọrụ Inec a ejibidoro n'ike n'ime Sam Mbakwe ma majaa ha ka ha binye aka tụọ vootu n'ụzọ n'ezighi ezi.
Abattam anabataghi ebubo a dịka o kwuru na mkpesa ụdị akụkọ dị etu a gara iru ha ntị kamgbe ihe a mere.
Kedụ onye ihe Inec kwuru maka nke a?
Ngalaba na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ The Independent National Electoral Commission (Inec) ekwubeghi ihe ọbụla banyere ebubo kama ha akpụpụtala ndị ha si nwetere mmeri na ntuliaka ịhọpụta ndị omeiwu ọhụrụ e mere na mpaghara n'Ondo, Imo na Cross Rivas Steeti n'ụbọchị Satọdee.
Ọkamụta Rufus Ogunseemi nke mahadum Federal University of Technology, Akure kpọpụtara mpụtara ntuliaka a na mpaghara ebe ndị emere ya.
Site n'ihe Inec kpọpụtara, mpụtara ntuliaka a gosiri na Blyden Amajurionwu nke otu pato All Progressives Congress (APC) nwetere mmerị dịka ahọpụtara ya ka onye omeiwu ọhụrụ ga-anọchịte anya okpuruọchịchị Ngor-Okpala.
Dịka Inec si kwuo, Amajurionwu ji vootu 9,248 wee nweta mmeri.
Inec kpọpụtara Mayokun Alade nke pati APC dịka onye meriri n'Ondo steeti ịnọchịte anya okpuruọchịchị Akure North/South ebe Jude Ngaji pati APC nwetere mmeri dịka onye ga-anọchite anya okpuruọchịchị Ogoja/Yala.

Ebe foto si, Hope Uzodinma
Kedu ihe gọọmentị Imo steeti na-ekwu?
Hope Uzodinma bụ Gọvanọ Imo steeti kwuru n'ụbọchị Sọnde etu obi dị ya maka mpụtara ntuliaka a.
Ozi ya ekwughi ihe ọbụla banyere akụkọ a na-efeghari kama ọ gara n'ihu kwado mpụtara ya bụ ntuliaka
Ọ mere nke a n'ụlọụka nke obi gọọmentị dị n'Owerri.
N'okwu ya ọ sị: "Soro m kelee chineke etu o si gbapụta ndị okpuruọchịọchị Ngor-Okpala n'aka ịke agbụ ji ha kamgbe"
O toro ndị niile pụtara mee achụmnta vootu nakwa ndị pụtara tụọ vootu.
Uzodinma nyekwara ndị ọrụ nchekwa ekele pụrụiche ma too ha maka etu ha si rụọ ọrụ na ya bụ ntuliaka.
O jikwa obi aṅụrị tie onwe ya aka n'azụ dịka o kwuru na ọ bụ n'oge ọchịchị ya ka otu pati APC nwetere mmeri dị ịcheịche na steeti ahụ nke gụnyere mmeri Princes Miriam Onuoha na nke Sineto Frank Ibezim nwetere n'Okigwe North Federal Constituency nakwa n'Imo North.

Etu ntuliaka a si gaa mgbe a malitere
Ndị bi na mpaghara Ngor-Okpala dị n'Imo steeti apụtara n'igwe ịhọpụta onye omeiwu ọhụrụ ga-anọchi anya ha n'ụlọ omeiwu steeti ahụ n'ụbọchị Satọdee.
Ngalaba 'Independent National Electoral Commission' (Inec) na-ahazi ntuliaka a iji dochie Tochi Okereke, bụ onye meriburu ya bụ ọkwa, mana ọ naghị aga ọgbakọ ndị omeiwu.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ya bụ ntuliaka malitere ka ọ gafechara elekere asatọ nke ụtụtụ Satọde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Febrụwarị afọ 2022.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo chọpụtara na ndị ọrụ Ince nakwa ngwaọrụ ha wụchịrị n'ebe dị icheiche a-anọ tụọ ya bụ vootu.
Ndị a tụrụ anya nwereike imeri ntuliaka a

Otu ndọrọndọdọ ọchịchị sonyere na ntuliaka nke Satọdee dị iri na otu n'ọnụọgụgụ.
Mana ndị ma ihe ekwe na-akụ na ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na ya bụ ọgụ ga-aka sie ike n'etiti otu 'Peoples Democratic Party' (PDP), PDP na ndị All Progressives Congress' (APC).
Ndị na-anọchi anya pati abụọ ahụ na ntuliaka a bụ Jeff Nwachukwu - PDP, na Blyden Amajirionwu - APC
Cheta na Tochi Okereke, onye omeiwu nke a chụpụrụ achụpụ, nọbu n'otu PDP, nke a mere ọtụtụ ji ekwu na ndị PDP ga-emerikwa ntuliaka nke a.
Mana chetakwa na ọchịchị Imo steeti ugbua dịzi n'aka pati 'All Progressives Congress' (APC), dịka ụlọikpe kachasị chụtuchara Emeka Ihedioha nke PDP dịka Gọvanọ Imo steeti ma tinye Hope Uzodinma nke APC.
Ụfọdụ na-ekwu na n'ihi mgbanwe ọchịchị a, otu APC nwere ike imeri ntuliaka a nke na-aga n'ihu ugbua.
Chetakwa na ngwangwa Hope Uzodinma weghaara ọchịchị, ọtụtụ ndị omeiwu Imo Steeti si na pati PDP pụọ, banye APC.
Ka ọ dị ugbua, ndị pati APC ka ọnụọgụgụ ha karịrị n'ụlọ omeiwu Imo steeti.
















