Imo State House of Assembly: Anyị nụrụ ụda egbe mgbe anyị chọro imata ihe ejiri chụọ anyị - Onye omeiwu n'Imo

Ebe foto si, Arthur Egwim/Facebook
Ụda egbe na-ada n'Ụlọomeiwu Imo steeti dịka onyeisi ya bụ ụlo omeiwu bụ Paul Emeziem kwuru na achụọla ndị omeiwu isii n'ụlọomeiwu.
Mgbe BBC Kpọtụru "Chief Whip" ya bụ ụlọomeiwu bụ Arthur Egwim, ọ gwara BBC Igbo na o so na ndị achụrụ ma sị na agwaghị ha ihe mere e jiri chụọ ha.
Arthur kọwara BBC Igbo na ọ wepụtara "Motion" maka ndi ụlọakwụkwọ ndi adigboroja, ha tuliri ya ma binye ya aka.
O kwuo sị, "ihe ọzọ onyeisi ụlọomeiwu kwuru bụ na achụọla mmadụ isii ndị omeiwu nke gụnyere ụlọọrụ 'Chief Whip' ".
Egwim kọwara na ọ bụghi etu e si eme n'ihi na ekwesịrị ị gwa ha ihe ha mere ma ehiwekwa nzụkọ ga-enyocha ebubo eboro ha.
O kwuru sị, " Ọ bụ mgbe anyị chọrọ ịmata ihe ejiri chụo anyị ka anyị nụrụ ụda egbe, onye ọbụla a zọrọ isi onwe ya".
Odoghị anyị anya ndi gbara ya bụ egbe, kama kepkeup na-ekwu na ọ bụ Ozuruigbo kpọtara ndị gbara ya bụ egbe.
Ndị Omeiwu ọzọ achụrụ bụ :
- Uche Ogbuagu (Ikeduru LGA),
- Barrister Anyadike (Ezinihitte LGA),
- Ezerioha Dominic (Oru West LGA),
- Philip Ejiogu (Owerri North LGA),
- Micheal Onyemaechi (Ihitte Uboma LGA),
- Kennedy Ibe (Obowo LGA).
Dịka o siri dị, ọ bụ Obinna Okwara na-anọchite anya Nkwere nọchiri Arthur Egwim n'ọrụ.
O kwuru na enweghị ihe ọ ga-eme n'ihi na ihe a bụ okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.
Lee ihe mere mgbe BBC gara ebe ahụ:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ chọpụtara na n'ime mmadụ isii a sị na-achụrụ n'ọrụ na mmadụ atọ abịaghị.
Dike Nwosu bụ 'Minority Leader' ụlọomeiwu ahụ gwara BBC n'ekwentị na ihe mere taa na-akpa ya ọchị n'ihi na ọ maghị ihe kpatara onyeisis ụlọomeiwu ahụ ga-eji kwu okwu dị etu a.
Onye ọzọ nọ ebe ahụ bụ Onyemaechi Njoku kwukwara na o kweteghi n'ihe onyeisi ụlọomeiwu ahụ kwuru nke mere na ọ ga-aga n'ihu na-anọchị anya ndị be ya.
Ọ kọwara na e nwere komitii dị n'ụlọomeiwu kwesiri inyocha ndị e boro ebubo imejọ ọkwa ha ma taa ha ahụhụ ma gaa n'ihu kwuo na ọ pụtara na o kweghi na ọchụchụ achụrụ ya.
Gee ihe ndị ọzọ ha kwuru n'uju n'ime onyonyo a dị n'elu.










