Hope Uzodinma: "Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ ịgba ụlọ Gọvanọ Uzodinma ọkụ"- Kọmịshọna mgbasa ozi Imo Steeti

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Screen grab

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kọmịshọna mgbasa ozi nke Imo steeti bụ Declan Emelumba kwuru na ọ bụ ndị omekome ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado chọrọ iwakpo ụlọ gọvanọ kama ndị nchekwa nọ n'ụlọ Gọvanọ hụrụ na ha emeghị ihe ha bu n'obi.

Ọ bụ na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere ka o siri kọwaa ebe gọọmentị Imo steeti kwụ.

Emelumba kwuru sị, "Ndị nchekwa ekweghị ha mee ihe ha chọrọ ime kama mmadụ otu naọbụ abụọ nwụrụ".

"Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchi na-akwado mkpamkpa a na-eme"

O kwuru na ọ bụ ndị iro ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado na-eme ihe ndị a.

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Emelumba kọwara na ihe ndi a bu n'obi bụ ka ha gosi ndị mmadụ na ọ bụrụ na ha nwereike ịwakpọ ụlọ gọvanọ Imo steeti na enweghị ebe nwere nchedo kama ha emewụghị ya.

Mana ihe a na-eme kwa na steeti ọzọ, nke Imo ọ pụrụ iche?

O kwuru kwara sị, " Ihe na-eme n'Imo steeti di iche na ihe na-eme na steeti ndi ọzọ".

Ọ kọwara na-enwere ndị kwuru na mbụ na ha ga-ebute ọgbaaghara n'Imo steeti.

Kedụ maka ozi a gọọmentị ga-ezi ndị Imo steteti ụjọ na-atụ?

O kwuru na Gọvanọ nọ ya ma gwa ndị Imo steeti ka ha hapụ ịtụ ụjọ n'ihi na gọọmentị na-agba mbọ ihu na ha jidere ndị omekome a tupu ha eme ihe ha bu n'obi.

Etu ndị amaghị ndị ha bụ siri gbaa ụlọ Gọvanọ Imo steeti ọkụ

Ulọ Uzodinma

Ebe foto si, Screen grab

Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Imo steeti bu Godson Orlando Ikeowu ekwuola na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa atọ ka ndị wakporo ụlọ aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodim ma.

Maazị Ikeokwu sị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa "Civil Defence" abụọ na otu onye uweojii ka ndị a ji egbe gburu.

Otu onye hụrụ oge ihe a mere gwaburu BBC na ndị bịara mwakpo gburu onye nche no n'ụlo ahụ.

Onye ahụ sịkwa na ha bụ ndị obodo ahụ ma onye ahu egburu, ọ sịkwa na o nwere mmadụ abụọ ọzọ ndị ahụ gburu dịka ha na-abịa obodo ahụ.

Obodo Omuma dị n'okpuru ọchịchị Oru East nke Imo steeti.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Gọvanọ Uzodimma n'onwe ya anọghị n'ụlọ ya oge mwakpo a mere dịka ọ gara Abuja izute Onyeisiala Muhammadu Buhari. A na-eche ne ọ bụ maka mwakpo dị iche na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mere o jiri gawa njem ahụ.

Dịka onye hụrụ ihe a mere siri gwa BBC Igbo na ndị a bịara mwakpo a ji ụgbọala na-ebu aja, Siena, na ụgbọala eji ebu mmadụ.

Ọ sịkwa na ya busi taya moto n'elu ụgbọala ha.

Ọ sị: "Anyi nụrụ ka egbe na-ada. Obere oge anyi hu nnukwu anwụrụ. Ka ihe a mechara anyị gazie hụ ka ụlọ na-agba ọkụ."

Dika o siri kọwa, ndị nchekwa ndị ọzọ nọ ebe ahụ gbara ọso.

Aha onyonyo, Orlu Crisis: "Ndị uweojii enweghi ike ịkọwa mmadụ ole nwụrụ n'Orlu"

Ihe onyonyo na foto ndị etinyere na soshal midia na-egosi ụlọ nche anwụrụ ọkụ na-awụpụ na ya nakwa ụgbọala na-agba ọkụ dịka ndị mmadụ na-agba mbọ ịgbanyụ ya.

N'ihe onyonyo a gosiri onye nọ n'ala n'ihu ụlọ Uzodimma.