Imo State News: Anaghị akpa nkata ịchụpụ 'speaker' Imo steeti - Uche Ogbuagu

Uche Ogbuagu/Chiji Collins

Ebe foto si, Uche Ogbuagu/Chiji Collins

Nkọwa foto, Uche Ogbuagu na Collins Chiji, onyisi ụlọomeiwu Imo steeti

Uche Ogbuagu bụ onye omeiwu na-anọchite anya ndị Ikeduru n'ụlọomeiwu Imo steeti ekwuola na enweghi onye ọbụla chọrọ ichutu onyeisi ụlọomeiwu ahụ.

Ogbuagu bụkwa onyeisi ndị kacha n'ọnụọgụgụ n'ụlọomeiwu ahụ nke Bekee kpọrọ "Majority Leader", gwara BBC Igbo na ọ bụ asị ka ndị mmadụ na-efesasị n'ihe gbasara nchutu Hon. Chiji Collins bụ onyeisi ụlọomeiwu ahụ.

Ọ gara n'ihu rụọ ndị otu ya nọ na pati nke kacha pee mpe n'ụlọomeiwu ahụ aka, sị na ọ bụ ha na-akwanye ya bụ ọkụ.

Uche Ogbuagu kwuru na kama ndị pati ahụ ga-agbado anya n'ihe gbasara ụzọ a ga-esi jikọọ aka ọnụ mezie Imo steeti, ha a na-efesasị ọtụtụ asị.

N'ihe gbasara ego ụgwọ ọnwa e ji ha, Ogbuagu kwuru na ọ bụ maka nrụrụaka na-adụpatakarị gbasara etu e si akwụ ya bụ ụgwọ ọnwa.

Nke mere ka Gọvanọ Hope Uzodinma ji rịọ ha ka ha nweturu ya ndidi ka o hazie etu a ga-esi were akara "Bank Verification Number (BVN)" na-akwụ ha ụgwọ.

Uche Ogbuagu

Ebe foto si, Uche Ogbuagu

Nkọwa foto, Uche Ogbuagu bụbu ọkpaọchị a ma ama tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị

Iji sara ọnụ ebubo e boro ndị pati kacha pee mpe n'ụlọomeiwu ahụ, onyeisi ha bụ Anyadike Nwosu gwara BBC Igbo na ha na-agwa Hon. Chiji na ihe ọ na-eme adịghị mma n'ihi na ọ naghị achịta ha ọfụma.

Nwosu kwuru na ọ bụrụ na ọ chịtawa ha ọfụma na ha ga-akụrụ ya aka ma nye ya ezigbo nkwado.

N'okwu ya, "O nwere ihe dị iche na "ọ bụ pati m" na "ọ bụ ọchịchị anyị. A gafeela ihe pati People's Democratic Party (PDP) maọbụ All Progressives Congress (APC).

"Ihe a nọzị n'elu ya ugbua bụ ọchịchị a ga-eji chịa Imo steeti nke ọma, etu a ga-esi mee iwu ga-ada ụda ma nyere ndị Imo aka...

"Ọtụtụ ndị Imo na-ajụ ihe anyị bụ ndị omeiwu na-eme nakwa ekwu maka ihe mere e ji jide ọtụtụ ndị ụgwọ."

Nwosu gakwara n'ihu kwuo, na ọ bụ ma ndị nọ na pati onyeisi ụlọmeiwu ma ndị anọghị na-atamu ntamu a maka na ọchịchị ya amasịghị ha.

O kwuru na ihe Chiji na-eme na-amasịghị ha gụnyere na ọchịchị ya akwụghị ọtọ, na ọ na-ezoro ha bụ ndị omeiwu ọtụtụ ihe bụ ihe ha kwesịrị ịma maka ya, ọkachasị hanwa bụ ndị isi n'ụlọomeiwu ahụ.

'Naanị otu igwe okwu dị n'ime ụlọomeiwu anyị'

Anyadike Nwosu

Ebe foto si, Facebook/Anyadike Nwosu

Nkọwa foto, Anyadike Nwosu, onyeisi pati kacha nta n'ụlọ omeiwu Imo steeti

Nwosu kwuru na ọ bụ maka na emeghi ihe e kwesịrị ime kpatara ndị omeiwu ruru 13 ji bute ọrịa coronavirus na steeti ahụ.

O kwuru na e wepụtaghị ihe ndị e ji eyichi aka, ehicha aka nakwa ekpuchi imi.

Ọ sịkwa na nke ka njọ bụ na ọ bụ naanị otu igwe okwu (microphone) ka mmadụ niile na-eji ekwu okwu n'ụlọomeiwu ahụ, n'agbanyeghi na a mapụtala ego e kwesịrị iji tinyechaa ihe ndị ahụ.

Oge BBC Igbo kpọrọ Chiji Collins, o sị na ihe gbasara nchutu ya abụghị eziokwu.

Collins kwuru na ọ bụ Dominic Ezerioha, ọnụ na-ekwuru ndịomeiwu Imo steeti, ka ọ dị n'aka ikwu okwu gbasara nke a.

Ezerioha gwara BBC Igbo na ebubo niile ndị pati nke nta na-ebo Chiji abụghị eziokwu.

Dominic Ezerioha

Ebe foto si, Facebook/Dominic Ezerioha

Nkọwa foto, Dominic Ezerioha, ọnụ na-ekwuru ndị omeiwu Imo steeti.

O kwuru na ọbụghị naanị otu igwe okwu (microphone) ka ndị omeiwu niile na-eji ekwu okwu.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na onweghi ihe ọbụla ndị omeiwu kwesịrị ịma nke onyeisi ha bụ Chiji na-ezoro ha ezoro.

N'okwu gbasara ụgwọ ọnwa ha, Ezerioha kwukwara otu ihe ahụ Uche Ogbuagu kwuru, nke bụ na gọọmentị ka na-ahazi usoro ịkwụ ụgwọ ọnwa n'Imo steeti iji wepụ nrụrụaka niile dị n'ime ya.

"Mgbe ọbụla e mechara nke a, a ga-akwụ anyị ụgwọ n'uju," Ezerioha kwuru.