Imo House of Assembly: Hope Uzodimma anabatala onyeisi ụlọomeiwu Imo ọhụrụ ahọpụtara ụnyahụ

Ebe foto si, Amara Iwuanyanwu Facebook Page
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma anabatala onyeisi ụlọomeiwu ọhụrụ bụ Kennedy a họpụtara ụnyahụ bụ November 9,2021.
Amara Iwuanyanwu bụ osote ụlọomeiwu achụtụrụ achụtụ depụtara nke n'akara social midia taa bụ November 9, 2021.
Iwuanyanwu mechara tinye foto ebe ya , gọvanọ Uzodimma nakwa Kennedy Ibeh kwụ see foto.
Cheta na ndị ụlọomeiwu isii nke Amara Iwuanyannwu (bụ osote onyeisi ụlọomeiwu achụtụrụ na mbụ) nọ n'isi ya chụtụrụ Paul Emeziem bụbụ onyeisi ụlọ omeiwu ahụ.
Etu e si wepụ onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti ma tinye nke ọhụrụ taa

Ebe foto si, Rt Hon Amarachi Iwuanyanwu Facebook Page
Ụfọdụ ndị ọmeiwu n'Imo steeti ewepụla Paul Emeziem dịka onyeisi ụlọomeiwu na steeti ahụ ma họpụta Kennedy Ibeh ka ọ nọchite ya n'oche.
Onye omeiwu bipụtara ozi a bụ Chigozie Nwaneri, onye kwuru na Paul Emeziem metọrọ ọkwa oche ahụ.
Onye bụ Kennedy Ibeh?
O so na ndị omeiwu isii, Emeziem kwụsitụrụ ọrụ n'ụbọchị Julaị 8, 2021 dịka o boro ya maka nrụrụaka.
Ibeh na-anọchite anya ndị Obowo n'Imo steeti, banyere oche ahụ n'afọ 2015 ma nwete ọkwa ahụ n'afọ 2019.
Etu o si mee
Okwu pụtara mgbe ndị ụlọomeiwu Imo steeti ruru isii nke Amara Iwuanyanwu nọ n'isi ya, banyere n'ụlọ ahụ n'ike ma chụtuo onyeisi ya bụ Paul Emeziem.
Nke a mere ka ndị ụlọomeiwu nta họpụta onyeisi ọhụrụ.
Tupu a chụtuo Emeziem, egechiri ogige omeiwu ahụ, ma jụ ka ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ ghara ịbanye oge ahụ.
E kwekwughị ka Emeziem bata n'ụlọomeiwu ahụ mgbe ọ chọrọ ịbata taa.
Kennedy Ibeh bụ onyeisi ọhụrụ ụlọomeiwu Imo ugbua gwara onye ntaakụkọ anyị n'ekwentị na ọ ga-eme ihe niile dị n'ike ya ime ka onye ụlọomeiwu sonyere n'ihe ọbụla a na-eme.
Emeziem gwara onye ntakụkọ anyị na nchutu achụtụrụ ya bụ ihe "ụmụaka", na o nweghi isi.
Ibeh si mpaghara Obowo.
BBC Igbo chọpụtara na ya bụ mwepụ erughi nkeji ise dịka onye ọbụla lasara ebe ahụ.
Aka m adịghị na nkata nchutu a chuturu osote m n'ọkwa - Onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti

Ebe foto si, Emeziem Paul/Amarachi Iwuanyanwu/Facebook
Cheta na onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti bụ Paul Emeziem gọrọ ebubo na-ekwu na ọ kpara nkata ịchụtụ osote ya n'ọkwa.
A chụturu Iwuanyanwu Amarachi n'ọkwa n'ehihie ụbọchị Tuusde dịka ndị omeiwu mmadụ iri na asatọ nwere mkpebi pụrụiche akpọrọ 'Resolution'.
Nke a mere ka ụfọdụ ndị na-akwado Iwuanyanwu boo Emeziem ebubo na o ji nde naịra iri asaa (70m) kpaa nkata ịchụtụ Iwuanyanwu.
"Ndị Omo ma na Emeziem bụ onye kwụwara aka ya ọtọ agaghị esonyenwu n'ụdịri omume gụnyere ikwummadụ okwu azụ, ịkpa nkata ọjọọ nakwa ibo ndị ilo ya ebubo" ka o kwuru.
Ihe ọzọ o kwuru bụ na ọ bụ uche ọtụtụ ndị ụlọomeiwu ka o mere dịka ọrụ ya si nye.
Cheta na ọ bụ n'ehihie Tuzde ka akụkọ gbọwara na a chụọtuola osote onyeisi ụlọoomeiwu Imo steeti bụ Amarachi Iwuanyanwu n'ọkwa.
A chụọtuola osote onyeisi ụlọoomeiwu Imo steeti

Ebe foto si, Amarachi Iwuanyanwu/Facebook
A chụọtuola osote onyeisi ụlọoomeiwu Imo steeti bụ Amarachi Iwuanyanwu n'ọkwa.
Nke a pụtara ihe dịka ụlọomeiwu steeti ahụ mechara nzụkọ iji kpaa ihe ga-eme mmadụ isii omeiwu achụturu n'ọkwa kemgbe ọnwa Julai afọ 2021.
Iwuanyanwu Amara bụkwa onye na-anọchite anya gburgburu Nwangene dị n'Imo steeti kwa.
Paul Emeziem bụ onyeisi ụlọọmeiwu ahụ kpọghachitara mmadụ isii achụbụru n'ọnwa Julai mgbe e nwere ọgbaghara n'ebe ahụ.
Taa bụ mbụ a na-eme nzụkọ ụlọomeiwu ọbụla kemgbe afọ ise gara aga.
Ekene Nndoimele bụ onye welitere okwu e ji chụpụ Iwuanyanwu kwuru na ọ bụ mkpebi ya na omeiwu iri abụọ na asaa ọzọ mere.
Ọ kụwghị kwanu ebubo ọ bụ kpọm kwem e ji chutuo osote onyeisioche kama o detura ya n'akwụkwọ ma nyefee ya n'aka onyeisi ụlọomeiwu ahụ taa.
Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ihe mere kọwara nke a n'onyonyo mgbasaozi anyị na ya mere n'ehihie ụbọchị Tuusde.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









