Ikoyi building collapse update: A hụla ozu abụọ ọzọ mere ya mmadụ 45 nwụrụ n' ụlọelu dara na Legọs

Ebe foto si, LASG
A hụla ozu mmadụ abụọ ọzọ n'ụlọelu ogogo 21 ahụ dara n'Ikoyi, Legọs steeti nke mere ya mmadụ 45 nwụrụla n'ọdachi ahụ.
Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Gbenga Omotoso gbara ama a n'ozi o wepụtara ụbọchị Wenezde.
Ọmotosho kwuru na a na-eme nchọpụta onye bụ onye ozu ndị ahụ n'ụlọọgwụ 'Infectious Disease Hospital, Yaba, Lagos Mainland' .
Ọ kwukwara na ka ọ dị ugbua, mmezianụla 32 ewetala ihe a ga-eji nweta DNA iji chọpụta ozu bụ nke onye tupu ebunye ndị nwe ozu nke ha.
A hụla ozu Femi Osibona,onye nhazi ụlọelu dara na Legọs

Ebe foto si, Femi Osibona FACEBOOK
A bọpụtala ozu Femi Osibona n'ụlọelu dara n'Ikoyi Legos ụbọchị Tọzde.
Osibona bụ onye na-ahazị ọrụrụ ụlọelu ogogo iri abụọ na otu darar ụbọchị Monde dagide ihe ruru mmadụ iri ise nọ n'ime ya n'Okporoụzọ Gerrard Road, dị n'Ikoyi,Legọs.
Kọmishọna ndị uweojii Legos bụ onye gbara ama nke a na mgbede Tọzde kwuru na e bugala ahụ nwaamadi ahụ n'ụlọozu 'Military Hospital' Ikoyi.

Ebe foto si, BBC/Getty
Ụlọelu ogogo 21 dara n' Ikoyi dị na Legos ụbọchị Monde dagbuo ihe karịrị mmadụ 30.
Ahụla ozu mmadụ 36 n'ụlọelu dara n'Ikoyi

Ebe foto si, Lasema
A hụla ozu mmadụ 36 gụnyere nwoke iri atọ na atọ na ụmụnwaanyị atọ n'ụlọelu ogogo iri abụọ na otu dara n'Ikoyi Legos na nsonso a.
Ndị ọrụ gbatagbata sị na ha na-aga n'ihu n'ịchọ ndị ka tọọrọ n'ụlọ ahụ daara ụbọchị Monde, abalị mbụ nke ọnwa Novemba afọ 2021.
Onye nchịkọta otu gbatagbata na mpaghara Ọdịda Anyanwụ bụ Ibrahim Farinloye sị na ọrụ ịchọ ndị tọọrọ n'okpuru ụlọ ahụ daara ada tara akpụ.
Ihe i kwesiri ịma maka onye nwe ụlọọrụ rụrụ ụlọelu dara ada n'Ikoyi

Ebe foto si, LASEMA FACEBOOK
Osibona bụ onyeisi ụlọọrụ Fourscore Homes Limited nakwa onye na-ahụ maka mwụlite ụlọ ahụ daranụ.
N'ime otu ajụọ azaa o mere n'ụlọọrụ Thisday , o kwuru na o so n'otu akpọrọ NHBRC (National Home Builders Registration Council) na South Africa nakwa "Zurich Building Guarantee" dị na Europe.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ Thisday n'onyonyo ahụ na ụlọọrụ ya na-arụ ụlọ dị iche iche n'akụkụ mbaụwa dị iche iche. Lee ihe ndị ọzọ o kwuputere maka onwe ya na mkparịtaụka ahụ dị n'onyonyo.
Osibona bụ onye Afịrịka mbụ rụtara ụlọelu ruru ogogo asaa na mba United Kingdom nakwa ụlọ dị iche iche na mba ahụ.
O kwuru na tupu ọ banye ọrụ iwulite ụlọ, o na-erebu akwa na akpụk ụkwụ na London.
Ọ gwara Thisday na "o so na ndị ọkachamara ya so wulite mpaghara ọwụwa anyanwụ London."Olufemi Adegoke Osibona nakwa ụlọọru ya gabigara oke ihe mgbu mgbe ụlọ elu ruru ogogo iri abụọ na otu dara n'Ikoyi n'ụbọchị Nov 1,2021.
N'ọnụ ya, " arụtalam ụlọ ruru iri ise na London nakwa ụfọdụ na mba South Afịrịka.
Osibona kwuru na ọ bịara ala Naịjirịa ka ọ bia nyeghachị ala nna ya ihe ọma.
Ụlọọrụ ya rụtara ụlọ akpọrọ 360 Towers dị n'Ikoyi, ụlọelu ogogo ya ruru iri na ise nakwa ọtụtụ ụlọ ndị ọzọ dị na Legos.
Osibona gụrụ akwụkwọ na Mahadum Croydon dị na mba UK ebe ọ gụrụ azụmahia na mmefu ego.
Tupu ọ gawa mba ofesi , ọ gụru akwụkwọ primary na Lagos ma gụọ n'ụlọakwụkwọ secondary Mayflower dị n'ikene, Ogun steeti.
Ndị nwụrụ eruola 20, ebe a zọpụtarala mmadụ iri n'ụlọelu dara

Ebe foto si, AFP
Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ha na-ehiwe otu abụghị nke gọọmentị ka ha nyocha etu mmiri siri baa opi ụgbọgụrụ na nnukwu ụlọelu dara n'Ikoyi Legos n'ehihie Monde abalị mbụ nke Novemba 2021.
Ndị ọrụ gbatagbata azọpụtala madụ iri ugbua, ebe mmadụ 20 bụ ndị nwụrụ anwụ ahụrụla n' ụlọelu ogogo iri abụọ na abụọ ahụ dara.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Babajide Sanwo-Olu, onye kwuru na otu ahụ ga-ama imi n'ala chọpụta ihe kpatara ya bụ ọdachị ma taa ndị ikpe mara ahụhụ, akwụsịla Gbolahan Oki bụ onyeisi ngalaba steeti ahụ na-ahụ maka ewumewu ụlọ ọrụ n'ike.
Ndị ga-anọ n'otu nnyocha ahụ ga-esi n'otu "Nigeria Institute of Architects' (NIA), 'Nigerian Institute of Town Planners' (NITP), 'Nigeria Society of Engineers' (NSE) na otu ọrụ ndị ọzọ.
N'agbanyeghị oke mmiri zoro n'abalị, ndị ọrụ gbatagbata na ndị obodo ji ọkụ na-egwu tutu rue chi ofifo.
Ọtụtụ ndị onye nke ha tọọrọ n'ụlọ ahụ dara ada nọkwa nso na-atụ uche ịmata ma ha ndị ndụ ma ha eso na ndị nwụrụ anwụ.

Nke a na-abịa dịka ihe mberede pụrụiche zutere ndị na-arụ ọrụ n'ụlọelu nọ n'ụzọ Gerard, n'Ikoyi, Legọs steeti, n'ụbọchị Mọnde, ụbọchị mbụ n'ọnwa Nọvemba.

Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ otu narị (100) nọ n'ime ụlọelu ahụ ruru ogogo iri abụọ na otu (21) mgbe ọ dara.

Ndị ọrụ gbatagbata ụlọọrụ National Emergency Management Agency (Nema) nke Legọs steeti wụchiri inyere aka na-ịgbapụta ndi tọrọ n'ụlọ ahụ dara ada.
Dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo bụ Chiagozie Nwonwu si hụ, ndị agbataobi dị nso gwara ya na ndị tọrọ n'ime ụlọelu ahụ ugbua na-akpoku ndị be ha, na ndị agbata obi ha nakwa ndị ọrụ nchekwa ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ kwuru na ihe a mere ebe elekere mbụ nke ehihie taata.

Kirie ka ọsọ enyemaka mgbapụta ha si aga ugbua:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Akụkọ kwuru na agụpụtara otu onye, mana amaghị ma ọ dị ndụ maka na ọ naghị emegharị ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gbatagbata nke Legọs steeti erutebeghị ruo elekere anọ n'ehihie a, mana ha na agba mbọ ịgbapụta ndị tọrọ n'ime ụlọ a dara ada.

Ka ọ dị ugbua amabeghi mmadụ ole tọrọ n'ime ya bụ ụlọelu a dịka ọtụtụ ndị mmadụ bi ebe ahụ si ekwu.
Akụrụngwa pụrụiche e ji agụpụta ndị mmadụ n'ụdị ọnọdụ a awụchibeghị n'ogige ebe ihe a mere.

Ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gbata gbata ekwuola na mmadụ olemole merụrụ ahụ.
Ndị tọrọ n'ime ụlọ ahụ ugbua na-akọ ndị be ha, ndị agbata obi ha nakwa ndị ọrụ nchekwa ka abịa gbapụta ha.
Ụlọ a dara bụ otu n'ime ụlọ elụ atọ nọkọrọ ọnụ, a na-arụ na mpaghara Parkview Ikoyi.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara aka ebe na ụlọ a dara dị ịrị na anọ na ogogo dịka abụọ ndị nke ọzọ ka kwu ọtọ na akụkụ ya nọkwa na ogogo iri na anọ.
Otu nwoke na ndị be ebe ahụ kwuru na kemgbe elekere mbụ nke ehihie ihe a mere na ha nọ na-akpọ ndị ọrụ gbata gbata mana ha abịabeghị ruo ugbua (elekere anọ nke ehihe).

Mkpu akwa na-afịọ n'ogige ihe a mere.
Otu nwoke nọ ebe a na-ebe akwa na nwanne ya nọ n'ime ụlọ ahụ dịka ọ hapụrụ nwanne ya gaa izụta nrị ma ekwe ntị nwanne ya anaghi agazi ugbua.
Ndị nọ ebe ahụ ugbua na-ewe ịwe na ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gbata gbata abịabeghi ugbua.
Amabeghị ihe mmadụ ole nọ n'ime ụlọ a, mbọ a na-agba ka ekwuturu ndị nwee ụlọ a enwebeghi isi ugbua.

Amabeghi ihe mere ụlọ ji daa dịka ọ ka bụ ụlọ arụchabeghi.
Ndị nọ ebe ahụ, nakwa otu n'ime ndị na-arụ ụlọ ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ na ụlọ a dara ka ndị nke ọzọ nọ ebe ahụ elụ dịka ọ dị iri abụọ na otu.
Nke a ga eme ya mmadụ abụọ ekwurula nwụrụ ebe ahụ.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo kwuru na kpachi kpachi ụzọ bụ ihe gbochiri ndị ọrụ nchekwa na ọrụ gbata gbata ibịa ebe ahụ ugbua.
Dịka ndị nọ ebe ahụ na ewe ịwe na akụrụngwe ndị ọrụ gbata gbata abịabeghi n'igwe na ha ga ejị aka ha malịte igba mbọ igbapụta ndị a ugbua, nke a na eme na ebe elekere anọ na ọkara.
Akụkọ kwukwara na ndị na-arụ ụlọ nọ na-eme ọgbakọ mgbe ihe ọdachị a mere.









