Army vs Ipob: 'Anyị agbaghị egbe aghara aghara oge anyị gara inwuchi ndị Ipob/ESN na Mgbowo' - Ndị agha

Njirmara ndị Ipob nakwa ụlọ dị na Mgbowo

Ebe foto si, BBC/Getty Images

Dịka ndịagha Naijiria na-ekwu na ha nwụchiri ndị isi Ipob abụọ ha na-ekwu so na na-eme mkpamkpa n'Ọwụwa Anyanwụ na Mgbowo, otu Ipob eboola Ndịagha ebubo inye nkịta ajọ aha iji gbuo ya.

Ndị agha Naịjirịa kwuburu na ha wụchiri n'ogige ụlọ nzuzo ndị otu Ipob/ESN nọ na Mgbowo n'ụbọchị Mọnde ma nwụchie mmadụ abụọ ha si bụ ndị isi ahụrụ kwaba okpu n'otu ahụ.

Site n'n'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful binyere aka ma wepụta ụbọchị Tuzde, otu ahụ kwuru na o nweghị eziokwu dị n'ebubo ahụ kama na ndị agha na-akpa arụ n'Ọwụwa Anyanwụ ma na-ebo otu ahụ ebubo ụgha.

"Aka ndị agha dị n'oke ogbugbu mmadụ n'eme n'Ala Biafra, ha agaghị agọ agọ."

Ụlọ agbara ọkụ
Nkọwa foto, Ọ bụ ụlọ ka ndị obodo sị na ndị agha gbara ọkụ na Mgbowo

E nwere ihe onyonyo na-efegharị ebe ndị agha na-egosi ike ha n'ahụ ndị enweghị ihe ha mere n'Ọgwụ dị n'Enugwu steeti. Ha aga asị na ọ bụ ndị Ipob na ESN nọ n'ihe onyonyo ndị ahụ ebe a na-agba ụlọ ndị mmadụ ọkụ ?"Otu ahụ gara n'ihu kpoo oku ka e mee ezi nyọcha iji mata ndị nọ n'ihe onyonyo ahụ., si na ọ bụ ndị mere nke a bụ ndị na-akpamkpamkpa n'Ọwụwa Anyanwụ.

'Anyị agbaghị egbe aghara aghara oge anyị gara inwuchi ndị Ipob/ESN na Mgbowo' - Ndị agha

Ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ha nwụchịrị mmadụ abụọ a n'abali foro chi ụbọchị Mọnde.

O kwukwara na ha amalitela nnyocha n'isi mmadụ abụọ a ma kwukwa na akụkọ ndị na-ekwu na ha gbara egbe aghara aghara ebe ahụ bụ akụkọ ugha

Otu onye obodo Mgbowo dị n'okpuruọchịchị Ọgwụ (Awgu) nke Enugwu Steeti gwara BBC Igbo na ndị agha Naịjirịa bịara mwakpo n'obodo ahụ n'ụtụtụ taa.

Dịka onye ahụ achọghị ka e kwuo aha ya siri kwuo, ọ bụ n'ọnụ ụtụtụ ka ndị agha ahụ jiri bịa ma gawa ụlọ otu onye ha sị bụ onyeisi ndị unknown gunmen n'Isi-Ngwu Mgbowo.

Ọ sị na ndị agha gbara otu ụlọ ọkụ na mwakpo ahụ.

"Ọ bụ ụlọ onye ahụ ndị agha chọrọ bịa ka ha gbara ọkụ. Ha gbakwara otu onye okoroọbịa obodo anyị egbe n'ụkwụ."

Ọ sị na onye ahụ ndị agha gbara egbe n'ụkwụ bụ onye otu nchekwa Enugwu Steeti a na-akpọ "Forest Guard".

Dịka o siri kwuo, onye Forest Guard ahụ gara ebe ahụ dịka mkpa mkpa ahụ na-akpa "ndị agha were gbaa ya egbe sị na ọ bụ onye ọgba mma ndị Unknown Gunmen".

Ọ sịkwa na ndị agha kpụrụ ndị okoroọbịa atọ dịka ha na-ala.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa bụ Ọchịagha Onyema Nwachukwu ka o kwuo ihe ọ ma maka ije ndị agha na Mgbowo mana ọ si na ya enwetebeghị ozi banyere ya.

Ọ sị na ya ga-ezite ozi banyere ya n'oge na-adịghị anya.

Map

Ụfọdụ ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na soshal midia ha na-ekwu si Ngwu Mgbowo pụta gosiri ebe ndị agha Naịjirịa na-amụnye ọkụ n'ụlọ ndi mmadụ ma na-agba egbe aghara aghara, mana BBC Igbo nwetebegh akaebe na ọ bụ na Mgbowo ka onyonyo ndi ahụ si pụta.

Onye ya na BBC Igbo kwuru okwu na-akọwa na ndi mmadụ ka chị obi ha n'aka maka ihe mere. Ọ sikwa na ndị agha nọghịzị n'obodo ahụ.

N'ọnwa Sepụtemba ndị ojiegbe amaghi ndi ha bu wakporo ebe ndị patị Peoples Democratic Party (PDP) na-eme nzukọ na Nnenwe di n'okpuru ọchịchị Aninri.

Nnewe na Mgbowo dị nso.

Ndi ma maka mpaghara ahu gwakwara BBC Igbo na ndi ojiegbe a awakpoola Mgbowo mbụ dịka ha na-amanye "sit-at-home".

Na Seputemba, ndi amabeghi ndị ha bụ gbara mpaghara ụlọ ọrụ ngalaba "Independent Electoral Commission" (Inec) ọkụ n'Ọgwụ.

Mwakpo ndi ndị soneyere mwakpo ndi ọzo na-eme aghara aghara na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kemgbe ngagharịiwe Endsars.