Building Collapse in Lagos: Ndị mmadụ ka tọrọ n'ụlọelu dara na Legọs ụbọchị ụka

Ndị mmadụ ka tọrọ n'okpuru ụlọelu nke dara n'ogbe Osasa nke dị na Bariga na Legọs Steeti n'abalị ụnyaahụ bụ ụbọchị ụka.
Ndị ọrụ gbata gbata gọọmentị Legos dị iche iche nọ ebe ahụ ụgbua na-achọ otu ha ga-esi zọpụta ndị tọrọ atọ.
Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na a kpụpụtala mmadụ isii mana amabeghi mmadụ ole ka tọrọ n'ala.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ gbatagbata nke steeti Legọs bụ Kenny Adebayo gwara BBC na ha ga-agbalị ole ha nwere ike iji hụ na a zọpụtara ndị nile ya bụ ihe metụtara.

Ụlọ ọdịda bụzị ihe na-eme kwa daa na Legọs.
N'ọnwa Maach afọ a, otu ụlọakwụkwọ dara na mpaghara Ita Faaji nke Legọs.
Mmadụ iri na asatọ nwụrụ n'ihe mberede ahụ ebe mmadụ iri anọ na otu.



Akụkọ ka na-abịa.
Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










