Imo State Pension: Gọọmentị akwụchabeghi anyị ụgwọ ezumike nka - Onyeisioche ndị 'pensioners'

Ndị lara ezumike nka
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụfọdụ ndị ọrụ lara ezumike nka n'Imo Steetị ekwuola na ọ bụghị eziokwu na gọọmentị akwụchaala ha ụgwọ ezumike nke ruo ọnwa Disemba.

N'ozi Kọmishọna mgbasaozi n'Imo Steetị bụ Declan Emelumba wepụtara mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Owere, ọ sịrị na Gọvanọ Hope Uzodinma akwụchaala ndị ọrụ nakwa ndị lara ezumike e nyocharala ụgwọọnwa rute ọnwa Disemba, afọ 2020.

Emelumba sị na ozi banyere etu ha si kwụọ ụgwọ dị na websaịt ha a.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Mana onyeisi kọmitii na-agba mbọ maka ụgwọ ezumike nka (Pensioners Intervention Committee) n'Imo Steetị bụ Ikechukwu Ohaneje sị na okwu a bụ asị ọcha.

Ọ sị na kemgbe Gọvanọ Hope Uzodinma baara n'ọchịchị n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020, na ọ bụ naanị ụgwọ ezumike nke ọnwa Jenụwarị na Febụwarị ka ọ kwụzuru ndị mmadụ.

"Kemgbe ahụ o naghị akwụzu ụgwọ ezumike nka, o nwere ndị ọ kwụrụla ọnwa asatọ, ọnwa anọ, otu ọnwa.

Ohaneje kwuru, "E nwekwara ndị a kwụrụ ụgwọ ọnwa Nọvemba na Disemba afọ 2020 ma mechaa mịrị ego otu ọnwa n'ọbaego ha".

Ohaneje sị na nnyocha gọọmentị sị na ọ na-eme bụ nke gọvanọ ji aka ya eme na o nweghi mgbe a gwara ndị lara ezumike nka bịa ka e nyochaa ha.

Na gọọmentị na-eme nyocha n'ime ọbi ọchịchị gọvanọ, ebe otu jikọtara ndị lara ezumike nka na-amaghị maka ya.

Ọ gara n'ihu sị na ha emeela nnyocha dịka ha na-ala ezumike nka n'ọrụ tupu e nye ha akwụkwọ njirimara ha dịka ndị lara ezumike nka.

Ọ sị na mgbe Emeka Ihedioha nọ n'ọchịchị na o kwuru na a ga-eme nnyocha nke onye ọbụla gara n'ụlọọrụ ya dị iche iche e nyochaa ha.

Etu esi pịa ndị lara ezumike nka ihe n'Owere

Ndị ezumike nka na-eme ngagharị iwe

Ebe foto si, Samuel Mba

Onyeisi ndị ndị lara ezumike ike nka n'Imo steeti bụ Ikechukwu Ohaneje ekwuola na ihe mere na osoghi mee ngagharịiwe ndị otu ya mere n'ụbọchị Tuzde bụ maka na ndị ọrụ nchekwa nke nke 'State Security Service' majara ya.

Ohaneje gwara BBCIgbo na ndị ọrụ nchekwa a biakwutere ya n'ụbọchị Mọnde gwa ya na ha hụ ya ebe a na-eme ngagharịiwe na ha ga-ata ya ahụhụ.

O kwuru na ndị DSS a gwara ya na ọ bụrụ na ya abịaghị na ndị otu ya agaghị eme ngagharịiwe ọbụla.

Ohaneje kwuru na ndị otu ya si na ha ga-eme ngagharịiwe n'ihi na agụrụ na-agụ ha n'ihi na anaghị akwụ ha ụgwọ ọnwa.

Ọ kọwara na ọ bụ onye nkwuchite ọnụ ha kama na ndị otu ya sị na ha ga-eme ngagharị iwe, na o nweghị ike ịkwụsị ha.

Ọ kọwara na ọ gbara ọsọ n'owerre n'ụbọchị ahụ.

Gee ihe o kwuru n'uju ya ebe a

Aha onyonyo, 'Ndị chekwa Imo steeti sị m esola ndị otu m mee ngagharịiwe' - Onyeisi ndị Pensioners

Ohaneje kwuru sị "Ọ bụ ihe nwute na gọọmentị Imo steeti sitere ndị bịara pia ha ihe ma wụọ ndị okenye mmiri".

O kwuru na ọ bụ mgbe ọ kpọrọ ha n'ekwe ntị ka ha gwara ya na ndị agboro tiri ha ihe.

Ohaneje kwuru na mgbe ndị otu ya ahụghị ya, ha mere ngagharịiwe were sị ka akpọpụta Ohaneje.

O kọwara na ọ bụ osote onyeisi ndị uwe ojii biakwutere ha, were kwa ha na Ohaneje anọghị n'aka ha.

Ohaneje kwuru sị " Anyị na-ajụ si na olee ndị kpọtara ndị a bịara pịa ndị okenye ihe n'ihi na ha chọrọ ihe ruru ha.

Ihe gọọmentị Imo steeti kwuru

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke gọọmentị Imo steeti bụ Oguiwike Nwachukwu gwara BBCIgbo na ọ bụ asị.

O kwuru na enweghị ihe dị otu ahụ mere.

O kwuru sị "Ọ bụ ndị ezumikenka ibe ha chụrụ ha ọsọ".

O kwuru na ha na-eme ngagharị iwe mbụ ma enweghị onye nyere ha nsogbu na gịnị ga-eme ka gọọmentị bido ịnye ha nsogbu ugbu a.

Aha onyonyo, Oluomachi Opara: 'Nwata a puruiche' - Onyeisi Ndiukwe