Jamb Result: Ndị Imo steeti kachasị 'agba mgbọ' n'ule Jamb

Ebe foto si, Getty Images
Ozi ọhụrụ pụtara n'aka ngalaba na-ahazi ule bụ JAMB na-egosi na Imo steeti bụ ndị kachasị "aghọ aghụghọ" n'ule Mahadum ahụ.
Ndị ejidere bụ ndị Imo ruru mmadụ iri abụọ na asaa ebe Anambara ji mmadụ iri na isii soro ya n'azụ.
Steeti ndị ọzọ gụnyere: mmadụ iri na ise si Enugwu, Kaduna nakwa Kano steeti.
Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba ahụ bụ Fabian Benjamin gwara ụlọ ntaakụkọ The Nation na akpụpụla ụfọdụ n'ime ndị ahụ ụlọikpe.
"Anyi na-eche ka ọrịa Coronavirus na ihe so ya laa tupu anyị amalite ị kpee ndị ahụ ikpe ọzọ" ka o kwuru.
Ndị ahụ niile e jidere ruru otu narị na iri itoolu na ise n'aha mmehie dị icheiche gụnyere: izobata Teknụzụ n'ime ule, i lere onye ọzọ ule, ịbute gbagharịa nakwa ịkpa nkata ịghọ aghụghọ n'ụlọ ule.
"Tọghapụnụ Leah Sharibu!"

Ebe foto si, The Cable
Ọtụtụ ndị mmadụ na Naijiria nakwa na mba ụwa akpọọla oku ka gọọmenti mee ka Leah Sharibu, nwa ada ndị Boko Haram ji kemgbe afọ 2018 maka ịjụ ịghọlahu Kraisti.
Taa bụ abalị iri na anọ nke ọnwa Mee ka o mere afọ iri na asaa a mụrụ Leah mabụrụkwa afọ atọ ọ nọrọ n'aka ndị Boko Haram.
WHO akwadola ịkpọpụta ndị ọrụ ha na Burundi

Ebe foto si, @WMulombo/Twitter
Ngalaba ahụike mba ụwa bụ WHO ekwuola na o dobeghị ha anya ihe mere mba Burundi jiri chụpụ onye nnọchite anya ha ebe ahụ nakwa mmadụ atọ na-arụrụ ha ọrụ.
Cheta na n'ụbọchị Tọzde gọọmentị mba Burundi si Walter Kzadi Mulombo,onye ọrụ WHO na mba ahụ na ndị ọzọ na ha achọghịkwa ha n'ala ha.
Ndị mba Niger egbuola ndị Boko Haram 75

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mba Niger ekwuola na ha egbuola ndị ogbu aṅụ ọbara bụ Boko Haram na Mpaghara Diffa nke dị nnukwu ọdọ mmiri Chad.
Nke a bụ site na mbọ ha gbara nke gbara mkpị i ji megide ndị otu oyi egwu niile na mpaghara ahụ.
Nke a na-eme dịka ụbọchị atọ gachara ebe ndị otu oyi egwu ọzọ eche na ha na ndị otu IS gba gburu ihe karịrị mmadụ iri abụọ n'obodo dị n'ọke Niger na Mali.
Nwoke tụwara nwa ya ime

Ebe foto si, Anambra Police
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uwe ojii n'Imo steeti bụ Ikeokwu Godson Orlando kwuru na ha ejidela otu nwoke aha ya bụ Uchenna Egbuchulem onye obodo Ogwa ndị n'okpuru ọchịchị Mbaitolu maka ịdina nwa ya nwaanyị n'ike ma tụwa kwa ya ime.
Ndị uweojii kwuru na nwoke a na-eji mma eyija nwa ya nwaanyị ma dịna ya n'ike.
Akụko na-ekwu na nwunye nwoke a bụ onye Ivory Coast hapụrụ ya mgbe nwa ha dị obere.
Dịka ọ dị ugbu a, ndị Uweojii sị na ha na-eme nyocha ha ma kwuo na ha ga-akpụpụ ya ụloikpe dịka iwu si di.
Ndị INEC maka Covid-19
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Nigerian Independent Electoral Commission (Inec) sị ka ụlọọrụ ha dị na Edo nakwa Ondo mepee taa bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Mee.
Inec sị na nke a bụ maka ntuliaka na-abịa na steeti ndị a ahụ. Ha sịkwa ka sọsọ ndị ọrụ nwere ụgbọla malite ọrụ na steeti ndị ọzọ.
N'Afrịka,

Ụfọdụ ọdụm nọ n'ege a na-edowe ụmụ anụmanụ na mba Saụt Afrịka gbakpụrụ n'abalị foro chi Tuzdee.
Ndị uweojii sị na-emechara nwụchịe ọdụm ndị a n'ehihe Tuzde mana ọ bụ ka ha kpagharịrịchara n'ime obodo Alldays ma yikwa ndị mmadụ egu.N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba ahụike mba ụwa bụ "World Health Organization" (WHO) ekwuola na ụfọdụ ọgwu a eji agwọ coronavirus na-enye aka site n'ime ka ọrịa ahụ naa ọsịsọ ma ọ bụ me ka etu o si egbu mmadụ dị mfe.WHO sị na ọ na-ele ọgwụ ise kachasị arụ ọrụ anya ọfụma.










