Imo state Buhari Visit: Kedụ ihe ọ na-abịa ime?

Buhari na Uzodimma

Ebe foto si, Femi Adesina/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ihe ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ maka ọbịbịa Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Imo Steeti n'ụbọchị itoolu nke Septemba, afọ 2021.

Njem a bụ nke mbụ ọ ga-abịa n'Imo nakwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kamgbe o merichara ọchịchị nke ugboro abụọ ya n'afọ 2019.

Kedụ ihe ọ na-abịa ime n'Imo Steeti?

N'akwụkwọ gọọmentị Imo Steeti wepụtara, ha sị na onyeisiala Buhari na-abịa ileta etu ọrụ si aga na steeti ahụ nakwa ịgbape ụfọdụ ihe ndị gọọmentị Hope Uzodimma rụpụtara.

Mana ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ "kedụ ọrụ ndị ọ bụ kpọmkwem?"

Gọọmentị Imo akpọghị aha ọrụ ndị ahụ kpọmkwem mana e nwere ụfọdụ ọrụ ndị ha wepụtara n'ihe onyonyo, nke ha sị na-aga n'ihu ugbua.

Ọrụ ndị ahụ gụnyere;

Okporoụzọ dị n'Owere

Ebe foto si, Imo State New Media

Nkọwa foto, Ụzọ 'Concorde Boulevard'
  • Ọrụ ọwammiri a kpọrọ "Balloon Technology System" dị n'ụzọ Chukwuma Nwoha nke a sị bụ iji gbochie idemmiri n'Owere.
  • Okporoụzọ si Naze gawa Nekede na Ihiagwa
  • Uzo dị n'Egbeada, Amakohia
  • Ebe njikọ ụzọ a kpọrọ 'Concord Boulevard junction' dị n'ụzọ si Owere gawa Pọtakọt na ndị ọzọ.

Kedụ ihe ọzọ ha kwuru maka ọbịbịa Buhari?

Gọvanọ Uzodimma dọrọ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) aka na ntị maka ọnọdụ onye apụla ezi ha yinyere n'ụbọchị Tọzde Onyeisiala Buhari ga-abịa.

Ọ sị ka ndị mmadụ ghara ịṅa Ipob ntị ma sị ka onye ọbụla gawa mkpa ya n'ụbọchị ahụ.

Ahụhụ anọ ndị Imo na-ata ugbua dịka steeti ahụ na-akwado ịnabata Buhari

Ebe akwaturu ụlọ

Ndị bi n'Imo steeti etipula mkpu gbasara ọnọdụ siri ike na ahụhụ ha na-agabiga ugbua.

Nke a niile na-eme dịka Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari na-akwado ịga njem nleta na steeti ahụ n'ụbọchị Tọzde bụ September 9,2021.

Ahịa na ebe dị icheiche gọọmentị steeti ahụ si n'aka ngalaba OCDA akwapịa n'Owerre bụ nke na-esogbu ha nsonso a.

Lee ya na ihe ndị ọzọ na-echụ ndị steeti ahụ, ọ kachasị ndị bi n'Owerre ụra.

Ọnọdụ nchekwa

Ndị e chere na ha bụ ndị wakporo ụlọọrụ ndị uweojii na Njaba nakwa Omuma

Ebe foto si, Imo State Police

Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021, ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo ghọrọ ihe ọzọ dịka ndị amaghị ndị ha bụ malitere ịwakpo ndị ọrụ nchekwa.

Nke a metụtara Orlu, Enugwu, Ekwulobia na obodo dị icheiche n'ala Igbo.

Aha onyonyo, Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu

Mana ebe ọ kachasị njọ bụ n'Orlu nke dị n'Imo steeti dịka ndị agha batara ebe ahụ ịnyeaka kpọchapụ ndị omekome ahụ.

Nke a emekwaala ka ndị bi na mpaghara ahụ bee akwa arịrị ma boo ndị ọrụ nchekwa ebubo ịwakpo ha na ụmụ ha site n'iche na ha bụ ndị omekome.

Nkwapịa ahịa dị icheiche

Ebe akwaturu ụlọ

Kemgbe ụbọchị 25 ọnwa ọgọst ka gọọmentị ahụ si n'aka ngalaba OCDA na-akwapịa ụlọahịa dị icheiche na steeti ahụ.

Ha kwapịara ya n'ụlọ ahịa akpọrọ 40:40 nakwa ebe ọzọ a kpọrọ 'Control Point' nke dị n'Owere.

BBC gbara ndị ihe a metụtara ajụjụ ọnụ, ha ekwuo na ndụ gbara ha gharịị nakwa na gọọmentị ahụ enyeghi ha ohere zuruoke tupu ha akwatuo ya.

Gọọmentị onwe ha kwuru na ihe ndị ha kwaturu bụ ihe ndị enweghi ikike ị nọ ebe ahụ na mbụ.

Ụkọ mmanụ ụgbọala

Ụkọ mmanụ ụgbọala
Nkọwa foto, Ụkọ mmanụ ụgbọala bụ otu ịhe ndị Naịjirịa sị na ewe ha iwe maka Naịjirịa so na obodo na emepụta mmanụ

Ụkọ mmanụ agbịdị malitere dịka akụkọ feere na ndị na-ere mmanụ ụgbọala chọrọ ịgba abụbụ ọrụ maka eseomokwu dị n'etiti ha na gọọmentị steeti ahụ.

Gọọmentị steeti ahụ na ndị na-ere ya bụ mmanụ mechara nwee nkwekọrịta nke kwụsịrị ụkọ ahụ.

Mana na mbido izuụka gara aga, ndị mmadụ bidokwara ịkwụ n'ahịrị dịka ụkọ ahụ na-aga n'ihu.

O nwbeghi onye ma ihe mere ụkọ ahụ ka ji aga n'ihu.

Ntaramahụhụ si na 'Sit-at-home' kwa ụbọchị Monde

Ụlọakụ agbchiri n'Imo steeti

Ihe ọhụrụ ndị Imo steeti na-agabiga ugbua bụ ntaramahụhụ si na 'Sit-at-home' nke Ipob manyere dapụta.

Kemgbe ụbọchị 9 n'ọnwa Ọgọst Ipob manyere ya bụ ihe, ogbugbu na-eso ya kwa Monde ọbụla.

Ugbua gọọmentị steeti ahụ agbachiela ụfọdụ ụlọakụ n'Owere maka emepeghi n'ụbọchị Monde.

Cheta na ndị mmadụ gwara BBC na ọ bụ ụjọ ji ha ịpụta na be ha kwa Monde.