Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị

Aha onyonyo, Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị

Ihedioha gwara BBC Igbo na mgbe e kpechara ikpe a na ọ nabataghị ya mana onweghi ihe ọ ga-emenwu maka na ọ bụ ụlọikpe kachasị kpere ikpe.

Kama na oge ya na ndị ụkaiwu ya nyochara ikpe ahụ ma chọpụta na o nwere ohere ịlaghachị ka ndị ọkaikpe lebagharịa anya n'ikpe ha kpere.

Nke a bụ maka na ebe ha gbakwasịrị ụkwụ kpee ikpe a nwere ihe na-edoghi anya n'ime.

Na mgbe e mere ntuliaka ma kpọpụta ya dịka onye meriri na onweghi mgbe e kwuru na o nwere ọdọ ebe a na-atụ vootu dị 388 ha jiri tụkwasị n'elu vootu Uzodinma.

Mgbe a jụrụ ya maka ngagharịiwe ndị PDP na-eme maka ikpe a, Ihedioha sị na ọ bụghị gwara ndị PDP mee ngagharịiwe.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ndị PDP mere ngagharịiwe kama na ndị mmadụ maara na ikpe ekpere ezighi ezi.

N'ajụjụ ihe mere o ji dịka o ji aka ike achụ Rochas Okorocha bụ onye ọ natara ọchịchị, O kwuru na ihe o mere bụ ihiwe kọmitii ga-ahụ iwechịte akụnaụba ndị Imo Steeti a kpachiri akpachi.

Na ihe o mere bụ ihe ndị Imo Steeti chọrọ n'aka ya, na ọ dịghị mma otu onye ịkpachikọ akụnaụba gọọmentị bụ nke ọha nwe.

Ihedioha gara n'ihu kọwapụta ọtụtụ ihe ndị ọ rụpụtara n'Imo Steeti n'ime ọnwa asaa ọ nọrọ n'ọchịchị.

Mana mgbe BBC Igbo gbara Rochas Okorocha ajụjụ banyere etu Ihedioha si akpasị ya agwa ọ sị ọ bụghi akụnaụba Imo Steeti mere ya onye ọ bụ. Na ọ kpatachala ego tupu ọ bụrụ gọvanọ.

Na gọọmentị Ihedioha na-akpa agwa ka ụmụaka kama na ihe mere o jiri gba nkịtị bụ maka na ọ chọrọ udo n'Imo Steeti.

Rochas gara n'ihu kwuo na ọnọdụ ya n'ime Steeti dịka nke ọnọdụ onye nna n'ime ezinụlọ bụ onye na-eme udo n'oge niile.

Kirie nke a n'uju.

Ndị mere ihe nkiri a bụ Uche Akolisa na Vining Ogu