Isaac Christian Ihim :Ndị ojiegbe egbuola onyeisoche ọzọ n'Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii n'Imo steeti ewepụtala ozi gbasara etu ndị omekome si gbuo onyeisioche wọodụ APC dị n'Imo steeti n'ụbọchị Wenzde.
Ha kwuru na nwoke ahụ aha ya bụ Isaac Christian Ihim a ma dịka 'Zako' bụ onyeisioche wọọdụ APC dị n'Umucheke-Okwe n'okpuruọchịchị Onuimo na steeti ahụ.
"A dọpụtara nwoke ahụ na be ya ma gbuo ya dị ezuchara ya ohi ekwentị, obere ego o ji nakwa cardi ụlọakụ ya" ka ndị uweojii kwuru.
Mgbe ndị uweojii ruru ebe ahụ, ha weere ozu nwoke ahụ wega n'ụlọozu ma malite nyocha banyere ihe mere.
N'otu aka ahụ Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mohammed Ahmed ahọpụtala ndị uweojii pụrụiche ilebanye anya na ya bụ okwu.
Akụkọ kwuru na mgbe e gburu onyeisioche ahụ, na ndị ahụ tọrọkwara opekatampe mmadụ ise.
Ihe ọzọ e kwuru bụ na ndị omekome ahụ gakwara n'obodo dị nso ebe ahụ a kpọrọ Okwelle ma tọrọ onye otu APC ọzọ.
O nwebeghi ihe ndị uweojii kwuru maka akụkọ ndị a tọrọ naanị nwoke onyeisioche nke e gburu.
Ogbugbu ndi metụtara ndọrọndọrọọchịchị mere n'Ọwụwa anyanwụ n'izu a

Ebe foto si, Chris Ohizu/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'izụ ụka a, ndi bu egbe gburu o pekata mpe mmadụ atọ n'ogbugbu metụtara metụtara ntuliaka afọ 2023 na-akpụdebe nso.
Lee ụfọdụ n'ime ha :
1. Chris Ohizu
Na Fraide, abalị 20 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023, ndị bu egbe wakporo ụlọ Chris Ohizu bụ onyeisioche Okpuru Ọchịchị Ideato-North.
Mana ebe nile mara ijiji n'abalị 22 nke ọnwa Jenụẁarị, ihe onyonyo gbara n'intanet gosiri ebe a kpụbara nwa amadii ahụ n'ọhịa gbuo ya ma bepụ ya isi.
2. Nwaanyị a mabeghị onye ọ bụ:
N'ụbọchị Wenezde, abalị 27 nke ọnwa Jenụwarị, ndị bu egbe wakporo ọgbakọ achụmta vootu PDP n'Ọgwụ dị n'Enugwu steeti wụọ mgbọ nke tara isi otu nwaanyị , ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Mwakpo metụtara aka na ndọrọndọrọ ọchịchị malitere ịrị ibe ya elu kemgbe nkwado ntuliaka afọ 2023 a bidoro n'ezie.
E nwekwaala akụkọ mwakpo n'Ebonyi steeti mgbe onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha APGA boro ebubo na awakporo ya na ndị nkwado ya n'okpuruọchịchị Izzi dị na steeti ahụ.
Ndị uweojii na-ebo otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob ebubo n'aka ha dị n'ọnwụ Chris Ohizu mana otu Ipob aghọrọ sị na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ Ọchịchị ji ndị ekperima akpa arụ ma na-ebo otu ha.












