Aga m arụ ọrụ n'Enugwu West ọfụma karịa Ike Ekweremadu - Osita Ngwu

Aha onyonyo, Osita Ngwu: "Aga m agba mbọ nọchite anya ndị Enugwu West ọfụma karịa Ike Ekweremadu"
Aga m arụ ọrụ n'Enugwu West ọfụma karịa Ike Ekweremadu - Osita Ngwu

Ọsọ onye ga-anọchi oche sịnetọ Ike Ekweremadu na-anọchite anya ndị Enugwu West n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa ekpowala ezigbo ọkụ ugbua.

Onye ji ọkọlọtọ pati People's Democratic Party (PDP) na-azọ ọkwa a bụ Osita Ngwu, ekwuola na ya ga-eweta mmepe na mpaghara agụmakwụkwọ, ọrụ ugbo, ịnweta ọrụ, ịrụ ụzọ nakwa ahụike.

Osita Ngwu

Ngwu kwuru na ọ ga-ewetere ndị Enugwu West oke rụụrụ ha site n'ịnọchiteanya ha nke ọma.

O kwuru na ọ gbara afọ iri anọ na anọ, nke pụtara na ọ abụghị obere nwa n'ịzọ ọkwa Sịnetị iji nọchie oche onye bụbu osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremmadu.

Ngwu kwere nkwa na ọ ga-agba mbọ rụọ ọrụ karịa Ike Ekweremadu n'ụlọomeiwu. Kirie ihe o kwuru;