Etu m ga-esi zọpụta Abia Steeti n'agbụ ọchịchị ọjọọ e kere ya kamgbe afọ iri abụọ - Chima Nwafor

Aha onyonyo, Etu m ga-esi zọpụta Abia Steeti n'agbụ ọchịchị ọjọọ e kere ya kamgbe afọ iri abụọ

Onye ji aha Young Progressive Party (YPP) azọ ọkwa Governor Abia State bụ Chima Nwafor ekwuola ihe ọ ga-emere ndị Abia ma ọ bụrụ ha họpụta ya dịka gọvanọ ha.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Nwafor sị na ọ chọrọ ịzọpụta ndị Abia site n'agbụ ndị ọchìchị kere ha kamgbe afọ iri abụọ a mailtere ọchịchị onye kwuo uche ya.

Chima Nwafor na-azọ ọkwa n'aha YPP n'Abịa steeti.
Nkọwa foto, Chima Nwafor na-azọ ọkwa n'aha YPP n'Abịa steeti.

Mgbe a jụrụ ya ihe mere o jiri hapụ pati PDP banye na YPP, ọ sị na ọ chọpụtara na PDP bụ ndị nọ n'ọchịchị kamgbe afọ iri abụọ agaghị azọpụtanwu ndị Abia tinyekwara na ha agaghị enye ya ohere I mere ndị Abia ihe ọma o bu n'obi banyere ha.

Nwafor gara n'ihu kọwaa ọtụtụ ihe ndị ọ ga-eme ma ọ bụrụ o merie dịka gọvanọ, ihe ndị a gbakwasịrị ụkwụ n'azụmaahịa, akụnaụba, nchekwa, agụmaakwụkwọ, ọrụ ugbo, okporoụzọ, mmepe obodo, ndị ntoroọbịa, ịkwụ ndị ọrụ na ndị lara ezumike nka ụgwọ dgz.

Kirie ihe ndị o kwuru n'uju n'ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a.