John Abraham Godson: Ihe mere m ji na-azọ ọkwa n'ADC ma na-akwado Peter Obi nke Labour Pati

Aha onyonyo, Godson Abraham: Tunyere ndị ezigbo mmadụ pati ọ masịrị ha nọrọ
John Abraham Godson: Ihe mere m ji na-azọ ọkwa n'ADC ma na-akwado Peter Obi nke Labour Pati
Abraham Godson na Peter Obi

Ebe foto si, Abraham Godson/Facebook/Peter Obi

    • Onye dere ya, Makuochi Okafor na Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter na Edit
    • Ebeg o si, Lagos

John Abraham Godson na-azọ Senetọ Abia steeti n’aha pati African Democratic Congress (ADC) kọwara BBC Igbo ihe mere o ji na-akwado onye na-azọ ọkwa onyeisiala na Labour pati ma ghara ikwado onye nke pati ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, o kwuru na ugbua abụghị oge a na-ekwu okwu ịtụnyere ndị mmadụ n’ihi pati ha si kama ọ bụ oge ịtunyere ndị ma ọrụ.

Ọ kọwara na nke a bụ n’ihi na Naijiria nọ na nnukwu nsogbu.

Godson Abraham

Ọ tụrụ alo ka ndị mmadụ tụnyere ndí ezigbo mmadụ na-agbanyeghí pati ha nọ na ya azọ ọkwa ọchịchị.

Godson bụ onye nọbu ala Bekee tupu ọ laghachị Naijiria kwụrụ na ikwado agụmakwụkwọ ga-abụ ihe ọ ga-etinye uche pụrụ iche ma ọ banye ọkwa ọchịchị. Ọ kọwara na ọ laghachiri Naijiria maka itinye ego na iji ego acụú ego, ma chọpụta oke ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ihi enweghị ezi ọchịchị nke mere ka o kpebie ịbanye n’ọcchịchị iji tinye ihe ọ mụtara na mba Poland bụ ebe ọ rụọla dịka senetọ n’ọrụ ọchịchị obodo.

Kirie ihe o kwuru n’uju n'ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a.