Bola Tinubu: Ha chọrọ ji ụkọ mmanụ ụgbọala na ego ọhụrụ kụsaa ohere m na ntuliaka

Bola Tinubu

Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter

Onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naijiri n'afọ 2023 n'aha otu 'All Progressive Congress'(APC bụ Bola Ahmed Tinubu eboola ebubo na gọọmentị ugbua bụ jchọrọ iji nsogbu ụkọ mmanụ ụgbọala nakwa ibipụta ego ọhụrụ kụọrọ ya ahịa na ntuliaka 2023.

Tinubu kwuru nke n'ọgbakọ achumtavootu ọ gara n'Abeokuta,Ogun steeti ụbọchị Wenezde, abalị 25 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.

Ndị nwere agba n'otu APC na ndị nkwado pati ahụ pụtara n'igwe n'ama egwuregwu MKO Abiola Stadium dị n'Abeokuta.

Gọọmentị nọ n'ọchịchị ugbua nke Muhammadu Buhari bụ onyeisila ma bụụkwa Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ nke APC.

Tinubu kwụrụ: “Arụrụmala juru ha ahụ. Ha chọrọ ime ka enwee nsogbu ụkọ mmaụ ụgbọala mana chezọọ maka ya,obi dajụọ ụnụ mụnwa Asiwaju ga-ebi ụkọ mmadụ ụgbọala."

"Ha achọghị ka ntuiaka a nwee isi. Ha chere na ha ga-ebute nsogbu; tinye ụkọ mmanụ. Mana e nwere mmanụ ụgbọala maọbụ na enweghị, annyị ga-aga ebe ahụ merie."

Bola Tinubu

Ebe foto si, Bashir Ahmed

Bola Tinubu

Ọ gara n’ihu kwuo,” Ọ masị gị, tinye ego n’ego mmaụ ụgbọala, ma hapụrụ anyị mmanụ ụgbọala.”

Ọ masịkwuo gị, mee out ihe ahụ n’naira, anyị ga-emeri na ntuliaka na-abịa.”

“Anyị ga-eji akwụkwọ vootu napụ ha ọchịchị.”

"Ha bụ ndị okpokpo asị., Ha nwere ike ịsị na mmanụ adịghịzị.”

“ Ha na-ezochi ego ọhụrụ, ha na-ezochi mmanụ mana anyị ga-atụ vootu ,anyị ga-emeri ha.”

Mana Onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa Onyeisi Ụlọakụ Etiti bụ Godwin Emefiele ekwuola ugboro ugboro na ego ọhụrụ bụ iji belata nrụrụaka, ọkachasị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị zupuru ego nakwa ndị ntọ dọkwara ego ha natara na ntọ ma belata ọnụahịa na-agbali elu.

Bola Tinubu

Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter

"Ha bụ ndị okpokpo asị., Ha nwere ike ịsị na mmanụ adịghịzị.”

“ Ha na-ezochi ego ọhụrụ, ha na-ezochi mmanụ mana anyị ga-atụ vootu ,anyị ga-emeri ha.”