Ihe APC kwuru maka itinye aha Chimaroke Nnamani n’otu achụmnta vootu ha

Ebe foto si, Bola Tinubu/Chimaroke Nnamani/Facebook
Otu pati All Progressives Congress (APC) asaala ajụjụ ọha nwere banyere aha otu onye pati People’s Democratic Party (PDP) nwere agba bụ Sịnetọ Chimaroke Nnamani nke gbara n’akwụkwọ otu achụmnta vootu ha.
Ozi pati APC kọwara na nke a emeghi na-amaghị ama dịka ha kwuru na ha mụ anya mee ya bụ nhọpụta aha Nnamani n'akwụkwọ ha.
Ozi ha kwuru “E tinyere aha ya dịka onye na-akwado onye na-azọrọ anyị ọkwa onyeisiala bụ Asiwaju Bola Ahmed Tinubu n'ihi na ha abụọ bụ ezigbo enyi.”
Cheta na Chimaroke Nnamani nọ na pati PDP, nke bụ patị ọ nọ merie ntuliaka ịbụ Gọvanọ Enugwu steeti ugboro abụọ, malite na 1999 ruo 2007.
Taa, Nnamani bụ Sinetọ na-anọchite anya mpaghara Enugwu East n'okpuru pati PDP.
Mgbe aha ya gbara n'akwụkwọ ndị APC, ọtụtụ jụrụ ajụjụ maka otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke nwaamadị a so na ya kpọmkwem, maka na mmadụ anaghị awụnye aka abụọ n'ọnụ n'otu oge.
APC sara site n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Bayo Onanuga zipụtara n'ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị 26 nke ọnwa Sepụtemba ma sị, “isonye n’otu achụmnta vootu anyị bụ ikike dịịrị ya.”
“Chimaroke Nnamani onye nọ mba Amerịka bụ ezigbo enyi Bola Ahmed Tinubu.”
“Agbanyeghị na o nwereike ighara isonye anyị n’ọgbọ ọrụ dịka onye PDP ọ bụ, mana o kpebiela inye ezigbo enyi ya nakwa nwanne ya nkwado zuru oke.”
“Ọ bụrụ na e nwere ndị kwesịrị inye nkọwa n’okwu a ugbua, ọ bụ ndị pati nke ọ nọ n’ime ya.”
Mbọ BBC Igbo gbara ịnụ olu ndị otu pati PDP nakwa Sịnetọ Nnamani n'okwu a amịtaghị mkpụrụ n'ihi ha ekweghị zaa ozi ha.

Ebe foto si, Chimaroke Nnamani/Facebook
Cheta na mgbe akwụkwọ ahụ gbara n'ọha na mbụ na ụlọntaakụkọ Channels TV kwuru na onyeisi otu PDP n'Enugwu steeti bụ Augustine Nnamani kọwara na ya bụ ihe ga-abụ n'amaghị ama ka ndị APC ji mee ya.
Dịka Augustine si kwuo, "Chimaroke Nnamani ka bụ ezigbo onye otu PDP, ọ naghịkwanụ eche echiche ịpụ na pati anyị."
N'aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru ndị APC bụ Felix Morka kwuru na Tinubu nwere ọtụtụ ndị nkwado n'ebe dị icheiche ọ bụghị sọ na APC.
"Otu achụmnta vootu maka ọkwa onyeisiala na APC abụghị naanị maka ndị nọ na pati anyị, ọ bụ maka ndị niile kwenyere n'onye na-azọrọ anyị ọkwa a bụ Tinubu. Ndị dị otu a nwere ohere ịnye aka n'ọrụ ma kwalite ihe anyị na-eme."
Inec kwuru na achụmnta vootu ga-amalite kpọm kwem n’ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba a.
Onye PDP hụrụ Tinubu n'anya

Ebe foto si, Chimaroke Nnamani/Bola Tinubu/Facebook
Ọ bụ eziokwu na Chimaroke Nnamani bụ onye PDP nke pụtara na o kwesịrị ịkwado Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na pati ahụ, mana ihụnanya o nwere ebe Bola Ahmed Tinubu nọ abụghị ihe ọ na-ezo ezo.
Tinubu bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na APC.
N'ọnwa Ọgọọst afọ a, oge APC họpụtachara Tinubu dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa Onyeisiala, ụfọdụ mmadụ katọrọ nke a ma na-ekwu na Tinubu emeela okenye ebe ụfọdụ na-ekwu na ahụ esighịzi ya ike.
Mana Chimaroke Nnamani dere ogologo ederede iji kwadoo Tinubu, zipụta ya na soshal midia, ma kọwaa ihe mere o ji tozuo oke ịzọ ọkwa onyeisiala.
N'ime ederede ahụ, Nnamani gụpụtakwara ọtụtụ ndị ọchịchị na mba ụwa dị icheiche, tinyere mba Amerịka, bụ ndị na-arịa otu ọrịa maọbụ nke ọzọ oge ha nọ n'ọchịchị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana na ngwụcha ederede ahụ, Nnamni kwuru na onye ọ ga-atụrụ vootu ya, n'ihi na ọ bụ onye na-azọ na pati ha.
Ebee ka Nnamani kwụ akwụ ugbua

Ebe foto si, PDP/APC/Twitter
N'akwụkwọ ebe pati PDP depụtara aha ndị ga-eso chịkọta achụmnta vootu maka ntuliaka 2023, aha Chimaroke Nnamani bụ nke 69.
Abịa n'akwụkwọ nke ndị APC wepụtara, aha ya dị n'ọnụọgụgụ nke 350.
Ụfọdụ na-ekwu na Nnamani apụọla na PDP banye na APC, mana kamgbe otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ a wepụtara akwụkwọ achụmnta vootu ha, o kwubeghị ihe ọbụla gbasara ya, n'agbanyeghị na ọ na-ewepụta ozi dị icheiche n'akara Twitter ya.









