Ademola Adeleke: Ụlọikpe kachasị ga-ekpezi onye nwetere mmeri n'Osun steeti - Gboyega Oyetola

Gboyega Oyetola na Ademola Adeleke

Ebe foto si, Gboyega Oyetola/Facebook/Ademola Adeleke/Instagram

N’ụbọchị Fraịdee, Gboyega Oyetola nke pati All Progressives Congress (APC) gwara ndị nso nso ya ka ha nọrọ jụụ dịka ọ ga-eburu okwu ma ọ meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti ka o merighi gawa ụlọikpe kachasị.

Ozi ya kwuru na o kwetesiri ike na ya bụ ọchịchị kwesiri iru ya aka dịka o kwuru na o nwete akwụkwọ ikpe nke ụlọikpe megharị kpere were mee mkpebi ha mere n’ụbọchị Fraịdee, ọ ga eburu mkpesa maka okwu gawazie ụlọịkpe kachasị iji mee mkpebị ikpeazụ n’okwu a.

Ozi a nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Ismail Omipidan zipụtara n'abalị Fraịde depụtara ihe ndị a.

Ụlọikpe mkpegharị kwuru n’ụbọchị Fraịdee na ọ bụ Ademola Adeleke nke Peoples Democratic Party (PDP) bụ onye nwetere mmeri na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ n’afọ 2022.

Etu ụlọikpe mkpegharị si kpebie na Ademola Adeleke ga-abụ gọvanọ Osun

Ademola Adeleke

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Instagram

Ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ mkpebi chọburu ịchụpụ Gọvanọ Ademola Adeleke n'oche dịka gọvamọ Osun Steeti n'ezie.

N'ikpe a e kpere n’ụbọchị Fraịdee abalị 24 nke ọnwa Maachị, ụlọikpe a na-ekwekọrịta ndị ọkaikpe atọ nọ n’isi ikpe a nke ọkaikpe Mohammed Shuaibu duru, ha dọpụrụ n'akụkụ mkpebi na Adeleke emerighị na ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti e mere n’ụbọchị 16 nke ọnwa Jụlaị 2022.

Ikpe ntuliaka kwuburu ka e nyefee Adegboyega Oyetola nke APC ikike ọchịchị mana ikpe ụlọikpe mkpegharị a, kụchapụrụ mkpebi a.

Ụlọikpe ahụ kwuru na mkepbi ụlọikpe pụrụiche maka ntuliaka mere n’okwu a nke sị na atụnyefeere Adeleke vootu site n’ihe ndị sị na ha hụrụ ya bụ ihe e mee kwuru ezighi ezi.

Ụlọikpe ahụ kwukwara na ndị debanyere aha na ntuliaka bụ ntọala ime mkpebi ọbụla banyere mpụtara ntuliaka ahụ.

Ha kwuru “Mkpesa mkpegharị a rijuru afọ, ya mere anyị jiri nabata ya”

Cheta na ikpe a nke Adeleke gbaghara n’ụlọịkpe mkpeghari bụ nke Oyetola bu gaa ụlọikpe pụrụiche maka ntuliaka nke ọkaikpe kpere ya bụ Terse Kume nyeburu iwu ka a napụ Adeleke na osote ya bụ Kola Adewusi akwụkwọ ikike ọchịchị dịka e ducharala ha iyi ọrụ.

Okwu ahụ n'oge ahụ boro ebubo nke metụtara ngwa Bvas ụlọọrụ Inec.

Ihe Inec kwuburu mgbe ikpe a chọrọ ịkụpụ ya n'oche pụtara

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission (Inec)' kwuru n'ụbọchị ikpe ahụ pụtara ha agaghị enweike tinye ọnụ n’akụkụ mkpebi ụlọikpe mere n’okwu onye ga-achịzị Osun steeti dịka gọvanọ.

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Festus Okoye gwara BBC Igbo na Fraịdee ahụ:

“Anyị enwetabeghị akwụkwọ mkpebi a n’aka ụlọikpe ahụ, ruo mgbe anyị nwetere ya, anyị agaghị enweike tinye ọnụ na ya bụ mkpebi n’ihi anyị amabeghị ihe kpatara e jiri mee mkpebị ahụ n’uju.”

O kwuru na ha nweta ya bụ akwụkwọ mkpebi n’ikpe a, na ha ga-enyocha ya ma mee mmụta n’ime ya ọkachasị dịka ntuliaka 2023 na-abịa abịa.

Okoye kwuru na iwu nyere Adeleke ihe dịka ụbọchị 21 iji gbaghaa mpụtara ikpe a n’ụlọikpe mkpegharị.

Iji saa ajụjụ a jụrụ ya maka ntụkwasịobi ndị mmadụ nwere n’ebe akụrụngwa nke teknụzụ Bvas dị nakwa etu o si metụta ikpe a, o kwuru:

“Dịka m kwuru na mbụ, anyị ahụbeghị akwụkwọ ikpe a iji mara ma e nwere ka okwu Bvas siri dapụta n’ime ya. Ihe anyị ma bụ na ụlọọrụ anyị ga-eji Bvas mee ntuliaka 2023. Anyị nwere ntụkwasị obi na ọ ga-egbochi ndị na-edebanyeghị aha ịtụ vootu inwe ikike tụọ vootu nakwa gbochie nrụrụaka na ntuliaka.”

Okoye kọwara na ụlọọrụ Inec ga-eme nwaale ngwa Bvas n’okpuruọchịchị abụọ na steeti niile dị na Naịjirịa n’ụbọchị nke anọ n’ọnwa Febụwarị.

Ademola Adeleke na Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Instagram

Cheta na e ji ngwa Bvas mee ntuliaka ọkwa gọvanọ n’Osun steeti n’afọ 2022. Nbinyeaka onyeisiala Muhammadu Buhari mere n’iwu ntuliaka ọhụrụ Naịjirịa bụ ‘Electoral Law 2022’ nyere Inec ikike iji Bvas na-emezi ntuliaka na Naịjirịa.

Adeleke gbara ama na ntụkwasị obi ọha nwere n’iwu ọhụrụ mgbe o nwetere mmeri na Jụlaị 2022, o zigaara onyeisiala Buhari ozi kwuo:

“A bụ m onye ritere oke uru n'iwu ntuliaka ọhụrụ ị bịanyere, dịka o nyeela ohere ka e gbochie aghụghọ na ntuliaka nakwa nrụrụaka ọbụla n’ime ntuliaka.”

Ademola Adeleke : 'Ana m aga Ụlọikpe Mkpegharị ịgbaha mkpebi ‘tribunal'

Ademola Adeleke

Ebe foto si, Ademola Adeleke

Aka na-achị Osun Steeti bụ Ademola Adeleke kwuru na ya anabataghị mkpebi nke Ụlọikpe pụrụiche maka ntuliaka nyere si ka ọ rituo n’ọkwa dịka Gọvanọ Osun Steeti.

N’ehihie ụbọchị Fraide, abalị 27 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023, Ụlọikpe pụrụiche maka ntuliaka kagburu mmeri Inec nyere Adeleke nke PDP ma nye Adegboyega Oyetola nke APC mmeri.

Mana Adeleke jụrụ mkpebi ahụ bụ nke ọ kpọrọ ‘ikpe akwụghị ọtọ.”

N’ozi o wepụtara nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Olawale Rasheed binyere aka, Adeleke kwuru na “mkpebi ahụ megidere ebumnoobi ndị turu vootu.”

Ọ gara n’ihu kpoo ndị Osun oku ka ha dere juu ma kwee nkwa inweta ikpemnkwụmọtọ n’ụlọikpe Mkpegharị. 

“Ana m akpọku ndị be anyị ka ha dere jụụ. Anyị ga-agbagha mkpebi ahụ . Anyị kwere na ikpenkwụmọtọ ga-adịrị. Ndị be anyị mata na anyị ga-eme ihe nile iji hụ na anyị iji ikike ọchịchị a ha nyere m.”

Kedụ ka okwu a siri malite?

Ademola Adeleke na Adegboyega Oyetola

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Adegboyega Oyetola

Ụlọikpe pụrụiche maka ntuliaka kagburu mmeri Ademola Adeleke nke PDP dịka Gọvanọ Osun steeti ma nye Adegboyega Oyetola nke APC mmeri ahụ.

Ngalaba na-ahazi ntuliaka kpọpụtaburu Adeleke dịka onye meriri na ntuliaka gọvanọ e mere na steeti ahụ n’abalị 16 nke ọnwa Julai afọ 2022.

Ademola Adeleke

Mana onye nọ n'isi Ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka bụ Jọstịs Tertsea Kume nọrọ n'Osogbo taa bụ Fraide abalị 27 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023 kwuo na,"usoro ntuliaka ahụ agachaghị ka iwu ntuliaka si kwuo".

Kume weere mmeri ahụ nye Oyetola ma nye Inec iwu ka ha nye Oyetola asambodo dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

Cheta na Oyetola onye bụbụ gọvanọ steeti ahụ jụrụ ịnabata mkpọpụta Inec kpọpụta Adeleke dịka onye meriri na ntuliaka ahụ, gara ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka ịgbagha ya.

Gboyega Oyetola

Ihe ụfọdụ kwuru maka mkpebi a

Gboyega Oyetola , Rotimi Akeredeolu, na Shehu Sani

Ebe foto si, Gboyega Oyetola/Rotimi Akeredeolu/Shehu Sani

Dịka akụkọ mpụtara ikpe a gbara n’ọha, echiche ndị mmadụ adapụtala n’ụzọ dị iche iche banyere ya.

Gọvanọ Ondo steeti bụ r Rotimi Akeredeolu so na ndị tinyere ọnụ n’okwu a dịka o kwuru na mmeri a bụ ihe uru nye ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa ma mepere ụkpụrụ ezi ọchịchị nakwa mkpesa n’okwu ntuliaka ụzọ ọma.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Onye bụbụ govanọ steeti ahụ bụ Gboyega Oyetola nakwa pati ya bụ APC zipụtara ozi kwuo:

“Obi dị m mma na mpụtara ikpe a ekpeziela okwu banyere onye nwetere mmeri na ntuliaka e mere n’ụbọchị 16 nke ọnwa Jụlaị na steeti anyị.”

“Mkpebi a bụ ezigbo ihe uru nye Inec dịka ọ ga-enye Inec ohere ileba anya na nsogbu ndị nwereike ịchere ha aka mgba ma hazie ya iji hụ na ọ meghị ọzọ na ntuliaka na-abịa abịa.”

Ọ gara n’ihu keele ọha na ndị nkwado ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Sịnetọ Shehu Sani zipụtara ozi ma kwuo:

“Mkpebi Osun Steeti a amaala ọkwa ọjọọ nye ọha banyere ntuliaka 2023. E jirila ụzọ ikpe dịka nsi bepụ mkpebi ọha ndị mmadụ isi.”

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3