Iwu 'Electoral Act' achụọla nrụrụaka ntuliaka ọsọ ụkwụ eru ala - Mike Ozekhome

Ndị ọrụ ngo Inec

Ebe foto si, Getty Images

Dịka mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti nke e mere n'ụbọchị 16, ọnwa Julaị, 2022 gbara n'ọha, ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ iwu ọhụrụ a kpọrọ 'Electoral Law 2022' mere ka mmeri a nwee isi.

Nke a bụ maka na Ademola Adeleke, onye meriri ntuliaka ahụ, bụ onye otu 'People's Democratic Party' bụ pati na-anọghị n'ọchịchị.

Chetakwa na Adegboyega Oyetola bụ gọvanọ Osun steeti sokwa zọọ ya bụ ntuliaka na pati 'All progressives Congress'.

Onye ọrụ Inec

Ebe foto si, Reuters

Akụkọ ndị ọzọ banyere iwu ntuliaka ọhụrụ Naịjirịa
Ademole Adeleke

Ebe foto si, Adeleke Ademola/Instagram

Nkọwa foto, Ademola Adeleke meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti e mere n'ụbọchị 16 nke ọnwa Jun.

Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ iwu ntuliaka ọhụrụ a nke onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'ụbọchị 22 nke ọnwa Mee, 2022, bụ ihe wụlitere ụdịrị ihe ịtụnanya a mere na ya bụ ntuliaka.

Buhari ezigaralarị Ademola Adeleke ozi ekele na mmeri ya ‘ụbochị Satọdee.

O kwuru na ya ga-ahapụ ụkpụrụ ziri ezi n’ụsọrọ ntuliaka Naịjirịa, bụ nke ọ rụrụ aka mụtaara Adeleke mmeri a pụrụiche.

Adeleke n'onwe ya n'ụbọchị Mọnde kwuru na aka Onyeisiala Buhari nọ na mmeri ya nke bụ na mbinye aka ya n'iwu 'Electoral Act' kpachịrị atụmatụ ndị mmadụ ime nrụrụaka nke ntuliaka n'Osun steeti.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ihe ndị ọkaiwu kwuru maka iwu 'Electoral Act' 2022

Otu onye ọkaiwu ma ihe ekwe n’akụ n’iwu Naijirịa aha ya bụ Mike Ozekhome gwara BBC Igbo na otu n’ime ihe mere ntuliaka nke Osun steeti a jiri gaa nke ọma bụ na o hibere isi n’ihe ndị nọ n’iwu ntuliaka ọhụrụ a.

N’okwu ya, ọ sị: “Iji teknụzụ were zigara Inec ọnụọgụgụ ntuliaka si ọgbọ ntuliaka ndị nọ n’Osun steeti bụ ihe tinyere aka hụ na e gbochiri nrụrụaka”.

Ozekhome kọwara na ebe nrụrụaka na-esi abanye na ntuliaka ọbụla bụ oge a na-ebugharị igbe vootu maọbụ n’oge e ji akwụkwọ edebanye aha ndị tụrụ vootu n’ọgbọ ntuliaka ọbụla.

O kwuru “Teknụzụ akpachiela ihe ndị a niile kpam kpam.”

O tokwara onyeisiala Buhari maka ibinye aka n’iwu a bụ nke ọ jụbụrụ ibinye aka na ya n’oge gara aga.

Onyeisiala Muhammadu Buhari na-ebinye aka n'iwu

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Facebook

Otu onye ọzọ bụ ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa, bụ Kunle Lawal gbara ama na ihe Ozekhome kwuru bụ eziokwu.

Lawal kwuru na iwu ọhụrụ a enyela ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjiịrịa nkwado pụrụịche.

N’okwu ya, ọ sị “Ụmụafọ Naịjirịa ga-enwezi ikike itinye maọbụ wepụ onye ha chọrọ n’ọchịchị site na n’usoro ntuliaka zuru oke ma kwụba aka ọtọ”

Lawal kwukwara na iwu a emeela ka oge ntuliaka ime ụlọ nakwa oge achụmnta vootu zuo oke n’ụzọ dị mma nke bụ na ọ na-enyezi ogologo oge maka ndị pati dị icheiche ịchụ nta vootu.

O kwuru na n'oge mbụ, oge achụmnta vootu anaghị ete aka, nke bụ na ndị mmadụ anaghị enwe ohere ịmatacha ndị ha ga-atụnyere vootu.

Onye na-atụ vootu n'oge ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images

Amended Electoral Bill: Gịnị nọ n'ime iwu ntuliaka ọhụrụ a?

  • Akụkụ ‘Clause 29 (1)’ nke iwu a kwuru na pati nwere ọnwa isii ịhọpụta ndị ga-azọrọ ọkwa ọchịchị site na ntuliaka ime ụlọ ha tupu e mee ntuliaka
  • Akụkụ ‘Clause 65’ kwuru na Inec nwereike ịnyogharị mpụtara ntuliaka nke e kwuru na e mere na mmanye
  • Akụkụ nke atọ n’iwu a kwuru na a ga-ewepụtariri ego a ga-eji eme ntuliaka otu afọ tupu e mee ya bụ ntuliaka
  • Akụkụ nke 51 kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị debanyere aha itu vootu ga-abụ otu ọkpụrụkpụ ihe n’ime mkpebi ma ikpe dapụta na mpụtara ntuliaka
  • Akụkụ 54 (2) nyere ohere pụrụiche maka ndị nwere ọrụsị
  • Akụkụ 47 nyere ohere ka e jiri akụrụngwa teknụzụ na-agụkọ vootu
  • Akụkọ 34 nyere naanị pati ikike ime ntuliaka ime ụlọ iji họpụta onye ọzọ ga-anọchịteanya ha na ntuliaka ma onye mbụ ha họpụtara nwụọ
  • Akụkụ 47 a nyere Inec ikike nke gbadoro ụkwụ n’iwu Naịjirịa iji akụrụngwa teknụzụ were ziga ọnụ ọgụgụ vootu site n’ọgbọ ntuliaka
  • Akụkụ 94 nyere ohere ka oge achụmnta vootu malite n’ọnwa ise tupu ụbọchị ntuilaka ma bie n’abalị ga-efo chi ya bụ ụbọchị ntuliaka
  • Akụkụ 84 kwuru na onye ọbụla ji ọkwa ọchịchị n’aka nwere mmasị ịzọ ọkwa ọzọ ga-arịturiri n’ọkwa tupu ọ nwee ike ịga n’ihu na mmasị ya (nke a metụtara ndị minista, ndị kọmịshọna, ndị ndụmọdụ pụrụiche nye ndị ọchịchị wdgz).

Kedụ ihe ndị mmadụ na-ekwu maka iwu a?

Ọtụtụ ozi otito na-abịara onyeisiala Buhari maka ibinye aka n’iwu a, ebe ụfọdụ na-akatọọ ya na ọ ma ụma hapụ ibinye aka na ya bụ iwu n’afọ 2019 mgbe ọ na-azọ ọkwa ọchịchị onyeisiala Naịjirịa n’agba nke abụọ ya.

Lee ihe nọ na soshal midia na-ekwu.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Skip X post, 5

End of X post, 5

Skip X post, 6

End of X post, 6