Inec certificate of return: Ademola Adeleke anatala asambodo irigo n'ọkwa gọvanọ Osun

Ebe foto si, BBC
Ụlọọrụ Independent national electoral commission (INEC) enyela Ademola Adeleke meriri ọkwa gọvanọ n'Osun steeti asambodo nyere ya ikike ịnọdụ n'ọkwa ahụ.
Osote ya bụ Kola Adewusi natakwara asambodo nke ya.
N'otu mkparịtaụka Ademola na ụlọọrụ Channles tv nwere na nso nso a, Adeleke kwuru na gọvanọ Adegboyega Oyetola akpọbeghị ya kelee ya dịka ọ ka na-eche ịza ekwenti ya.
Mana onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onyeisi APC Oyetola nọ akpọla Adeleke ma kelee ya.
Ihe gọvanọ chiburu Osun steeti na-eme iji ma mpụtara ntuliaka gọvanọ aka
Govnor Gboyega Oyetola nke Osun steeti na-akwado ịpụ n'oche adịla njikere ịma mpụtara ntụliaka gọvanọ a ka mechapụrụ na steeti ahụ nke Ademola Adeleke meriri.
Kunle Adegoke, bụ ọkaiwu Senior Advocate of Nigeria (SAN) kwupụtara na gọvanọ Gboyega Oyetola gwara ya na ndị ọkaiwu ruru iri ise egosila mmasị ha ịma mmeri Senator Ademola Adeleke aka n'ụlọikpe ntụliaka.
Adegoke kwuru na na ha kpụga mpụtara ntuliaka ahụ ụlọikpe maka ọtụtụ mkpesa gbasara nrụrụaka na ya bụ ntụliaka.
O na-ekwusi ike na ha na-eche na ndị na-akwado PDP mere nrụrụaka na ntụliaka mere na July 16 , 2022.
Adeleke ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party (PDP) meriri Oyetola na ndị ọzọ so zọọ ọkwa ahụ na ntụliaka gọvanọ steeti ahụ mere na Julai 16, 2022.
Nke a na-abịa dịka ụlọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) nyere ya asambodo ịbụ gọvanọ taa bụ Jụlai 20, 2022.
Adeleke ji vootu ruru 403,371 wee merie Oyetola nke APC nwetere vootu 375, 027.
Etu Ademola Adeleke si bụrụ gọvanọ Osun steeti

Ebe foto si, Twitter/Ademola Adeleke
Ụlọọrụ Inec akpọpụtala aha Ademola Jackson Adeleke nke PDP dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti.
O nwetara ngụkọta vootu 403, 371 iji merie Adegboyega Oyetola nke APC nwetara 375, 027.
Lee etu o si merie ebe a:
A na-eme vote buying na ntuliaka Osun steeti?

Ka ọ dị ugbua, amalitela ịgụ vootu na-ebe ụfọdụ na ntuliala ndị Gọvanọ n'Osun steeti.
Ebe BBC hụrụ ihe dị otu ahụ ugbụa bụ na Ward 1, Unit2,Ibosini, Ilesha nakwa Ward 8, Unit 4,Odo/Esira, Ilesha,
A tụchaala vootu na atụmvootu na-aga n'ihu n'Osun steeti maka ihọpụta ndị ọchichị steeti ahụ.
Inec kwuburu na-atụmvootu ga-amalite mgbe o ji ọkara gafee elekere atọ nke ụtụtụ, mechie ma o jiri ọkara gaa elekere abụọ nke ehihie.
Mana ha kwuru na onye ọbụla nọ n'ahịrị mgbe ahụ ga-atụrịrị vootu.

Ka nke a na-eme, kepukepu maka ịzụ vootu ka na-aga n'ihu na steeti ahụ ebe ndị ọrụ anyị na-ekwu na ya bụ akaazụ kpụ ọkụ n'ọnụ ebe ahụ.
Ha kwuru n'Olorunda ward 8 unit 21 na ndị mmadụ ndị mmadụ na-ana ihe dịka N5000 ruo N10,000 maka ịre vootu ha.

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ebe ndị mmadụ gakwuuru mmadụ abụọ kwu n'akụkụ sị ha, "anyị emeela ịhe ịchọrọ, kwụọ anyị ụkwọ anyị".
Otu nwoke na-anọchite anya otu pati na-achọghị ka akpọọ aha ya sị na "oteelarị ha malitere ịre nakwa ịzụ vootu kemgbe ụtụtụ.
Otu ihe ahụ na-akpọtụ na Ilesha ebe otu onye gwara BBC na a kwuru ya naịra puku isii (N6000) maka vootu ya.
N'agbanyeghị, ndị mmadụ siri ọnwụ buru mmiri na-ezo kwuru ka ha hụ na ha tụrụ vootu ha.

Igobi vootu nke ndị Bekee kpọrọ 'vote buying' bụ otu ụzọ a na-ejikarị eme mpụ na ntuliaka na Naịjiria.
Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe a gbakọrọ ịtụ vootu n'Osun steeti nụrụ ebe otu nwaanyị na-akpọ ndị mmadụ n'ekwentị ka ha bịa tụọ vootu na "ego dị ebe a".
Ka o rutere na Unit 14 wọọdụ 4, Ataoja D dị n'Oshogbo, ọ hụkwara ebe ụfọdụ ndị nnọchiteanya ndị pati kwụ na-achọ ndị ha ga-agwa ka ha tụnyere ha.
Otu nwaanyị na-achọghị ka a kpọọ ya aha bịakwutere onye ntaakụkọ BBC gwa ya ka o nyere ya aka chụpụrụ ya ndị pati ahụ n'akụkụ ebe ha na-atụ vootu.
N'olu ya "Ndị pati a na-enye ndị mmadụ nsogbu na-amanye ha ka ha tụnyere ha. Ụfọdụ dị ka ndị merela okenye nwere ike jiri ụjọ na-atụnyere ndị a sị ha tụnyere, mana anyị bụ ndị ntorobịa na-atụnyere onye anyị bu n'obi."
Mgbe onye BBC gakwuru ndị uweojii nọ ebe ahụ ịgwa ha maka mkpesa a e kpesaara ya, ha gwara ya na nke a karịrị oke ha ga-emeli, n'ihi na e nwere "ụmụokorobịa ọjọọ" na-agbakọ n'akụkụ ha.
Ebe adọkara igbe e ji tụ vootu na Kajola, Atakumosa West LGA, Osun steeti.

Ka nke na-eme, a kuriela otu igbe e ji atụ vootu na unit 11, ward 7 dị na Kajola, nke dị n'okpuruọchịchị Atakumosa, Osun steeti.
Akụkọ kwuru na ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ bịara tiwe ndị mmadụ ihe ebe ahụ.
Ndị nọ ebe ya bụ ihe mere sị na ndị oji egbe ahụ bịara tiwe ndị ahụ ihe aghara aghara na-ekwughị ihe ha mere.
"anyị maghị ebe ha kpụ ha awa".

ihe a mere ndị mmadụ na ndị ọrụ pati malite irụụka nke mere ọgụ jiri daa ebe ahụ, ha jiri dọsa igbe vootu.
Ha tiri onye uweojii nọ ebe ahụ bịara igbo ọgụ ihe.
"Nke a mere onye uweojii ahụ jiri kpọọ ibe ha", ka o kwuru.
Onyeisi Inec streeti ahụ bụ Abdulganiyu Raji agaala ebe ahụ iji anya hụ ihe mere.
Gọvanọ Osun steetị bụ Gboyega Oyetola atụwala vootu ya

Gboyega Oyetola bu gọvanọ Osun steeti atụọla vootu n'ọgbọ nta ya dị n'Iragbiji ebe ọtụtụ mmadụ malitere ịtụ vootu kemgbe elekere asatọ nke ụtụtụ taa.
Ya na oriakụ ya so bịa tụọ ya bụ vootu.
Lee mgbe Ademola Adeleke nke PDP pụtara ịtụ vootu

Ademola Adeleke bụ onye ji ọkọlọtọ pati People's Democratic Party (PDP) azọ ọkwa gọvanọ Osun steeti apụtala tụọ vootu nke ya.

Nke a bụ nke ugboro abụọ Adeleke a ma dịka 'Imole de' na-azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ.
Etu ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti si aga
Ndị mmadụ apụtala n'ọgbọ ntuliaka n'Osun steeti ebe ha ga-atụnyere onye ga-achị ha dịka gọvanọ n'afọ anọ na-abịa.

Ndị gụnyere ndị nwere nkwarụ so pụta n'ọgbọ kemgbe ebe elekere asaa nke ụtụtụ Satọde, Julaị 16, 2022.

Ndị mmadụ pụtara na-achọ aha ha na wọọdụ dị iche iche dịka ha na-akwado ịtụ ya bụ ntuliaka.

Ndị ọrụ ngo Independent National Electoral Commission (Inec) pụtara n'oge n'ụfọdụ wọọdụ ma dịrị njikere ịrụ ọrụ e ji maka ya kpọọ ha oku.


Akụkọ ka na-abịa•









