Ugo eberela na mgbagbu n'Osun maka ntuliaka ọkwa gọvanọ

Dika ntuliaka ọkwa Govanọ Osun steeti fọrọ naanị otu abalị, ebe niile na-ede jim jim na steeti ahụ dịka egbe na ugo, oke na ngwere na-eme nkwado ikpeazụ ịkọ n'ubi onye a bịara ọrụ na nke ya.
Na Satode, abalị 16 nke ọnwa Julaị afọ 2022, ndị Osun steeti ga-eme ntuliaka ịhọrọ onye ga-abụ gọvanọ ha n'ime pati 15 Inec kwuru tozuru ịzọ ọkwa ahụ.
Dịka ngalaba ahụ na-ahazi ntuliaka si kwuo, mmadụ 1,955,657 debanyere aha ha n'akwụkwọ maka ntuliaka na steeti ahụ ga-atụ vootu n'ọgbọ atụm vootu 3,763 dị na steeti ahụ ụbọchị ahụ.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gagharịrị n' Osogbo ụbọchị Tozde kwuru na ahịa na okporoụzọ nile na-ekwo ka ebe a na-eme agụgụ dịka ndị mmadụ na-azụ ahịa ihe ha ga-eri ụbochi Satode nakwa ụbọchị ụka.
Nke a bụ maka na ndị uweojii mara ọkwa na agaghị enwe mkpagharị malite n'etiti abali Fraide ruo elekere isii nke mgbede Satode bụ ụbọchi ntuliaka.

Ebe foto si, PDP/Facebook
Kedụ ndị na-asọkọ mpi na ntuliaka a?

Dịka Inec si kwuo, pati 15 ga-azọ ọkwa Gọvanọ Osun steeti na ntuliaka Satode.
Ha gụnyere: Gboyega Oyetola nke APC, bụ gọvanọ nọ n'ọchịchị ugbua ma na-azọ ọkwa nke ugboroabụọ ya; Ademola Adeleke nke PDP (nwanne nna otiegwu David Adeleke a ma ama dịka Davido; Yusuf Sulaimon Lasun nke Labour Party; Akinbade Ogunbiyi nke Accord Party; Peter Segun Awojide nke AAC; Kehinde Munirudeen Atanda nke ADP na Awoyemi Oluwatayo Lukuman nke APM.
The ọzọ bụ Adebayo Adeolu Elisha nke APP; Rasaq Oyelami Saliu nke NNPP; Samuel Adetona Abede nke NRM; Busuyi Ayowole nke PRP; Akinrinola Oyegoke Omigbodun nke SDP; Ademola Bayonle Adeseye nke YPP na John Olufemi Adesuyi nke ZLP.

Ebe foto si, Zazuu/Facebook
N' agbanyeghị na ọ bụ mmadụ 15 na-asọ mpi a, otu onye ntaakụkọ achọghị ka a kpọ aha ya n'ihi na o nwere ike itinye ya na nsogbu, gwara BBC Igbo na ya bụ ntuliaka bụ ọgụ dị n'etiti naanị mmadụ abụọ: Oyetola nke APC na Adeleke nke PDP.
Pati abụo a - APC na PDP - mere achụmnta vootu pụrụ ọkụ iji gbaa mbọ ikpeazụ ịdọta ndị ga-atụrụ ha vootu na ntuliaka a.
Mgbe onye ntaakkụọ anyị kpagharịrị n'Osogbo, isi obodo Osun steeti, ọ chọpụtara na naanị akwụkwọ mgbasaozi achụm nta vootu, nke Bekee kpọrọ 'posters' na 'billboard' nke gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Oyetola, bụ ihe a hụrụ n'okporoụzọ a ma ama na steeti ahụ.
A hụghị nke ndị pati ọzọ na-anọghi na gọọmentị karịa n'ụlọọrụ pati ha.
Otu onye ntaakụkọ bi n'Osogbo achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị agboro mebichara akwụkwọ mgbasaozi achụmnta vootu ndị pati ndị ọzọ.
Inec, ndị uweojii ji amụma, jiri mmiri

Ndị ọrụ Inec, ndị ọrụ nchekwa, ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye, ndị akaebe na ndị ntaakụkọ karịkwara akarị n'Osun steeti ugbua.
Iji kọwa ka ha si kwado, Inec na ndị uweojii kwuru na ha ji amụma jiri mmiri, nke onye chọro, e nye ya.
Onyeisi Inec na Osun State bụ Ọkammuta Ganiyu Raji gbaara BBC Igbo ama ụbọchi Tọzde na ha adịla njikere ma kesaa akụrụngwa a ga-eji mee ntuliaka.
Raji kwuru na Inec ga-enyefe ndị ọbụla zụrụ vootu maọbụ megide iwu ntuliaka n'aka ndị uweojii.
O kwukwara na Inec agbala mbọ ifachisi ebe mmiri siri banye opi ụgbọguru oge ntuliaka gọvanọ steeti ahụ n'afọ 2018 bụ nke akapịghị ọnụ Bekee kpọrọ "inconclusive".

N'otu aka ahụ, Osote Onyeisi uweojii nke mpaghara South West, bụ DIG Johnson Kokumo kwụkwara na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa jikọrọ aka ị hụ na udo chiri n'oge ntuliaka.
O kwuru na ndị ọrụ ya ga-ewepụtara ndị omekome ga-achọ ibute ọgbaghara na oge ntuliaka anya.
N'otu aka ahụ ndị Igbo bi n'Osun steeti kwuru na ha agaghị anọ na mmiri, ncha a na-aba ha anya.

Onyeisi Ohaneze Ndigbo na steeti ahụ bụ Pst John Dike gwara BBC Igbo na ndi ịgbo nile rurula afọ 18 dị njikere ịpụta n'igwe tụọ vootu ụbọchị Satode.
Dịka Dike siri kwuo, ihe Igbo na-atụ anya n'aka onye ga-abanye n'ọkwa gọvanọ bụ nkwado azumahịa nakwa inye ha oke dịịrị ha dịka ụmụ amaala, hapụ ịkpachapụ ka n'akụkụ.









