Biodun Oyebanji nke APC emeriela ntuliaka gọvanọ n'Ekiti Steeti

Biodun Oyebanji

Ebe foto si, Biodun Oyebanji

Inec akpọpụtala aha Biodun Oyebanji, nọ na pati 'All Progressives Congress' dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Ekiti steeti n'ụbọchị Satọde.

Oyebanji nwetara vootu ọnụọgụgụ ya dị 187,057 iji turu ugo na ya bụ ntuliaka.

Onye gbara onye nke abụọ na ntuliaka a bụ Mazi Segu Oni nke 'Social Democratic Party (SDP), onye nwetara vootu 82,211.

Bisi Kolawole nke Peoples Democratic Party (PDP) gbara onye nke atọ dịka o nwetara vootu 67,457.

Ekiti steeti nwere okpuru ọchịchị iri na isii, mana Oyebanji meriri ntuliaka n'okpuru ọchịchị iri na ise n'ime ha.

Lee nchịkọta ihe niile mere na ntuliaka a

Ndị ntaakụkọ na-eche mpụtara ntuliaka ahụ
  • Ndị mmadụ pụtara itu vootu na ntuliaka ọkwa Gọvanọ emere n'Ekiti steeti
  • Igwe mmadụ pụtara tụọ vootu n'enweghi nsogbu ọbụla
  • Ha tụchara vootu jụ ịlaghachi na bee ha ma nọdụ ana na-eche ngụkọ vootu
  • Ngụkọ malitere ihe dịka ebe elekere atọ nke mgbede
  • Ndị mmadụ nọ n'isi ụlọorụ dịka a na-echezi mkpọpụta mpụtara ikpeazụ nke ntuliaka ahụ
  • Ndị uweojii nwụchiri mmadụ anọ ha sị nwara ịkpasa ntuliaka e mere taa ma na-enyocha ha
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

A malitela ngụkọ vootu n'ụfọdụ 'polling unit'

Ebe Ngụkọ vootu maliterela n'Ekiti steeti.

Ngụkọ vootu ebidola dịka emechara ntulika ọkwa Gọvanọ n'Ekiti steeti n'ọtụtụ polling unit n'ebe ahụ.

BBC hụrụ ebe a na-akpọpụta mpụtara n'otu ebe bụ 'Dallimore street'.

Site n'ihe a na-akpọpụta, ọ dịka otu APC a na-emeri mana INEC akpọpụtabeghi ezi mpụtara ya.

Cheta na ndị mmadụ tụchara vootu ha jụ ịla be haa ma nọrọ ala na-eche mgbe ngụkọ ga-amalite iji chekwa vootu ha.

Ndị mmadụ na-eche mpụtara vootu ha tụrụ

Ebe a tụcharala vootu

A tụchaala vootu n'ụfọdụ 'polling unit' dị n'Ekiti dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo si chọpụta.

Na polling unit dị na gburugburu Okosa, ọtụtụ ndị tụrụ vootu ka nọ na-eche ka a gakọọ vootu ha ọnụ

Otu onye bụ Ogbonnaya Isaac sị "Aga m eche mara ma ọ bụ pati m tụụrụ vootu ga-emeri n'ebe a."

Kepukepu ọzọ onye ntaakụkọ BBC Igbo nụrụ bụ na o nwere ndị na-enye ego iji zụrụ vootu ndị mmadụ.

Ọ sị na ọgbaghara dapụtara n'ebe a kpọrọ 'bank road' mgbe otu nwokorọbịa setere ndị na-azụ vootu foto nke mere ha jiri chụwa ya ọsọ.

Nwokorọbịa ahụ gbabara n'aka ndị nchekwa mana ha mechara tọhapụ ya.

Ndị nọ n'Okesa 'polling unit'
Akụkọ ndị ọzọ gbasara Ekiti Steetị
Ụfọdụ ndị mmadụ na-eche ka a gụkọọ vootu ha
Ndị ọrụ Inec

Ndị steeti Ekiti apụtara n'igwe ma malite ibinye aka n'akwụkwọ ntuliaka iji họpụta Gọvanọ ga-achị ha ruo afọ anọ ọzọ.

Ụfọdụ ebe ndị a onye ntaakụkọ BBC Igbo gara dịka 'polling Unit ndị dị n'Ado Ekiti, ndị mmadụ na-enyocha aha ha.

Ebe ndị ọrụ Inec buputara ngwaọrụ ha ma tụziere ndị mmadụ aka etu ha ga-esi binyeaka.

Ihe ndị Igbo bi n'Ekiti kwuru maka ntuliaka a

Aha onyonyo, Ekiti Governorship Election: Ihe mere anyị ga-eji pụta n'igwe tụọ vootu n'Ekiti Steeti
Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Ndị ọrụ Inec na ndị bịara ịtụ vootu
Ndị na-achọ aha ha n'ebe ha ga-atụ vootu

Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara kwụrụ chịm n’ogige ‘polling unit’ bụ ebe ha ga-ebinyeka.

N’ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ, ụfọdụ ndị ọrụ Inec a kpọrọ ‘adhoc staff’ apụtala n’ogige ndị a na-akwado maka ntuliaka.

Ụlọorụ Inec adịla mbụ kesaa ngwa ọrụ ndị e ji eme ntuliaka gawa n’okpuruọchịchị dị iche iche.

Ndị pụtara ịtụ vootu
Ndị bịara ịtụ vootu
Ndị ọrụ dị icheiche adịla njikere maka ntuliaka a
Nkọwa foto, Ndị ọrụ dị icheiche adịla njikere maka ntuliaka a

Taa bụ Satọde, abalị iri na asatọ nke ọnwa Jun 2022, ka ndị Ekiti Steeti ga-ahọpụta Gọvanọ ọhụrụ ga-achị ha ruo afọ anọ ọzọ.

Ngalaba nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) ekwuola na ha dị njikere maka ya bụ ntuliaka.

BBC Igbo kwụ chịm n'Ekiti Steeti iwetara gị etu ya bụ ntuliaka si aga.

Inec ekesachaala akụrụngwa niile dị mkpa maka ntuliaka a, ọtụtụ n'ime ndị ọrụ ha anọrọkwala n'ebe dị icheiche e zigara ha.

Ntulaiaka ga-amalite kpọmkwem n'elekere asatọ nke ụtụ.

N'aka nke ọzọ, ndị ọrụ nchekwa ekeela ajị n'ume ma jikere maka ntuliaka a.

Ọkpụrụkpụ ihe dị mkpa gbasara ntuliaka a

Ndị uweojii
Nkọwa foto, Ndị uweojii ga-arụ ọrụ na ntuliaka a dị 17,374 n'ọnụọgụgụ
  • Ekiti steeti nwere okpuru ọchịchị iri na isii, nakwa 'ward' dị otu narị na iri asaa na asaa (177).
  • Ndị debara aha n'akwụkwọ ịtụ vootu dị 989,202.
  • Ndị werela akwụkwọ ikike ịtụ vootu (Permanent Voters Card) dị 749,065.
  • Ebe a na-atụ vootu (Polling unit) dị 2,455
  • Ha dị pati iri na isii so azọ ọkwa Gọvanọ n'Ekiti Steeti
  • Ndị uweojii ga-arụ ọrụ na ntuliaka a dị 17,374 n'ọnụọgụgụ
  • Ndị agha, ndị 'civi defence', nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-eso rụọ ọrụ na ntuliaka a