Ekiti Decides 2022: Ngwaọrụ Inec erutela ndị ọrụ ha aka

Ngwaọrụ Inec ji eme ntuliaka

Ọtụtụ ndị mmadụ agbakọọla n'ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) dị n'isiobodo Ado Ekiti, ebe ha bịara iburu ngwaọrụ ha ga-eji arụ ọrụ ntuliaka n'ụbọchị Satọde, 18 nke ọnwa Juun.

Ndị ọrụ ngo ga-eso arụkwa ya bụ ọrụ gbakọtakwara ịchọ aha ha n'ebe e depụtara ya mado n'ahụ aja, iji mara wọọdụ ebe ha ga-anọ arụ ya bụ ọrụ.

Ndị ga-arụ ọrụ ntuliaka
Ndị ga-arụ ọrụ ntuliaka n'Ekiti

Etu Inec si akwado maka ntuliaka n'Ekiti steeti

Inec na-akwado ntuliaka n'Ekiti steeti

Ụlọọrụ Inec amalitela ibuga akụrụngwa e ji atụ vootu n'okpuruọchịchị iri na isii dị n'Ekiti steeti, dịka ha na-akwado ịtụ vootu e ji ahọpụta onye ga-abụ gọvanọ ọhụrụ steetị ahụ.

Kemgbe ụnyaahụ, 16 nke ọnwa Juun afọ 2022, ka Inec malitere njem ịsi Ado-Ekiti bụ isiobodo steeti ahụ buga akụrụngwa ndị ahụ n'okpuruọchịchị steeti ahụ niile.

Inec na-akwado ntuliaka n'Ekiti steeti

Ugbua, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-akpagharị n'ime ogbe isiobodo ahụ iji gosi ike ha.

Inec na-akwodo ntuliaka n'Ekiti steeti

N'ụbọchị Satode, abalị 18 nke ọnwa Juun afọ 2022 ka ndị Ekiti steeti ga-eji vootu ha kpebie onye ga-achị ha n'afọ anọ na-abịa.

Mmadụ 749,065 bụ ndị nwetarala ikike ịtụ vootu (PVC) ga-anọ n'ọgbọ vootu dị 22,244 họrọ otu onye n'ime mmadụ 16 na-azọ ọkwa ọchịchị steeti ahụ e ji ndị gụwara isi n'akwụkwọ mara.

Ndị ga-azọ ọkwa a gụnyere Abiodun Abayomi nke APC, Olabisi Kolawole nke PDP, Daramola Roland Olugbenga nke Labour Party, Benjamin Olufemi Obidoyin nke APGA, Adebowale Oluranti nke YPP na Olusegun Adebayo Oni nke SDP.

Ndị ọzọ bụ : Adeolu Akinyemi nke Zenith Lapour party, Agboola Olaniyi Ben, Iyaniwura Tope Iefedayo nke NRM, Fatomilola Oladosu nke NNPP, Fagbemi Peter Adegbenro nke APM, Ajagungbale Moses Olajide na Reuben Boye Famuyibo nke otu Accord Party, ebe ụmụnwaanyị abụọ so n'egwu ndị kara obi ahụ bụ Josephine Kemi Elebute-Halle nke ADP na Christiana Modupe Olatawura nke APP.

Ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Ekiti Steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye meriri n'ime ndị a ga-anara ọfọ ọchịchị n'aka na-achi gọvanọ steeti ahu bụ Ọkammụta Kayode Fayemi bụ onye ga-anọzu afọ anọ ya nke bu agba nke abụọ ya dịka gọvanọ steeti ahụ. Fayemi chịburu agba nke mbụ ya malite n'afọ 2010 rue 2014,tupu a napụ ya oche n'otele mana ọ lọghachiri zọọ ọkwa gọvano ọzọ n'afọ 2018.

Ka ọ dị ugbua, ebe nile n'Ado Ekiti, isiobodo steeti ahụ na-azụ ka ahịa. Obi na-atọ ndị ọkwọugbọala na ndị na-azụ ahịa rịkpọọ dịka ka ha na-agba aka ahịa.

Otụ onye ọkwọụgbọala nyere aha ya dịka Jim Chinedu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo gara Ekiti maka ntuliaka,na ụzọ na ọhịa gara Ekiti na-ekwo dịka ọtụtụ ndị mmadụ gunyere; ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ nchekwa, ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ akaebe nke Bekee kpọrọ 'election observers' na-awụbata kemgbe abalị atọ gara aga maka ntuliaka.

Ndị ọrụ nchekwa na-edo dịka ido dịka onyeisi ndị uweojii bụ Usman Baba zitere ndị uweojii 17,374 maka ntuliaka a.

Ọtụ onye ntaakụkọ achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na "ọtụtụ ụlọ nkwụsị ndị njem dị n'etiti ejula, ndị mmadụ na-agazị n'ime ime achọ ebe ha ga-ehi."

Gịnị mere uche ndị mmadụ jiri dị n'Ekiti?

Mgbe e mere nkwekọrịta udo n'etiti ndị na-azọ ọkwa

Ntuliaka Ekiti afọ 2022 bụ ọpụrụiche n' ọtụtụ ụzọ nke gunyere;

Nke mbụ, nke a bụ ntuliaka mbụ a ga-anwalee ma tinye n'ọrụ kemgbe iwu Ntuliaka ọhụrụ nke Naijiria a kpọrọ 'Electoral Amendment Act" jiri dị ire.Ndị ọnu na-eru n'okwu na ntuliaka aka si kọwaa, Ntuliaka Ekiti ga-arụtụ etu ntuliaka Onyeisiala ga-adị na 2023.

 Iji maa atụ: Nke a bụ mbụ a ga-eji igwe BVAS were mee ntulikaa. Ndị ọkacha mara n'okwu ndọrọndọro ọchịchị na-ekwu na atụmatụ BVAS ga-eme ka wuruwuru belata.

Ọzọ,ntuliaka na Ekiti na-abụkarị n'etiti pati abụọ kacha nwe agba na Naijiria bụ APC na PDP bụ ndị na-em onye chịịa onye ibe ya na steeti ahụ mana ugbua,egwu adagharịala.

Ndị ndọrondọrọ ọchịchị Ekiti steeti dọrọ anya na-arụ aka na ntuliaka ga-abụ ọgụ dimkpa anọ n'etiti APC, PDP, SDP na Labour Party.

 Aka chụburu steeti ahụ site n'afọ 2007 rue 2010 bụ Olusegun Oni enwetaghị ikike ịzọ n'aha PDP mafee SDP ebe ikike ime nke a n'aha. Otu onye ụlọmeiwu Nta bụ Leke Abejide kwuru na otu n'ime ihe ga-apụta ihe na ntuliaka nile a ga-eme malite ugbua bụ na ndị a ma ama pati ha jụrụ inye ikike ịzọ ọkwa ji iwe gaa obere pati, ga enweta mmeri.

N'otu aka ahụ, otu Labour pati malitere ikulite na steeti dị iche iche kemgbe Peter Obi banyere pati hụ ma nweta ọkọlọto ịzọ ọkwa onyeisiala.

Ebee ka Inec kwụ na ntuliaka Ekiti steeti?

Dịka pati dị iche iche na-agba egwu ha mụrụ iji hụ na ha meriri na ntuliaka, Inec ekwuola na ọ bụ ndị Ekiti ga-ekwu onye ga-achị ha.

Onyeisi I nec bụ Ọkammuta. Mahmood Yakubu, kwuru na ọgbako ndị e ji okwu ha agba izu na ihe gbasara ndọrọndọrọ na " Inec agaghị eme ihe ọbụla iji dọnyere otu pati maọbụ megbuo pati ọzọ, mkpa anyị bụ ịhazi etu e me ntuliaka dịka ọ dị n'iwu".

Ihe mere oge ntuliaka Ekiti jiri dị iche na nke steetị ndị ọzọ na Naijiria

Cheta na n'afọ 2019, Ụlọikpe Mkpegharị kagburu mmeri Segun Oni nke PDP oge ahụ meriri Kayode Fayemi dịka ọ nọchara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ abụọ(ọnwa 41).

Inec mere ntuliaka mmeju nke nyere Fayemi nke APC ohere ịlọghachi n'ọkwa gọvanọ n'afọ 2010.

Ndị na-azọ ọkwa