Ekiti Governorship Election 2022: Eserese etu okwe si gbaa

Mpụtara ntuliaka ime ọkwa Gọvanọ Ekiti Steetị

Ntuliaka ọkwa gọvanọ Ekiti Steetị ezoola ka mmiri ma gbachaa.

Okwa ya bụ ntuliaka agbakwaala; ọ bụ ndị Biodun Oyebanji nke APC tuuru ugo.

Oyebanji ga-abụ gọvanọ nke asatọ n'Ekiti steetị kamgbe Naịjirịa nwereonwe ha n'aka Briten n'afọ 1960.

Lee eserese gosiri mmadụ anọ bụ isi sekpụ ntị na ntuliaka ahụ:

Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka Ekiti

  • Ọrụ aka: Onye ọrụ gọọmentị
  • Afọ: Afọ 55
  • Biodun Abayomi Oyebanji bụ onye Ikogosi-Ekiti n'Ekiti.
  • Ọ bụbụ onye ndụmọdụ n'okwu (ihe gbasara ụlọomeiwu) nke gọvanọ Ekiti steeti malite abalị 8 ọnwa Juun afọ 1999-2000 na abalị 1 ọnwa Ọgọstụ rue ọnwa Sepụtemba afọ 2001.
  • Ọ bụbụ onye na-achịkọta ndị ọrụ gọvanọ Ekiti malite ọnwa Sepụtemba afọ 2001 rue abalị 29 ọnwa Mee, afọ 2003.
  • Oyebanji bụbu kọmịshọna, mịnịstrị bọjetị na nhazi akụnaụba n'Ekiti Steeti malite10 Jenụwarị, afọ 2013 rue abalị 16 ọnwa Oktoba afọ 2014, nakwa odeakwụkwọ gọọmentị Ekiti steeti malite n'abalị 16th ọnwa Oktoba afọ 2018 rue abalị 7 ọnwa Disemba afọ 2021.
  • Ọrụaka: Onye ọrụ gọọmentị
  • Afọ: 64
  • Kolawole bụbụ onyeisi pati PDP n'Ekiti Steeti tupu ọ gbaa arụkwaghị m n'ọnwa Sepụtemba afọ 2021 ka ọ zọọ ọnwa gọvanọ.
  • Mgbe Gọvanọ Ayo Fayose nọ n'ọchcịchị, ọ rụrụ ọrụ ka kọmịshọna gburugburu malite afọ 2015 rue afọ 2018.
  • Ọ nọchitere mpaghara ọchịchị Efon n'ụlọomeiwu steet malite n'afọ 2007 nakwa na 2011.
  • Ọ bụ onye obodo Efon Alaaye dị n'ime Ekiti steeti. .
  • Akaọrụ: Aka chịburu Ekiti
  • Afọ: 67
  • Olusegun Oni chịburu Ekiti malite na Mee 29, 2007 rue Oktoba 14, 2010.
  • Na ndọrọndọrọ Ekiti, Oni so na ndị malitere pati Unite Nigeria Congress Party (UNCP) ebe o bụ onye isi ruru ala nye pati ahụ.
  • N'afọ 2014, ọ pụrụ na PDP banye pati na-anọghị n'ọchịchị oge ahụ bụ All Progressive Congress, APC. N'afọ 2019, ndị APC wọọdụ nke abụ na Ifaki-Ekiti , n'okpuruọchịchị Ido/Osi kwụsịrị ya iso ha maka ebubo na ọ na-akpa agwa megidere pati ha mana o mechara hapụ APC banye na PDP. N'ọnwa Febuwarị afọ 2022, Ọ hapụrụ PDP gaa SDP dịka ọ dara ntuliaka imeụlọ ha.
  • Akaọrụ: Onye ọrụ gọọmenti
  • Afọ: 62
  • Adebowale Ranti Ajayi bụ onye Emure Ekiti na mpaghara ọchịchị ọdịda anyanwụ steeti ahụ.
  • Ya bụ kọmịshọna mbụ nke bọjetị na nhazi akụnaụba mana tupu nke ahụ, ọ rụrụ dịka kọmịshọna na-ahụ maka azụmahịa na mkpata ego na gọọmentị Kayode Fayemi.
  • Ọ nọbụ na pati APC tupu ọ banye YPP ma merie ịzọrọ ha ọkwa gọvanọ.

Ndị so zọọ ntuliaka a gụnyere: Abiodun Abayomi nke APC, Olabisi Kolawole nke PDP, Daramola Roland Olugbenga nke Labour Party, Benjamin Olufemi Obidoyin nke APGA, Adebowale Oluranti nke YPP na Olusegun Adebayo Oni nke SDP.

Ndị ọzọ bụ: Adeolu Akinyemi nke Zenith Lapour party, Agboola Olaniyi Ben, Iyaniwura Tope Iefedayo nke NRM, Fatomilola Oladosu nke NNPP, Fagbemi Peter Adegbenro nke APM, Ajagungbale Moses Olajide na Reuben Boye Famuyibo nke otu Accord Party.

Ụmụnwaanyị abụọ so na-azọ ọkwa bụ Josephine Kemi Elebute-Halle nke ADP na Christiana Modupe Olatawura nke APP.

Lee esere gosiri ebe niile a nọrọ tụọ vootu na ntuliaka a:

Ị ga-enwerịrị brawụza ọgbara ọhụrụ nwere JavaScript iji lee ihe a.

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ Ekiti steeti 2022

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ Ekiti steeti 2022