Osun governorship election: Lee ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Osun steeti

Oyetola, Lasun na Adeleke

Ebe foto si, Twitter/Oyetola/Adeleke/Lasun

Dịka ndị Osun steeti na-azọ ọkwa gọvanọ, lee ndị na-azọ ya bụ ọkwa na pati ha si azọ.

Pịa aka n'aha ha ka ị hụ ihe ị kwesịrị ịma gbasara ha.

Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka Osun

  • Akaọrụ: Gọvanọ, Ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba
  • Afọ: 68
  • Adegboyega Oyetola bụ gọvanọ Osun steeti ugbua.
  • Ọ bụ onye Iragbiji, n'Okpuruọchịchị Boripe.
  • O nwetere asambodo na ngalaba Ịnshọransị nakwa nzere nke masters n'ihe gbasara Azụmahịa, na mahadum University nke Lagos.
  • Tupu ọ bụrụ gọvanọ n'afọ 2018, ọ bụbu onyeisi nlekọta ndị ọrụ ministrị nye Rauf Aregbesola bụ onye ọ nọchiri.
  • Akaọrụ: Ojiegoachụego
  • Afọ: 62
  • N'afọ 2021, o nwetara nzere nke mbụ n'ihe gbasara Iwu na Ikpemkwụmọtọ na mahadum Atlanta Metropolitan State College, dị na mba Amerịka.
  • Ọ zọburu ọkwa sineti na-anọchite Osun Westị n'afọ 2017 na ntuliaka mmegharị e mere, ka nwanne ya nwoke bụ Isiaka Adeleke nwụchara.
  • Ọ zọkwara ọkwa gọvanọ Osun steeti na ntuliaka e mere n'afọ 2018, mana ọ zọtaghị ọkwa ahụ.
  • Ọ bụ onye Ede.
  • Akaọrụ: Onye na-ese ụlọ
  • Afọ: 58
  • A mụrụ ya n'Osogbo n'afọ 1964
  • O nwetere nzere nke mbụ na nke abụọ n'ihe gbasara Ise ụlọ nke Bekee kpọrọ 'Architecture', na mahadum Obafemi Awolowo University (OAU) dị n'Ile-Ife.
  • O mechara nwete nzere nke abụọ (masters degree) n'ihe gbasara Azụmahịa nakwa ọzọ na 'geographical information systems', na mahadum Ilorin nakwa nke Ibadan.
  • Ọ rụburu dịka osote onyeisioche otu pati Social Democratic Party (SDP).
  • Akaọrụ: Ojiegoachụego
  • Afọ: 59
  • A mụrụ ya n'Ile-Ogbo, Osun Steeti.
  • O nwetere nzere nke mbụ ya n'ihe Bekee kpọrọ 'Agricultural Economics', na mahadum Obafemi Awolowo, ma nwete nzere nke abụọ (masters) n'Azụmahịa, na mahadum University of Navarra dị na Barcelona, Spain.
  • Ọ bụ onye ọrụ na Chartered Insurance Institute nke London.
  • Ọ na-arụ dịka onye ndụmọdụ nye ndị Infrastructure Bank Plc nakwa Mutual Benefits Assurance Plc, nakwa ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ.
  • Akaọrụ: Injinia
  • Age: 62
  • Ọ bụ onye Ilobu, n'Okpuruọchịchị Irepodun dị n'Osun Steeti.
  • O nwetere nzere nke mbụ ya na nke abụọ n'ihe Bekee kpọrọ 'Mechanical Engineering', na mahadum Ibadan, nakwa Obafemi Awolowo University.
  • Ọ rụburu dịka ọnụ na-ekwuchitere steeti nke ndị pati Alliance for Democracy (AD) tupu nakwa oge Bisi Akande nọ n'ọchịchị. E mere ya onyeisi otu Osun State Capital Territory Development Authority (OSCTDA), n'afọ 2004.
  • Ọ bụbu onye nnọchiteanya n'Ụlọomeiwu Nta Naịjiria, ebe ọ bụ osote onyeisi ụlọomeiwu ahụ site n'afọ 2015 ruo 2019.