Oyetola, Adeleke, Lasun... Lee ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Osun Steeti

Na Satọdee na-abịanụ, bụ abalị iri na isii nke ọnwa Julaị afọ 2021, ka a ga-eme ntuliaka iji họpụta gọvanọ ga-anọ n'ọchịchị maka afọ anọ na-abịanụ.
Mmadụ iri na ise bụ ndị na-azọ ọkwa a, nke gụnyere Gboyega Oyetola bụ Gọvanọ nọ n'ọchịchị ugbua.
Oyetola na-azọ ọkwa gọvanọ nke ugboro abụọ, mana e nwere ndị isi kara aka so ya azọ ọkwa ahụ.
Pati iri na ise na-azọ ọkwa gọvanọ Osun steeti
Accord - Akinade Akanmu Ogunbiyi
Africa Action Congress - Awojide Peter Segun
Action Democratic Party - Kehinde Munirudeen Olumuyiwa A Atanda
All Progressives Congress - Adegboyega Isiaka Oyetola
Allied Peoples Movement - Awoyemi Oluwatayo Lukuman
All Peoples Party - Adebayo Adeolu Elisha
Boot Party - Adeleke Adesoji Masilo Aderemi Adedapo
Labour Party - Yussuff Sulaimon Lasun
New Nigeria Peoples Party - Rasaq Oyelami Saliu
National Rescue Movement - Abede Adetona Samuel
Peoples Democratic Party - Adeleke Ademola Jackson Nurudeen
Peoples Redemption Party - Ayowole Olubusuyi Adedeji
Social Democratic Party - Omigbodun Oyegoke Akinrinola
Young Peoples Party - Ademola Bayonle Adeseye
Zenith Labour Party - Adesuyi John Olufemi
Ndị a ka mara amara n'ime ha
Adegboyega Oyetola

- Adegboyega Oyetola, dị afọ iri isii na asatọ, nọ na pati APC, ma bụrụkwa onye na-achị Osun Steeti ugbua.
- Ọ bụ onye obodo Iragbiji dị n'okpuru ọchịchị Boripe.
- Oyetola rụburu ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ aka chịburu Osun steeti bụ Rauf Aregbesola
- Nkwa ọ na-ekwe ndị steeti ahụ bụ na ọ ga-arụchapụ ọrụ ọma ọ malitere.
Ademola Adeleke

- Ademola Adeleke na-azọ ọkwa gọvanọ na pati PDP.
- Ọ rụburu ọrụ dịka onye nnọchiteanya Osun-West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa
- O sokwa zọọ ọkwa a na 2018 mana Oyetola meriri ya.
- Ọ bụ onye Ede, ma nwekwaa nzere mmụta na ngalaba ikpe ziri ezi na Mahadum 'Atlanta Metropolitan State College' nke mba Amerịka.
- Ihe o kwuru ọ ga-eme n'ọchịchị bụ ịrụzi okporoụzọ, ụlọọgwụ nakwa iwulite nkọpụta ihe ubi n'Osun steeti.
Yusuf Lasun

- Lasun dị afọ iri isii na abụọ ma bụrụ onye otu 'Labour Party'.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum dị n'Ibadan, nakwa Mahadu Obafemi Awolowo nke Ile Ife.
- Yusuf rụrụ ọrụ dịka osote onyeisi ụlọ omeiwu nta nke Naịjirịa bido na 2015 ruo 2019.
- Nkwa o kwere ma ọ banye n'ọchịchị bụ iwulite ọnọdụ agụmakwụkwọ ma belata ụbịam.
Akin Ogunbiyi

- Ogunbiyi bụ onye o ji ego achụ ego nke dị afọ iri ise na itoolu.
- Ọ bụ onye Ile-Ogbo, ma nọrọkwa na pati Accord.
- Ogunbiyi gụrụ akwụkwọ na Mahadum Obafemi Awolowo nakwa Mahadum Navarra nke mba Barcelona.
- O kwekwara nkwa iwulite nkọpụta ihe oriri nakwa ọnọdụ agụmakwụkwọ n'Osun Steeti.
Omigbodun Akinrinola Oyegoke

- Oyegoke bụ onye pati SDP.
- Ọ dị afọ iri ise na asatọ
- Ọ gụrụ na Mahadum Obafemi Awolowo ebe o nwetara ọzụzụ ise ụlọ (Architecture).
- Ọ rubuola ọrụ dịka onye ndụmọdụ gọvanọ n'okwu gbasara pati na pati ibe ya.
- Nkwa ọ na-ekwe bụ iwulite azụmahịa, ka ndị mmadụ nwee ego ha ji egbo mkpa.









