Osun state election: Soro mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti ebe a

Ọgbọ e derela n'Osun steeti ebe ha ga-achịkọta vootu niile a tụrụ ịmata onye meriri na ya bụ ntuliaka ndị Govano steeti ahụ ha mere taa bụ Satọde.
Ebe a dị na foto a dị n'elu ka ndị ụlọọrụ ga-anọ chịkọta ma kpọpụta mpụtara ya bụ ntuliaka a ga-eji mata ọkaibe na ya bụ ntuliaka ga-ahọpụta onye ga-achị steeti ahụ afọ anọ na-abịanụ.
Onye ọbụla meriri ga-abụ Gọvanọ nke iri steeti ahụ kemgbe e kere ya na 1991.
Ha dị mmadụ iri na ise pụtara ya bụ ihu ọgọ ntụkpọ osisi iche steeti ahụ nke ndị Nigeria Independent National Electoral Commission, INEC, chịkọbara.
Inec sị na ọ bụ onye vootu kacha bụ onye ga-emerị ya bụ agha.
Nke pụtara na onye ahụ ga-emeri ga-enweta ọkara vootu pasentị iri abụọ na ise n'okpuruọchịchị dị iche iche na steeti ahụ.
A na-atụ anya na mpụtara ntuliaka ga-amalite ịbata ebe echi.
Pịa aka na maapụ a ka o gosi gị mpụtara okpuruọchịchi dị iche iche
Lekwa ụfọdụ ndị so azọ ya bụ ọgwa Gọvanọ Osun steeti
Adegboyega Oyetola (APC)
Ademola Nurudeen Adeleke (PDP)
Omigbodun Akinrinola Oyegoke (SDP)
Akin Ogunbiyi (Accord Party)
Yusuf Sulaimon Lasun (Labour Party)











