Osun Decides: Oche gọvanọ Osun akwaala Adeleke kpam kpam

Adegboyega Oyetola nke APC emeriela Ademola Adeleke nke PDP n'ụlọikpe kachasị na ndọrọndọrọ ọkwa gọvanọ Osun steeti.
Na mkpebi nke Ụlọikpe Kachasị nyere ,ha kwusiri ike na ọ bụ Adeboyega Oyetola meriri na ntuliaka ọkwa Osun Steeti.
Mana ọkaikpe abụọ;Jọstịs Kumai Akaah na Paul Galinje n'ime asaa kpebiri ikpe ahụ akwụnyeghị ibe ha.
Jọstịs Akaah boro Inec ebubo ime wuruwuru na ntuliaka mmeju ha mere n'ọsụn.
N'otu aka ahụ, Jọstis Galinje kwuru na ụlọikpe elebanyeghị anya na ọgbaghara so ntuliaka mmeju ahụ.
Okwu a si n'akara Twitter APC pụta ma seta foto ebe Oyetola na-enwe aṅụrị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Cheta na Inec kkpọpụtara Oyetola dịka onye meriri ntụliaka e mere n'afọ 2018 mana Adeleke gbaghara mmeri ya n'ụlọikpe.

Ebe foto si, @OfficialAPCNG/Twitter
Na ntuliaka ahụ BBC nwetara ihe akaebe gosiri ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-anara ego ịtụ vootu.
Ụlọikpe mbụ nyere Adeleke mmeri ahụ mana Oyetola gbaghara mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị, ebe ikpe si gaa ụlọikpe kachasị.
Dịka ọ dị ugbua, ndị mmadụ na-enwe aṅụrị n'obi gọọmentidị n'Oshogbo.































