Na Ekiti Steeti, a kpụgala ndị Fụlanị na-achị ehi abụọ ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba gọọmenti na-ahụ maka nchekwa akpọrọ 'Department of States Service, (DSS)' na-aha bekee kpụpụrụ Namajo Mohammadu, 32, na Abubakar Abase, 18, n' ụlọikpe nta dị na Ado-Ekiti maka igbu mmadụ na iji egbe ga ohi.
Onye nọchitere anya DSS bụ Olaoluwa Olatunbosun kwara ụlọikpe na ndị a eboro ebubo mere nke a ka ọnwa Jenuwari dị iri na asatọ n'Ido-Ekiti.
O kwuru na ndị a ji egbe na ngwa ọgụ ndị ọzọ gburu otu nwaanyị Tiv dị ime, oriakụ Muwaga Felix n' ugbo ya.
Olatunbosun kwukwara na mmadụ abụọ ahụ zukwara ndị obodo ahụ ohi.
Dịka o siri kwuo, mpụ ahụ megidere agba nke 516, 402 and 319 nke iwu megidere mpụ a na-akpọ, 'Criminal Code' na bekee.
Ọ gara n'ihu rịọ ka a tuụnye ha na mkpọrọ ganye na e mecha nchọpụta.
Onweghị onye ọkaiwu nọchitere ndị a eboro ebubo.
Onye ọkaikpe bụ Ropo Adegboye nyere iwu ka a hapụ ha n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS ganye e mecha nchọpụta, ma wugharịa ikpe ahụ mgbe ọnwa Februarị ga-agba iri abụọ na asatọ.









