AY Comedian : Ihe Sowore kwuru maka Nnamdi Kanu, Biafra, Peter Obi

Omoyele Sowore na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Omoyele Sowore/Twitter

Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala n'aha pati AAC bụ Omoleye Sowere akatọọla ọchịchị onyeisiala muhammadu Buahri maka ijichi onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu na-agbanyeghị mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị nyere ka a tọhapụ ya.

Sowore, onye kwuru nke n'abalị Tọzde na mkparịtaụka ya na ọkpachị bụ Ayodeji Richard Makun a ma ama dịka AY nwere kwuru na ị ga n'ihu jichie Kanu bụ mmegbu na mkpagbu.

Mana o kwuru na ya anaghị akwado nkewa Naijiria n'ihi na ya matara na nkewa agaghị egbo mkpa ndị chọrọ nkewa ji achọ ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ya kwenyere na onye ọbụla nwere ikike iti mkpu nnwereonwe dịka o so n' ikike dịịrị onye.

"Achọghị m nkewa Naijiria n’ihi na ụnụ kewapụ, nsogbu ndị a na-esogbu Naijria ga-adịkwa n'ebe ụnụ na-aga( Biafra).Mụ na Nnamdi Kanu akpaala ihe na nkata."

"Ekwenyeghị m na Biafra mana e kwenyere m na onye ọbụla nwere ikike ikwu na ọ chọrọ nnwereonwe, si na Naijiria kewapụ maọbụ na ọ chọghị.”

"Ị gaghị eji mmegbu na mkpagbu jịkọta ndị mmadụ."

"Ị gaghị eji egbe jịkọta ndị mmadụ, ya mere m ji ekwu maka ikpenmkwụmọtọ."

"Ya bụ ihe mere m m ga-eji tinyenwụ onwe n’ọnọdụ ize ndụ n’ihi Nnamdi Kanu."

“Nnamdi Kanu emeriela na ikpe ya rue Ụlọikpe Mkpegharị. "

Cheta

Gọọmentị Naijiria nwụchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya na Julai afọ 2021,kpụlata ya Naijiria bụ ebe a kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Etiti.

Mana n'abalị 3 nke Ọnwa Oktoba afọ 2022, Ụlọikpe Mkpegharị nyere iwu ka a tọhapụ ya ka ọ lawa n'ikpe amaghị ya.

Kama ịtọhapụ ya, Gọọmnetị Etiti site n'ụlọọrụ Ọkaiwu Ukwu Naijiria bụ Abubakar Malami gara Ụlọikpe Kachasị ịgbagha mkpebi nke ỤlọIkpe Mkpegharị nyere ma gaaghachi Ụọikpe Mkpegharị nata ikike ka e jidogodi mkpebi ụlọikpe ahụ nyere ka ọ ghara ịbịa na mmezu ganye na Ụlọikpe Kachasị ebi okwu ga wegara na ya.

Ihe ndị ọzọ o kwuru

Omoyele Sowore

Ebe foto si, Omoyele Sowore/Twitter

Ihe Sowore kwuru maka Peter Obi

N'okwu ihe mere na ọ naghị akwado onye na-efe ọkọlọtọ 'Labour Party bụ Peter Obi, na agbanyeghị na ọchịchọ obi ya bụ ọchịchọ obi ndị ntorobia, Sowore kwuru na nkwenye ya na nke obi abụghị otu.

Ọ sịrị, "Anyị kwuwe maka nkwenye, mu na ya abụghị otu. Peter Obi bụ onye PDP.

"Mụ na onye ọbụla Obasanjo nyerela nkwado, onye Babangida nyere nkwado abụghị otu. Onye ndị nịle mebiri Naijiria nyere nkwado. Ya mere na ịhụbeghị ebe m weliri aka ya."

" Ọ bụrụ na ha nyere ya nkwado, ọ pụtara na ha ga-eso ekwu ihe ọ ga na-eme n’ọchịchị ya nke ga-ebutere Naijiria nnukwu nsogbu."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ahụike

N'okwu ahụike, Sowore kwere nkwa na ọ ga-etinye ego na'Ikwalite teknụzụ ahụike, ọzụzụ ndị ọrụ aike ma sịkwa "Ọ bụrụ na m buru onyeisial, ọrịa ọbụla tụrụ m akwọlighị na Naijiria, ọ ka mma na ọrịa ahụ gburu m.”

"Ọ bụ n’ihi na ndị ndu anyị anaghị aga ụlọọgwụ ebe, mere na ha rụ®ụ ụlọọgwụ enweghị ihe ha na-agwọ."

Ndị nwere nkwarụ

N'ajụjụ banyere iwu maka ndị nwere nkwarụ nke Buhari binyere aka ka ọ bụrụ iwu, Sowore kwuru sị, "Iwu ọbụla Buhari tinyere aka, agaghị m emejupụta ya n'ihi na Buhari abụghị ezigbo mmadụ."

"Ihe m ga-eme bụ ihu na e nwere iwu na a ga na-akwụ ndị pụrụ iche, obere ego ego, nwee ụlọọrụ ebe a ga na-enye ha ọrụ, nwee usoro 'insurance ahụike pụrụ iche maka ha, ohere ahụike n'efu."

Ay na Omoyele Sowore

Ebe foto si, AY/Twitter

Nkọwa foto, Ay kpọrọ ndị na-adọ ọkwa Onyeisiala na 2023 gunyere Omoyele Sowore ka ha bịa zaa ụmụ Naijiria ajụjụ ọnụ.

Cheta na izụụka ole na ole gara aka, Ọkpachi AY kpọrọ ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala Naijiria na ntuliaka 2023 ka ha bịa n'akara ya na soshal midia ka ha na ụmụ Naijiria kpaa maka ebumnobi ha nwere nyere ha ma ha banye ọchịchị.

Ka ọ dị ugbua, naanị Peter Obi nke Labour Party na Omoyele Sowore nke AAC zarala oku ahụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Ihe Peter Obi kwuru ka ọ gara n' AY show

Peter Obi na AY

Ebe foto si, AY/Twitter

Onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha Labour party arịọla ụmụ Naijria ka ha jide ya n'ụdọ ma ya banye, iji hụ na ya rụrụ ọrụ ya kwere na nkwa n'oge achụmtavootu ya.

Obi kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ọkaọchị a ma ama bụ Ayodeji Richard Makun a ma dịka AY nwere ụbọchị Tọzde.

"Agalanụ zuo ike ma e mechaa ntuliaka m merịe."

Mgbe ahụ bụ mgbe ụnụ kwesịri ị na-ekwu okwu ma ọbụrụ na m emeghị ihe ndị kwuru na m ga-eme."

"Ọ bụ etu a ka ụnụ ga-esi jide anyị n'ụdọ."