Agha Biafra ebiela kamgbe afọ 52 gara aga, otu ahụ ka ọ ga-adị - Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter
Dịka nrụrịtaụka n'etiti ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 ka na-aga n'ihu, Peter Obi nke 'Labour Party' ekwuola na ya anaghị azọ ọchịchị iji weta nnwereonwe Biafra na mmezu.
Obi kwuru nke a na mkparịtaụka o nwere n'ụlọọrụ mgbasaozi 'Human Rights Radio' nke dị n'Abuja, n'ihe omume ha a kpọrọ 'Brekete Family'.
Ndị mmadụ na-ekwu na ọtụtụ ndị ntorobịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ebe Peter Obi si pụta, na-alụ ọgụ isi na Naịjirịa pụọ ma bụrụ mba nọọrọ onwe ha a na-akpọ Biafra, ma na-ajụ ihe Obi ga-eme iji weta nke a n'isi njedebe.
N'ọsịsa ya, Peter Obi kwuru na "agha Biafra bịara n'isi njedebe n'afọ 52 gara aga, otu ahụ ka ọ ga-adị. Abụ m onye Naịjirịa. Ana m azọ ọkwa onyeisiala dịka onye Naịjirịa."
Obi kwuru na ọ bụrụ na ya merie ọkwa onyeisiala, ọ ga-agba mbọ ịhụ na ya na ndị niile na-alụ ọgụ nnwereonwe nwere mkparịtaụka iji mee ka udo dịkwa.
Aga m atọhapụ onye ọbụla nọ na mkpọrọ n'ihi ịzọ nnwereonwe - Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter
Nke a yitere ihe Peter Obi kwukwara n'ọgbakọ 'Town Hall' nke ụlọntaakụkọ Channels TV haziri n'abalị ụbọchị ụka, Disemba 8, maka ya na osote ya bụ Yusuf Datti Baba-Ahmed.
O kwuru na ihe mbụ ya ga-eme bụ ịnọdụ ala ka ya na ndị niile na-azọ nnwereonwe kparịta ụka, tinyere ndị n'ime ha nọ na mkpọrọ ugbua.
Cheta na gọọmentị Naịjirịa tinyere Mazi Nnamdi Kanu, bụ onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' na mkpọrọ, n'ihi ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu.
"Ha niile, na-enweghị onye agụpụrụ, mụ na ha ga-anọdụ ala kpaa nkata. Anyị nọ n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Usoro ọchịchị bụ site na mkparịtaụka nakwa nkwekọrịta," Obi kwuru.
"Otu nke ọbụla chọrọ ka ha na gọọmentị nwee mkparịtaụka, mụ na ha ga-anọdụ ala kpaa."
Usoro aka nwayọọ na aka ike

Ebe foto si, Obidatticampaign.com
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Obi kwuru na usoro ya ga-eso bụ nke bekee na-akpọ 'carrot and stick approach'.
Nke a pụtara ibu ụzọ nye ndị a na-azọ nnwereonwe ohere iji nwee mkparịtaụka ma chọọ udo, tupu e jirizie aka ike soro ndị jụrụ ụzọ udo.
"Ọ dị mkpa ileba anya n'ihe ndị kpatara ịlụ ọgụ nnwereonwe dịka ọ dị ugbua," Peter Obi kwuru. "Ọ bụ ihe gbasara enweghị ikpe nkwụmọtọ, emeghị onye ka e mere ibe ya, enweghị ọrụ, ụbịam, na ihe ndị ọzọ.
"Ọ bụrụ na i bido ileba ihe ndị a anya, ma kpọkwaa ndị a na-alụ ogu oku mkparịtaụka, ị ga-ahụ na ha ga-ekwe zaa gị oku.
"Onweghị onye ọbụla na-alụ ọgụ, n'ụwa niile, ga-ahụ na ihe adịwala mma ma na-aga etu o kwesịrị, ma gaa n'ihu ka na-alụ ọgụ."
O kwuru na ọbụladi n'ime otu ezinụlọ, a na-enwe ndọrọndọrọ maka otu ihe maọbụ nke ọzọ, mana nne na nna na ụmụ ha na-anọdụ ala kpaa ya akpaa, nwee nkwekọrịta iji mee ka udo chịa.
"Mana ọ bụrụ na anyị gaa n'ihu na-enweghị ikpe nkwụmọtọ, na-emeghị onye etu e si mee ibe ya, enweghị ọrụ, ọnọdụ ụbịam, na ndị ntorobịa amaghị ebe nri ha ga-esi apụta, anyị ga na-enwe nsogbu oge niile."
Ma ndị nọ na mkpọrọ, m ga-akpọpụta ha - Obi

Ebe foto si, Government
Peter Obi gara n'ihu kwuo na ya ga-akpọpụta ọbụladị onye gọọmentị tụrụla mkpọrọ n'ihi ịlụ ọgụ maka nnwereonwe, ka ya na onye ahụ nwee mkparịtaụka ka udo wee chịa.
"Anyị ga-ebu ụzọ sochaa ụzọ mkparịtaụka niile tupu agbasozie usoro aka ike."
Mgbe otu onye jụrụ Peter Obi ma nke a agụnyere ndị Boko Haram na-enye nsogbu na mpaghara Ugwu na ndị otu 'Indigenous People of Biafra' na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, o kwuru sị: "Mụ na ha niile ga-enwecha mkparịtaụka, na-agbanyeghị ụdị egbe ọbụla ha bu."
"Ọ bụrụ na a ma ndị ha bụ, ọ bụrụ na anyị nwere ike ịkọta onye ha bụ, mụ na ha ga-anọdụ ala kpaa nkata."
Obi gara n'ihu kọwaa na iji wulite ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa, na ọchịchị ya ga-eme ka ndị ọrụ nchekwa niile na Naịjirịa na-arụkọ ọrụ ọnụ, nwee usoro ọrụ doro anya, ma nwekwaa usoro doro anya iji nye onye mehiere ntaramahụhụ.










