Ihe ndị nkwado Tinubu gwara Obasanjo dịka ọ sị na ọ ga-akwado Peter Obi

Bola Tinubu na Olusegun Obasanjo

Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress azaala aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo bụ onye kwuru na ya ga-akwado Peter Obi nke Labour Party maka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023.

Bayo Onanuga, bụ onyeisi ngalaba mgbasaozi nke otu achụmnta vootu Bola Tinubu kwuru na nkwado Obasanjo nyere Peter Obi dịka mmiri a na-agba n'azụ ọbọgwụ, maka na ọ gaghị achịta aja.

"Pati anyị na onye na-azọrọ anyị ọkwa Onyeisiala bụ Bola Ahmed Tinubu agaghị atụ uche ọbụla n'ihi ihe a Obasanjo mere, Obasanjo bụ onye a ma ama na-agba ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ ọganihu mgba oge niile, dịka o mere ya MKO Abiola na 1993," Onanuga kwuru n'akwụkwọ ozi o zipụrụ.

"Nkwado Obasanjo nyere Peter Obi enweghị isi n'ihi na Obasanjo enweghị ezigbo aha na ndọrọndọrọ ọchịchị n'ebe niile na Naịjirịa, nkwado ya agahị eme ka mmadụ merie ọkwa ọbụla, ọbụladị ọkwa 'Councillor'.

"Ma na steeti ya bụ Ogun, onweghị onye nwereike ịtụkwasị obi na nkwado Obasanjo iji merie ọkwa Gọvanọ maọbụ 'councillor.

"Anyị na-emere Peter Obi ebere n'ihi na anyị ma nke ọma na Obasanjo agaghị emerinwu ọgbọ vootu (polling unit) ya maọbụ okirikiri ya n'Abeokuta n'aha Peter Obi na ntuliaka onyeisiala na-abịa n'ụbọchị 25 nke Febrụwarị 2023."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Onye ọzọkwa bụ ọnụ na-ekwuru Tinubu, bụ Festus Keyamo, depụtara na Twitter na nkwado Obasanjo nyere Peter Obi agaghị emetụta Tinubu n'ụzọ ọbụla.

Keyamo kwuru na Obasanjo kwadoro Atiku na 2019 mana Atiku dara, ugbua o burukwala nkwado ahụ nyere Atiku ọdịda ga bunye Peter Obi.

Bashir Ahmad bụ onye enyemaka mgbasaozi nke onyeisiala Muhammadu Buhari, dekwara na Twitter na obi anaghị amapụ APC maka na PDP enwetaghị mmeri ọbụladị n'ọgbọ vootu Obasanjo na 2019 n'agbanyeghị nkwado Obasanjo nyere Atiku.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Ọkpụrụkpụ ihe Obasanjo sị mere o ji akwado Peter Obi ịbụ Onyeisiala Naịjirịa

Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa Obasanjo na Peter Obi na-azọ ọkwa ahụ ugbua

Ebe foto si, Peter Obi

Olusegun Obasanjo bụbu Onyeisiala Naịjirịa edonyerela Peter Obi ji aha Labour Pati azọ ọkwa onyeisiala ukwu maka ịbụ Onyeisiala Naịjirịa.

Obasanjo mere nke a site n’akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwari, 2023 bụ ọ kpọrọ “arịrịọ m na-arịọ ụmụ Naịjirịa ọkachasị ndị ntoroọbịa”.

N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ rụtụrụ aka n’ihe ndị mere o jiri kpebie na ọ bụ Obi ka ọ na-akwado dịka ntuliaka na-abịa n’ọnwa Febụwarị afọ 2023.

Peter Obi na Obasanjo

Ebe foto si, Peter Obi

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Ihe ndị a gụnyere;

  • Obasanjo kwuru na ya na ndị niile a na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ugbua enweela nzuko n’otu n’otu na ọ nụkwala ihe niile ha kwuru mere ha ji azọ ọkwa a, kama na o wutere ya na ọtụtụ n’ime amaghị na ọnọdụ Naịjirịa nọ ugbua dị njọ karịa ka ọ dị mgbe ọ banyere n’ọchịchị n’afọ 1999.
  • O kwuru na e nwere ihe anọ ndị Naịjirịa kwesịrị ịchọ n’ime onye ọbụla kwuru na ọ ga-achị ha. Ihe ndị a bụ i. Ihe ngosi ọrụ onye ahụ rụrụla ii. Ahụmihe (vision) bụ ndị ezi ya iii. Ezigbo nwoke nwere agwa dị mma ma na-atụ egwu Chineke iv. Onye ahụike ya zuruoke mana ụbụrụ nakwa ihe niile.
  • Obasanjo sị na o nweghi otu n’ime ndị na-azọ ọkwa onyeisiala a dị nsọ mana ịtụlee agwa ha, ọrụ ha rụrụ, amamihe ha nwere na ọ bụ Peter Obi kachasị gbapụta ihe n’ime ha niile.
  • O kwuru na ihe ọzọ dị mkpa banyere Peter Obi bụ na ọ dị ka ndụ (needle) e tinyere eriri site na mpaghara ugwu na ndịda, na o nwereike ọ gaghị akpafu. Nke bụ na o nwere ndị ga-enye ya ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa.
Akwụkwọ Obasanjo dere maka ịkwado Peter Obi

Ebe foto si, Olusegun Obasanjo

Ihe ndị merela tupu Obasanjo enwee mkpebi a

Tupu Obasanjo ebipụtala ozi a bụ nke ọ dọnyere Peter Obi ukwu n'ọkwa Onyeisiala Naịjirịa, ya na ụfọdụ ndị gbapụtara ihe na-azọ ọkwa ezutela n'oge dị iche iche.

N'ọnwa Ọgọọstụ nakwa Sepụtemba afọ 2022, Peter zutere Olusegun Obasanjo na mba UK nakwa na Naịjirịa, bụ ebe ọ nọ gwa Obasanjo mmasị ya n'ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

N'otu n'ime nzuko ndị ahụ, Obasanjo kwuru na ọ bụ eziokwu na Obi adịghị nsọ kama na o nwere ezigbo ugwu ma a bịa n'ime ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa.

N'otu aka ahụ n'ọnwa Ọgọọstụ, Bola Tinubu ji aha APC azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa kpọtụụrụ Obasanjo n'ụlọ ya dị n'Abeokuta, Ogun Steetị maka mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala.

Cheta n'afọ 2015 Obasanjo kwadoro Onyeisiala Muhammadu Buhari mgbe ọ na-azọ ọkwa ahụ bụ nke o mechara merie Onyeisiala Goodluck Jonathan na-achị mgbe n'oge ahụ.