Arthur Eze: Lee ihe ọhụrụ o kwuru gbasara Peter Obi na-azọ ọkwa onyeisiala

Arthur Eze na Peter Obi

Ebe foto si, Chief Ikukuoma/Twitter

Ide ego a ma ama na Naịjirịa bụ Artur Eze, ekwuola na ya anaghị akwado ọkwa Onyeisiala Naịjirịa nke Peter Obi, bụ aka chịburu Anambra Steeti, na-azọ n'otu 'Labour Party'.

Arthur Eze kwuru na ya dọrọ Peter Obi aka na ntị ka o wepu onwe ya n'ịzọ ọkwa ahụ ma chere oge ọzọ.

O kwuru nke a n'emume Ọfala nwanne ya nwoke bụ Robert Eze, bụ onye na-achị obodo Ukpo dị n'okpuruọchịchị Dunukofia, n'Anambra Steeti, n'ụbọchị 26 nke Disemba 2022.

Arthur kwuru sị: "Oge ọ gwara m maka ebunuche ya (bụ ịzọ ọkwa Onyeisiala), ajụrụ m ya steeti ole o che na o nwereike inweta mmeri na ha na mpaghara Ugwu nakwa mpaghara Ndịda. Azịza o nyere ejughị m afọ"

"Ya mere m ji gwa ya na ọ gaghị emeri, na ya emefula ego ya na ndọrọndọrọ a."

Ọ gara n'ihu kwuo na "anyị nwere onye anyị na-akwado ugbua, onye ahụ chịchaa, ọ ga-ahafe ọchịchị n'aka Soludo."

Chukwuma Soludo bụ Gọvanọ Anambra Steeti ugbua, onye kwukwara n'oge gara aga na ya anaghị akwado Peter Obi maka ọkwa onyeisiala ọ na-azọ.

Ndị Igbo a ma ama na-anaghị akwado Peter Obi

Enwekwaala ụfọdụ ndị welitere isi n'ala Igbo bụ ndị kwurula na ha agaghị akwado Peter Obi n'ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ọ na-azọ. Ha gụnyere:

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Chukwuma Soludo: N'ọnwa Nọvemba afọ a, Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo dere akwụkwọ ozi ebe ọ nọrọ kwuo hoohaa na ya anaghị akwado Peter Obi.

"Peter Obi n'onwe ya ma na ọ gaghị emeri (ntuliaka a). Ọ ma nkata ọ na-akpa, anyị onwe anyị makwa, ya onwe ya makwa na anyị onwe anyị ma," Soludo dere.

Dave Umahi: Gọvanọ David Umahi, n'ọnwa Septemba afọ a, kwuru na dịka onye nọ na pati 'All Progressives Congress' (APC), ọ ga-akwado onye pati ya bụ Bola Tinubu.

"Dịka onye zuru oke na pati, ana m ekpe ekpere ka pati m merie. Mana ọ bụrụ nc Chukwu sị mba, onye ọzọ m ga-achọ ka o merie bụ Peter Obi, maka na ọ gaghị adị mma ka ọchịchị laghachikwa mpaghara ugwu ebe ọ bụ na onye si mpaghara ahụ achịala afọ asatọ," Umahi kwuru.

Ejike Mbaka: Ụkọchukwu a ma ama bụ Ejike Mbaka kwuru na ya agaghị akwado Peter Obi maka na ọ bụ onye na-enweghị mmụọ inye mmadụ ihe.

"Onye anaghị eri ego ya eri ka ụnụ na-achọ ịkwado? Ụnụ ọ chọrọ ka agụụ gụgbuo ndị mmadụ?" Mbaka kwuru n'ọnwa Jun 2022.

"Ọ bụrụ na ndị Igbo na-achọ onye ga-anọchite anya ha na Naịjirịa, ọ bụghị ụdịrị mmadụ Peter Obi."

Onye bụ Arthur Eze

Arthur Eze

Ebe foto si, Atlas Oronto

Nkọwa foto, Arthur Eze
  • Ọ bụ onye obodo Ukpo nke dị n'okpuru ọchịchị Dunukofia n'Anambra Steeti
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Nọvemba 1948
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Steeti California nke mba Amerịka, ebe o nwetara ọzụzụ na ngalaba 'engineering'
  • Ọ bụ onye ojiegoachụego a ma ama
  • Ụlọọrụ ya gụnyere ụlọọrụ mmanụ agbịdị nke nwere ngalaba na mba Afrịka dị icheiche
  • Ọ bụkwa onye nkwado ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche n'agbanyeghị pati ha nọ na ya
  • O nweburu ụlọọrụ ụgbọelu a kpọrọ Triax 'airlines' mana ụlọọrụ ahụ kwụsịrị ọrụ n'afọ 2000